Nkọwa okwu logo
Beta

wú

wu

Wordwu
Definitions

Active verb

1.build; construct or erect, especially a building

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

Anyị ga-ewu ụlaahịa ebe a.

Anyị ga-ewu ụlaahịa ebe a.

We will build a store here.

Wuo ụlọ ọzọ n'azụ nke a.

Wuo ụlọ ọzọ n'azụ nke a.

Build another house behind this one.

Gọọmentị na-ewu ụlọ maka ndị ogbenye.

Gọọmentị na-ewu ụlọ maka ndị ogbenye.

Government is building a house for the poor.

Ha achọghị iwu ya ka o buo oke ibu.

Ha achọghị iwu ya ka o buo oke ibu.

They don't want to construct it to be too big.

Nkume ndị na-ewu ụlọ jụrụ...

Nkume ndị na-ewu ụlọ jụrụ...

The stone which those who build a house rejected...

Kedụ ụlọọrụ wuru akwammiri ahụ?

Kedụ ụlọọrụ wuru akwammiri ahụ?

Which company constructed that bridge?

wù

Wordwù
Definitions

Active verb

w照

1.be popular

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

Ụdị ejiji a wuru na 1994.

Ụdị ejiji a wuru na 1994.

This type of fashion was popular in 1994.

Ụdịrị akwa ahụ ọ zụrụ wuru n'afọ iri gara aga.

Ụdịrị akwa ahụ ọ zụrụ wuru n'afọ iri gara aga.

That type of dress she bought was popular ten years ago.

wụ

Wordwụ
Definitions

Active verb

1.pour

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

Onye wụrụ mmiri n'akwa m?

Onye wụrụ mmiri n'akwa m?

Who poured water on my cloth?

sọ

Wordsọ
Definitions

Active verb

1.flow (liquid or gas)

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

Mmiri si ebe ahụ na-asọ.

Mmiri si ebe ahụ na-asọ.

Water is flowing from there.

Ọ na-asọ asọ.

Ọ na-asọ asọ.

It is flowing.

Ọ na-asọkarị n'ụtụtụ.

Ọ na-asọkarị n'ụtụtụ.

It flows more in the morning.

Ọ dịka ọ ga-asọ ọzọ.

Ọ dịka ọ ga-asọ ọzọ.

It is like it will flow again.

Ọsụsọ na-asọ ya ka mmiri n'ahụ.

Ọsụsọ na-asọ ya ka mmiri n'ahụ.

Sweat is flowing like river on his body.

Ọ sọrọ rute ebe a.

Ọ sọrọ rute ebe a.

It flowed and reached here.

rụ

Wordrụ
Definitions

Active verb

1.build; make a structure;

2.work; engage in physical or mental activity with the intention of getting a result;

3.solve; work a problem to get an answer, especially calculation

4.cause a problem/commit a crime

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

A na-arụ akwammiri ọzọ na Mmiri Naịja.

A na-arụ akwammiri ọzọ na Mmiri Naịja.

Another bridge is being built on River Niger.

A ga-arụ ya echi.

A ga-arụ ya echi.

It will be worked tomorrow.

Rụọ ya gwa m azịza ya.

Rụọ ya gwa m azịza ya.

Solve it and tell me the answer.

Gịnị ka unu chọro ịrụ ebe a?

Gịnị ka unu chọro ịrụ ebe a?

What do you want to build here?

Onye rụrụ ala a?

Onye rụrụ ala a?

Who caused this mischief/Who committed this sacrilege.

Achọrọ m ịrụ ugbeelu.

Achọrọ m ịrụ ugbeelu.

I want to build an aeroplane.

Chika rụrụ sọm ahụ.

Chika rụrụ sọm ahụ.

Chika solved the mathematics.

Ọ na-arụ ọrụ na Mọnde ọbụla.

Ọ na-arụ ọrụ na Mọnde ọbụla.

She works every Monday.

bụ

Wordbụ
Definitions

Passive verb

1.be (who, what, whose something or someone is); is; am; are

Related Term
Word Stem

No word stems

Examples

Ada bụ nwaanyị.

Ada bụ nwaanyị.

Ada is a girl.

Ọ bụ onyenkuzi asụsụ Igbo.

Ọ bụ onyenkuzi asụsụ Igbo.

She is an Igbo language teacher.

Ọ chọrọ ịbụ onye uweojii.

Ọ chọrọ ịbụ onye uweojii.

He wants to be a policeman.

Nne m bụ onyenkụzi.

Nne m bụ onyenkụzi.

My mother is a teacher.

Kedụ ihe bụ isiokwu gị?

Kedụ ihe bụ isiokwu gị?

What is your topic?

Ọ ga-abụ ya ka ha na-agwa okwu.

Ọ ga-abụ ya ka ha na-agwa okwu.

She might be the one they are talking to.

Ọ bụ nwanne m nwaanyị.

Ọ bụ nwanne m nwaanyị.

She is my sister.

ghǫ

ghọ̀

Wordghọ̀
Definitions

Active verb

1.change into; develop into; become; transform into

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

Ọbụbụ na-aghọ erembụba.

Ọbụbụ na-aghọ erembụba.

Caterpillar transforms into a butterfly.

Nwata ahụ na-achọ ịghọ onye ohi.

Nwata ahụ na-achọ ịghọ onye ohi.

That child wants to become a thief

I nọgide ebe ị ghọọ onye asị

I nọgide ebe ị ghọọ onye asị

If you continue staying here you become a liar.

Akamụ ahụ ga-aghọ mmiri obere oge.

Akamụ ahụ ga-aghọ mmiri obere oge.

The pap will soon turn to water

-há

-ha

Word-ha
Definitions

Extensional suffix

1.almost; about to

Related Term
Word Stem

No word stems

Examples

Oge naha eru mgbe anyị ji aga ịkpa isi anyị.

Oge naha eru mgbe anyị ji aga ịkpa isi anyị.

It's almost time for us to go to weave our hair.

Ụnụ naha eri?

Ụnụ naha eri?

Are you people almost eating?

Emeka naha abịa.

Emeka naha abịa.

Emeka is about to come.

bụ

Wordbụ
Definitions

Passive verb

1.be (is, am, are); who or what someone is; what something is; whose someone or something is

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

A sịrị Ucheọma bụrụ onye ndu anyị.

A sịrị Ucheọma bụrụ onye ndu anyị.

Ucheọma was told to be our leader.

Ọ na-abụ onye mbụ oge ọbụla.

Ọ na-abụ onye mbụ oge ọbụla.

He is first all the time.

Ọ chọrọ ịbụ onyenkuzi.

Ọ chọrọ ịbụ onyenkuzi.

He wants to be a teacher.

Amaka bụ nwanne m.

Amaka bụ nwanne m.

Amaka is my sibling.

gị

Wordgị
Definitions

Pronoun

1.you; second person singular object pronoun

Variationsi, ị
Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

Ọ bụ nke gị na ya.

Ọ bụ nke gị na ya.

It is for you and him.

A gwara gị jee ahịa.

A gwara gị jee ahịa.

You were told to go to the market.

Gị na Uche mere ọfụma.

Gị na Uche mere ọfụma.

You and Uche did well.

Ọ bụghị gị ka m na-agwa.

Ọ bụghị gị ka m na-agwa.

It is not you that I am talking to.

Nke a bụ nke gị.

Nke a bụ nke gị.

This one is your own.

Enyere m gị ego ahụ ụnyaahụ.

Enyere m gị ego ahụ ụnyaahụ.

I gave the money yesterday.

Mụ na gị, onye bu ụzọ bịa?

Mụ na gị, onye bu ụzọ bịa?

You and I, who came first?

Gị na ya soro bịa.

Gị na ya soro bịa.

Come with him.

O weteere gị anụ.

O weteere gị anụ.

He brought meat for you.

Nkọwa okwu logo

Learning Igbo made easy, free, and accessible.

Join our mailing list

© 2025 Nkọwa okwu 501(c)(3). All rights reserved.