ghá
gha
Word | gha |
Definitions | Active verb 策 1.spread(broadcast); scatter; all over(around) |
Related Terms | |
Word Stems | No word stems |
Examples
Nna m na-eje ịgha nsị ewu n'ubi ya.
Nna m na-eje ịgha nsị ewu n'ubi ya.
My father is going to spread goat feces on his farm .
Ịghasa isi adịghị mma.
Ịghasa isi adịghị mma.
Scattering the hair is not proper.
Ha ghasara ya.
Ha ghasara ya.
They scattered it.
Ghaa mkpụrụ ahụ n'ubi gị
Ghaa mkpụrụ ahụ n'ubi gị
Cast that seed in your farm.
Onyema ghasara ya ebe niile.
Onyema ghasara ya ebe niile.
Onyema scattered it everywhere.
bǫ
bọ̀
Word | bọ̀ |
Definitions | Active verb 辞 1.spread to reveal inside 2.cut or tear open a body(animal or human) 3.dawn (of day) |
Related Terms | |
Word Stems | No word stems |
Examples
Ị chọrọ ịbọ ewu ahụ?
Ị chọrọ ịbọ ewu ahụ?
Do you want to cut open the goat?
Chi abọọla.
Chi abọọla.
It's daybreak
Bọọ anya gị ka m hụ ihe dị ya n'ime.
Bọọ anya gị ka m hụ ihe dị ya n'ime.
Spread your eyes open let me see what it inside it.
A bọrọ ya afọ ụnyaahụ.
A bọrọ ya afọ ụnyaahụ.
He had an abdominal surgery yesterday.
nyà
nyà
Word | nyà |
Definitions | Active verb 遇 1.drive; ride 2.bend(especially something that can easily return to normal position); steer; tilt; sway; carry a bag by hanging it on the shoulder |
Related Terms | |
Word Stems | No word stems |
Examples
Ọ na-aga ije, ọ na-anyagharị ụbụ ya.
Ọ na-aga ije, ọ na-anyagharị ụbụ ya.
When he walks, he tilts his shoulder side to side.
Mpụ abụghị ihe mba ọbụla na-eji anya isi.
Mpụ abụghị ihe mba ọbụla na-eji anya isi.
Fraud is not what any nation prides in.
Ada na-anya nnukwu akpa.
Ada na-anya nnukwu akpa.
Ada carries a big bag.
Gwa m onye ga-anya ụgbọala a.
Gwa m onye ga-anya ụgbọala a.
Tell me who will drive this car.
Ịnya nnukwu akpa na-ara m ahụ.
Ịnya nnukwu akpa na-ara m ahụ.
To carry a big bag is difficult for me.
Nyaa ihe kwesịrị gị dịka akaochie.
Nyaa ihe kwesịrị gị dịka akaochie.
Drive what seems best as a veteran.
Were ihe a nyagharịa igwe a.
Were ihe a nyagharịa igwe a.
Use this to bend the iron.
Ọ nyara yok m, m ga-anyarakwa nke ya.
Ọ nyara yok m, m ga-anyarakwa nke ya.
If he carries my yoke, I will carry his yoke too.
Anaghị m anya ụgbọ mmiri.
Anaghị m anya ụgbọ mmiri.
I don't ride boats.
Ọ bụ ọ nya akpa eli ozu.
Ọ bụ ọ nya akpa eli ozu.
He is a dubious person.
Ama m anya moto.
Ama m anya moto.
I know how to drive a car.
Nyara moto ahụ pụọ ebe a!
Nyara moto ahụ pụọ ebe a!
Drive that car out of this place!
nyá
nya
Word | nya |
Definitions | Active verb 威 1.stick; glue |
Related Terms | |
Word Stems | No word stems |
Examples
A ga-anya akwụkwọ a n'ahụ aja.
A ga-anya akwụkwọ a n'ahụ aja.
This paper will be glued to the wall.
Ha na-anya akwụkwọ mgbasa ozi n'ahụ aja.
Ha na-anya akwụkwọ mgbasa ozi n'ahụ aja.
They are gluing posters on the wall.
A ga-anya ya eso.
A ga-anya ya eso.
It will be glued.
Nyaa akwụkwọ ahụ n'ebe a.
Nyaa akwụkwọ ahụ n'ebe a.
Glue that book here.
Ọ na-anyado anyado.
Ọ na-anyado anyado.
It sticks.
Nyaa ya nke ọma.
Nyaa ya nke ọma.
Glue it properly.
Ọ na-anya ihe ọbụla masịrị ya n'oche a.
Ọ na-anya ihe ọbụla masịrị ya n'oche a.
He glues whatever he likes on this chair.
Ọ nyadoro ya ozugbo
Ọ nyadoro ya ozugbo
She glued it immediately.
yà
yà
Word | yà |
Definitions | Active verb 㯦 1.tear carelessly or scratch, especially soft materials; tear carelessly using the fingers |
Related Term | |
Word Stem | No word stems |
Examples
Ọ yara ya mbọ amaghị ụma.
Ọ yara ya mbọ amaghị ụma.
She scratched him unknowingly.
yá
ya
Word | ya |
Definitions | Pronoun 案 1.(3rd person singular object/possessive pronouns) he; him; his; she; her; it; its 2.3rd person command permissive subject pronoun. |
Related Terms | |
Word Stems | No word stems |
Examples
Ha hụrụ ya.
Ha hụrụ ya.
They saw him.
Ya bịa ebe a.
Ya bịa ebe a.
Let him come here.
Edeere m ya akwụkwọ.
Edeere m ya akwụkwọ.
I wrote to him.
Akpa ya tọgbọrọ nkịtị fee mfe.
Akpa ya tọgbọrọ nkịtị fee mfe.
Her bag is empty and light.
Gwa ya na ọ ga-abịanwu ugbua.
Gwa ya na ọ ga-abịanwu ugbua.
Tell her she can come now.
rįà
rị̀à
Word | rị̀à |
Definitions | Active verb 1.suffer from an illness; be ill with an illness |
Related Term | |
Word Stem | No word stems |
Examples
Ọ rịara ịba n'ọnwa gara aga.
Ọ rịara ịba n'ọnwa gara aga.
She suffered from malaria last month.
Ọ na-arịa akpata.
Ọ na-arịa akpata.
She is suffering from measles.
áhų
ahụ̀
Word | ahụ̀ |
Definitions | Demonstrative 吟 1.that 2.a grammatical item used to indicate that the entity described is known to the discussants |
Related Term | |
Word Stem | No word stems |
Examples
Onye ahụ na-aga bụ nwunye Maazị Nnadị.
Onye ahụ na-aga bụ nwunye Maazị Nnadị.
That person walking is Mr Nnadi's wife.
Nwoke ahụ bụ enyi m.
Nwoke ahụ bụ enyi m.
That man is my friend.
Ahụrụ m nwoke ahụ.
Ahụrụ m nwoke ahụ.
I saw that man.
Ala ahụ abụghị nke m.
Ala ahụ abụghị nke m.
That land is not mine.
Ọ bụ ya ka m nyere ọrụ ahụ m gwara gị maka ya.
Ọ bụ ya ka m nyere ọrụ ahụ m gwara gị maka ya.
He is the one I gave the job I told you about.
'Ahụ' bụ nrụaka.
'Ahụ' bụ nrụaka.
̀̀'Ahù' is a demonstrative.
Ọ bụghị oge ahụ.
Ọ bụghị oge ahụ.
It is not that time.
Ego ahụ.
Ego ahụ.
That money.
Ahụ̀ na àhụ nwere otu nsupe n'Igbo.
Ahụ̀ na àhụ nwere otu nsupe n'Igbo.
That and body have the same spelling in Igbo.
Ahụ dị mfe ịkpọpụta.
Ahụ dị mfe ịkpọpụta.
Ahụ is easy to pronounce.
nà
nà
Word | nà |
Definitions | Conjunction 畝 1.and (when making a list of words); that (when following sentence has a clear sense on it's own) |
Related Terms | No related terms |
Word Stems | No word stems |
Examples
O ji nke m na nke ya
O ji nke m na nke ya
He is with his own and mine.
Ada na Obi gbara ọsọ.
Ada na Obi gbara ọsọ.
Ada and Obi ran.
Chukwuebuka kwuru na unu ga-abịa taa.
Chukwuebuka kwuru na unu ga-abịa taa.
Chukwuebuka said that you will come today.
Yiri uwe na akpụkpụkwụ.
Yiri uwe na akpụkpụkwụ.
Wear clothes and shoes
ñų
ṅụ̀
Word | ṅụ̀ |
Definitions | Active verb 1.to rejoice 2.to show warmth or embrace warmly 3.to thank someone |
Related Term | |
Word Stem | No word stems |
Examples
Ọ ṅụrụ ọṅụ na ha emerielạ
Ọ ṅụrụ ọṅụ na ha emerielạ
He rejoiced that they have won.
Ọ na-aṅụ nne ya mgbe ihe ahụ mere.
Ọ na-aṅụ nne ya mgbe ihe ahụ mere.
She was giving her mum a warm embrace when the incident happened.
Achọrọ m ịṅụ ọṅụ.
Achọrọ m ịṅụ ọṅụ.
I want to rejoice.