Nkọwa okwu logo
Beta

úrù

urù

Wordurù
Definitions

Noun

1.the soft tissues of humans, animals, or fruits' bodies, especially that which cover an inner part which is often harder; flesh

2.gain; profit; value;

3.advantage; benefit

Related Terms
Word Stems

Examples

Deputa uru abụọ dị n'iri ezigbo nri.

Deputa uru abụọ dị n'iri ezigbo nri.

Write out two imporance of eating good food.

Biko hapu ihe a ị na-eme, uru adịghị na ya.

Biko hapu ihe a ị na-eme, uru adịghị na ya.

Please leave this thing you are doing, there is no gain in it.

O riteghị uru ọbụla n'ihe ahụ.

O riteghị uru ọbụla n'ihe ahụ.

He did not benefit anything from that thing.

Kedụ uru ọ bara?

Kedụ uru ọ bara?

What is the benefit?

Uru adịghị n'ahịa ahụ ị chọrọ ịzụ.

Uru adịghị n'ahịa ahụ ị chọrọ ịzụ.

There's no gain in that business yo want to do.

úrùégó

urùegō

Wordurùegō
Definitions

Noun

1.profit; gain

Variationsurù egō
Related Terms
Word Stems

Examples

Oji enyi nwee kwee ọya kedụzị anụ ọzọ ọ chọrọ ịmata

Oji enyi nwee kwee ọya kedụzị anụ ọzọ ọ chọrọ ịmata

After catching an elephant, which other animal do you want to catch?

Ahịa ahụ nyere ya ezigbo uruego.

Ahịa ahụ nyere ya ezigbo uruego.

The business gave him a lot of profit.

Onye ahịa ọbụla na-achọ uruego.

Onye ahịa ọbụla na-achọ uruego.

Every trader is looking for profit.

Ọ naghị achọ oke uruego.

Ọ naghị achọ oke uruego.

She is not so mindful of profit.

O nwetere uruego na azụmaahịa ya.

O nwetere uruego na azụmaahịa ya.

He made profit in his business.

Udo na-eji aghụghọ enweta uruego.

Udo na-eji aghụghọ enweta uruego.

Udo makes profit through dubious means.

Enweghị m uruego n'ahịa.

Enweghị m uruego n'ahịa.

I did not make profit in this business.

O ji uruego anyị.

O ji uruego anyị.

He has our profit.

O jikpara uruego m.

O jikpara uruego m.

He ceased my profit.

úrùghùrù

urùghùrù

Wordurùghùrù
Definitions

Noun

1.flesh; small piece of meat without bones

Related Terms
Word Stems

Examples

Urughuru anụ na-atọ ụtọ.

Urughuru anụ na-atọ ụtọ.

Fleshy pieces of meat are tasty.

Enwere m urughuru anụ n'ime ofe m.

Enwere m urughuru anụ n'ime ofe m.

I have fleshy pieces meat in my soup.

A na-enyekarị ụmụaka urughuru anụ.

A na-enyekarị ụmụaka urughuru anụ.

Children are usually given fleshy meat.

ìmèríìmè

ìmèriìmè

Wordìmèriìmè
Definitions

Quantifier

1.most; plenty; a large number

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

Imeriime mmadụ bịara ebe a.

Imeriime mmadụ bịara ebe a.

A great crowd came here.

Ndị na-abịaghị n'oge dị imeriime.

Ndị na-abịaghị n'oge dị imeriime.

The late comers were many.

Imeerime ndị mmadụ kwụrụ ụgwọ enwetaghị akwụkwọ ha.

Imeerime ndị mmadụ kwụrụ ụgwọ enwetaghị akwụkwọ ha.

A large number of people that paid, couldn't get their papers.

Kedụ ka a ga-esi zie imerime mmadụ ahụ ozi?

Kedụ ka a ga-esi zie imerime mmadụ ahụ ozi?

How will those large number of people be informed?

Ọrịa ahụ metụtara imeriime mmadụ.

Ọrịa ahụ metụtara imeriime mmadụ.

That sickness affected large number of people.

Ọ zụrụ imeriime ụlọ na be anyị.

Ọ zụrụ imeriime ụlọ na be anyị.

He bought a large number of houses.

Imeriime n'ime ha bụ ndị nkụzi.

Imeriime n'ime ha bụ ndị nkụzi.

Many of them are teachers.

Imeriime n'ime ha gbara ọsọ.

Imeriime n'ime ha gbara ọsọ.

Many of them ran away.

Imeriime n'ime anyị ahụghị Obi n'anya.

Imeriime n'ime anyị ahụghị Obi n'anya.

Many of us do not love Obi.

ápįtį

apị̀tị̀

Wordapị̀tị̀
Definitions

Noun

1.mud; mire; swamp; marsh

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

Chisịmdị zọnyere ụkwụ n'apịtị.

Chisịmdị zọnyere ụkwụ n'apịtị.

Chisimdi stepped in a mud.

Ụkwụ mịchapụrụ m na apịtị.

Ụkwụ mịchapụrụ m na apịtị.

My leg slipped on the mud.

Ụgbaala a agaghị agbafenwu apịtị a.

Ụgbaala a agaghị agbafenwu apịtị a.

This car cannot drive pass this mire.

Ụzọ niile jupụtara na apịtị ka ha rụsịrị ya.

Ụzọ niile jupụtara na apịtị ka ha rụsịrị ya.

The road was filled with mud after they finished construction.

Ụkwụ mịchapụrụ m na apịtị.

Ụkwụ mịchapụrụ m na apịtị.

My leg slipped on the mud.

Chisịmdị zọnyere ụkwụ n'apịtị.

Chisịmdị zọnyere ụkwụ n'apịtị.

Chisimdi stepped in a mud.

Ụzọ niile jupụtara n'apịtị ka ha rụsịrị ya.

Ụzọ niile jupụtara n'apịtị ka ha rụsịrị ya.

The road was filled with mud after they finished construction.

Ụgbaala a agaghị agbafenwu apịtị a.

Ụgbaala a agaghị agbafenwu apịtị a.

This car cannot drive pass this mire.

O ji ụgbaala ya gbaa ya apịtị.

O ji ụgbaala ya gbaa ya apịtị.

He splashed him mud with his vehicle.

pǫtǫpötö

pọ̀tọ̀pọtọ

Wordpọ̀tọ̀pọtọ
Definitions

Noun

1.wet muddy soil;

2.(colloquial) mash (eg. porridge yam); pulp

Related Term
Word Stem

No word stems

Examples

Esila ebe ahụ! Pọtọpọtọ dị ya.

Esila ebe ahụ! Pọtọpọtọ dị ya.

Don't take that place! It is muddy.

Ji o siri enweghi pọtọpọtọ.

Ji o siri enweghi pọtọpọtọ.

The yam she cooked does not have pulp.

Ọ kwọrọ ọka ahụ ọ dị pọtọpọtọ.

Ọ kwọrọ ọka ahụ ọ dị pọtọpọtọ.

He grounded the corn to pulp.

Ụzọ a dị pọtọpọtọ maka mmiri zoro n'abalị.

Ụzọ a dị pọtọpọtọ maka mmiri zoro n'abalị.

This road is muddy because of the rain that fall last night.

Ụzọ anyị niile jupụtara na pọtọpọtọ.

Ụzọ anyị niile jupụtara na pọtọpọtọ.

All our roads are full of mud.

Pọtọpọtọ karịrị ebe a.

Pọtọpọtọ karịrị ebe a.

This place is very muddy.

Moto ahụ gbasara m pọtọpọtọ.

Moto ahụ gbasara m pọtọpọtọ.

The car splashed mud on me.

ųlü

ụ̀lụ

Wordụ̀lụ
Definitions

Noun

1.theft; deception; checkered character

Related Term
Word Stem

No word stems

Examples

Onye ụlụ anaghị ebi ogologo ndụ.

Onye ụlụ anaghị ebi ogologo ndụ.

A deceptive person does not live long.

Ịrụ ụlụ ajọka.

Ịrụ ụlụ ajọka.

Thieving is bad.

Ọtụtụ ndị ụlụ nọ na klaasị m.

Ọtụtụ ndị ụlụ nọ na klaasị m.

Many people of checkered character are in my class.

E jidere ya n'ụlụ.

E jidere ya n'ụlụ.

She was caught in an unhealthy behaviour.

Ọ na-alụ ụlụ.

Ọ na-alụ ụlụ.

She is deceptive.

Nkọwa okwu logo

Learning Igbo made easy, free, and accessible.

Join our mailing list

© 2025 Nkọwa okwu 501(c)(3). All rights reserved.