wébà
webà
Word | webà |
Definitions | Active verb 1.take inside |
Related Terms | |
Word Stems |
Examples
Gịnị mere ị ji eweba ya.
Gịnị mere ị ji eweba ya.
Why are you taking it inside.
Ọ bụ Ada na-eweba ihe ahụ oge ọbụla.
Ọ bụ Ada na-eweba ihe ahụ oge ọbụla.
It is Ada that takes that thing inside all the time.
Ebee ka ị na-eweba ego ahụ?
Ebee ka ị na-eweba ego ahụ?
Where are you taking that money into?
Anyị na-achọ onye ga-eweba akwụkwọ a n'ebe a na-ele ule.
Anyị na-achọ onye ga-eweba akwụkwọ a n'ebe a na-ele ule.
We are looking for someone that will take this paper into the exam hall.
Webaa akwụkwọ a n'ime ụlọ.
Webaa akwụkwọ a n'ime ụlọ.
Take this book inside the house.
Achọrọ m ịweba mma a.
Achọrọ m ịweba mma a.
I want to take this knife inside.
Onye webara efere Okeke n'usekwu anyị?
Onye webara efere Okeke n'usekwu anyị?
Who took Okeke's plate into our kitchen?
Ọ bụ Emeka webara ya.
Ọ bụ Emeka webara ya.
It is Emeka that took it inside.
wémì
wemì
Word | wemì |
Definitions | Active verb 1.take far away; take far inside |
Related Term | |
Word Stem |
Examples
Di m ga-ewemi ego a ewemi ma ọ bịa.
Di m ga-ewemi ego a ewemi ma ọ bịa.
My husband will take this money far inside when he arrives.
Wemie akwụkwọ a ewemi.
Wemie akwụkwọ a ewemi.
Take this book far inside.
Asadụ wemiri ude ahụ ewemi.
Asadụ wemiri ude ahụ ewemi.
Asadụ took the pomade far away.
Ha wemiri ya ewemi.
Ha wemiri ya ewemi.
They took it far inside.
Ọ na-ewemi ihe niile ewemi.
Ọ na-ewemi ihe niile ewemi.
He takes everything far inside.
Ọ ka mma iwemi ya n'ime.
Ọ ka mma iwemi ya n'ime.
It is better to take it far inside.