Nkọwa okwu logo
Beta

wá

wa

Wordwa
Definitions

Active verb

1.separate by having different parts or halves spread; parts of a thing detach from each other;

2.shatter; break; split

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

Obi wara nkụ ahụ.

Obi wara nkụ ahụ.

Obi split the wood.

Enyo ahụ wara ụnyaahụ.

Enyo ahụ wara ụnyaahụ.

The mirror shattered yesterday.

Onye chọrọ ịwa ọjị a?

Onye chọrọ ịwa ọjị a?

Who wants to break this kola-nut?

Anyị ga-awa ọjị tupu anyị ejebe.

Anyị ga-awa ọjị tupu anyị ejebe.

We will break kola before going.

Kedu onye na-awa nkụ n'azụ ụlọ?

Kedu onye na-awa nkụ n'azụ ụlọ?

Who chops wood in the backyard?

Waa oji ka anyi taa.

Waa oji ka anyi taa.

Break kola-nut let us eat.

-wá

-wa

Word-wa
Definitions

Extensional suffix

1.(light vowel harmonizer) begin to; be in the process of; keep on(doing)

Related Terms

No related terms

Word Stems

No word stems

Examples

Bịawa azụ.

Bịawa azụ.

Keep on coming backwards.

há

ha

Wordha
Definitions

Pronoun

1.third-person plural pronoun (they, them, and their)

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

Ha gara ụlaakwụkwọ taa.

Ha gara ụlaakwụkwọ taa.

They went to school today.

Ha na-abịa ugbua.

Ha na-abịa ugbua.

They are coming now.

Gaa gwa ha mee ọsọọsọ.

Gaa gwa ha mee ọsọọsọ.

Go and tell them to be fast.

E nyere ha onyinye dị ichiiche.

E nyere ha onyinye dị ichiiche.

They were given different types of gifts.

Nke ahụ bụ nke ha.

Nke ahụ bụ nke ha.

That one is thier own.

Ọ bụ ha ka e dobeere nri a.

Ọ bụ ha ka e dobeere nri a.

They are the ones the food was kept for.

Enyere m ha ego.

Enyere m ha ego.

I gave them money.

Ama m ebe ha gara.

Ama m ebe ha gara.

I know where they went to.

Olundi ha dị iche.

Olundi ha dị iche.

Their dialect is different.

Akwụkwọ ahụ bụ nke ha.

Akwụkwọ ahụ bụ nke ha.

That book is their own.

Anyị na ha ga-abịa taata.

Anyị na ha ga-abịa taata.

We and they will come today.

Nna ha zụtara ụgbọala ọhụrụ.

Nna ha zụtara ụgbọala ọhụrụ.

Their father bought a new car.

A hụrụ m ha n'ugbo.

A hụrụ m ha n'ugbo.

I saw them in the farm.

'Ha' bụ nnọchịaha n'Igbo.

'Ha' bụ nnọchịaha n'Igbo.

'Ha' is a pronoun in Igbo.

mà

Wordmà
Definitions

Conjunction

1.whether; if (in middle of a sentence)

2.but (short form of mana)

3.including; and also

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

Jụọ nwoke ahụ ma ọ ga-abịa echi.

Jụọ nwoke ahụ ma ọ ga-abịa echi.

Ask the man if he will come tomorrow.

Ahụrụ m Ekene ma Ekene ahụghị m.

Ahụrụ m Ekene ma Ekene ahụghị m.

I saw Ekene but Ekene did not see me.

Ma Ekezie ma Isiguzo, enweghị onye nke bịara ọrụ taa.

Ma Ekezie ma Isiguzo, enweghị onye nke bịara ọrụ taa.

Both Ekezie and Isiguzo, none came to work today.

Ọ mara mma ma nke a kachasị maa mma.

Ọ mara mma ma nke a kachasị maa mma.

It is beautiful but this one is most beautiful.

Nwaanyị a mara mma ma nweekwa ego.

Nwaanyị a mara mma ma nweekwa ego.

This lady is pretty and also rich.

-há

-ha

Word-ha
Definitions

Extensional suffix

1.almost; about to

Related Term
Word Stem

No word stems

Examples

Oge naha eru mgbe anyị ji aga ịkpa isi anyị.

Oge naha eru mgbe anyị ji aga ịkpa isi anyị.

It's almost time for us to go to weave our hair.

Ụnụ naha eri?

Ụnụ naha eri?

Are you people almost eating?

Emeka naha abịa.

Emeka naha abịa.

Emeka is about to come.

gwú

gwu

Wordgwu
Definitions

Active verb

1.make a hole in a very thick surface, especially the ground; dig

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

Gwuo ala ebe ahụ.

Gwuo ala ebe ahụ.

Dig a hole there.

A ga-egwu ala tinye ya.

A ga-egwu ala tinye ya.

The ground will be dug and it will be put.

Ndịagha gwuru bọnka oge agha.

Ndịagha gwuru bọnka oge agha.

Soldiers dug bonka during the war.

Mmadụ ole gwuru ili ahụ?

Mmadụ ole gwuru ili ahụ?

How many people dug that grave?

ḿbà

mbà

Wordmbà
Definitions

Interjection

1.no; an expression of negative outcome, disagreement or refusal

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

Mba! Achọghị m enyemaka gị.

Mba! Achọghị m enyemaka gị.

No! I do jot need your help.

Gịnị mere i ji sị ya mba?

Gịnị mere i ji sị ya mba?

Why did you say no to him?

Ịsị m mba bụ oge ka ị na-egbu.

Ịsị m mba bụ oge ka ị na-egbu.

Saying no to me is wasting your time.

Agwara m ya ṅụọ ọgwụ ya mana ọ sịrị, mba.

Agwara m ya ṅụọ ọgwụ ya mana ọ sịrị, mba.

I told him to take his drugs but he said no.

Mba, agaghị m eri nri ugbu a.

Mba, agaghị m eri nri ugbu a.

No, I will not eat now.

Ị sị mba anaghị ara ya ahụ.

Ị sị mba anaghị ara ya ahụ.

He does not find it difficult saying no.

Arịọrọ m ya ego, ọ sị mba.

Arịọrọ m ya ego, ọ sị mba.

I begged him for money but he said no.

Ọ sịrị nne ya mba.

Ọ sịrị nne ya mba.

He said no to her mother.

lötá

lọta

Wordlọta
Definitions

Active verb

1.return (home); come back

Related Term
Word Stem

No word stems

Examples

Anyị hụrụ ya mgbe anyị na-alọta.

Anyị hụrụ ya mgbe anyị na-alọta.

We saw him when we were coming back.

Nwaanyị laa, nnwa gị ga-alọta echi.

Nwaanyị laa, nnwa gị ga-alọta echi.

Go home woman, your child will return tomorrow.

Onye bụ onye ahụ lọtara n'abalị?

Onye bụ onye ahụ lọtara n'abalị?

Who was the person that returned last night?

Lọta, ihe adịwo mma!

Lọta, ihe adịwo mma!

Retrun, things are fine.

Kedụ mgbe ọ ga-amasị gị ịlọta?

Kedụ mgbe ọ ga-amasị gị ịlọta?

When would you like to return?

Ị lọta, i sie nri.

Ị lọta, i sie nri.

If you return, you cook.

Ọchị juru ya ihu mgbe ọ na-alọta.

Ọchị juru ya ihu mgbe ọ na-alọta.

His face was filled with smile as he returned home.

Nwunye ya lọtara n'abalị ụnyaahụ.

Nwunye ya lọtara n'abalị ụnyaahụ.

His wife returned yesterday night.

Kedu mgbe ọ lọtara?

Kedu mgbe ọ lọtara?

When did he return?

Nna m na-alọta n'oge.

Nna m na-alọta n'oge.

My father returns early.

Nkọwa okwu logo

Learning Igbo made easy, free, and accessible.

Join our mailing list

© 2025 Nkọwa okwu 501(c)(3). All rights reserved.