ùlé
ùle
Word | ùle |
Definitions | Noun 1.examination; an exam |
Related Term | |
Word Stem |
Examples
Ule anyị ga-ebido n'izụụka ọzọ.
Ule anyị ga-ebido n'izụụka ọzọ.
Our exams will start next week.
Ọ bụ ule a ga-akwago gị na klaasị ọzọ.
Ọ bụ ule a ga-akwago gị na klaasị ọzọ.
It is this exam that will promote you to another class.
Ọ dara ule ahụ.
Ọ dara ule ahụ.
He failed that exam
Onye nkuzi anyị jụrụ ihe ọ kuzighi anyị n' ule.
Onye nkuzi anyị jụrụ ihe ọ kuzighi anyị n' ule.
Our teacher asked what she didn't teach us in the exam.
Nkechi gbara onye nke mbụ n'ule ahụ.
Nkechi gbara onye nke mbụ n'ule ahụ.
Nkechi came top in that examination.
ńnwàlé
nnwàle
Word | nnwàle |
Definitions | Noun 1.a trial to see how good something is; test (also academic) 2.practice |
Related Terms | |
Word Stems |
Examples
Akara Chike kacha nke onye ọbụla dere nnwale ahụ.
Akara Chike kacha nke onye ọbụla dere nnwale ahụ.
Chike's mark is the highest of all that wrote the test.
Ọ bịara mgbe anyị dechara nnwale.
Ọ bịara mgbe anyị dechara nnwale.
He came after we wrote the test.
Ha hụrụ ajụjụ nnwale ahụ tupụ anyị edee ya.
Ha hụrụ ajụjụ nnwale ahụ tupụ anyị edee ya.
They saw the test question before we wrote it.
Ọ dara nnwale asụsụ bekee.
Ọ dara nnwale asụsụ bekee.
He failed the English language test.
Ọ bụ akwụkwọ nnwale Ngozi tọgbọrọ n'ala.
Ọ bụ akwụkwọ nnwale Ngozi tọgbọrọ n'ala.
It is Ngozi's test book that laid on the floor.
ùré
ùre
Word | ùre |
Definitions | Noun 寇津 1.decomposition; rot 2.(figurative) very bad |
Variations | ure |
Related Term | |
Word Stem | No word stems |
Examples
E tufuru nri mmemme ahụ rere ure.
E tufuru nri mmemme ahụ rere ure.
The rotten ceremonial food was disposed.
Agwa ya rere ure.
Agwa ya rere ure.
Her character is very bad.
Ọka ọ kọrọ rere ure n'ala.
Ọka ọ kọrọ rere ure n'ala.
The maize she planted got decomposed on the ground.
Ha ji ji rere ure tụọ mmamma.
Ha ji ji rere ure tụọ mmamma.
They came to thansgiving with rotten yam.
Ji ahụ n'ere ure n'ala.
Ji ahụ n'ere ure n'ala.
The yam is rotting in the ground.
O nwere eze ure.
O nwere eze ure.
His teeth is decayed.
Onye dowere ọjị rere ure?
Onye dowere ọjị rere ure?
Who kept the rotten kola nut?
Ọ ga-ere ure ma ịhapụ ya.
Ọ ga-ere ure ma ịhapụ ya.
It will rot if you leave it.
ìzìükwü
ìzìụkwụ̄
Word | ìzìụkwụ̄ |
Definitions | Noun 1.leg ulcer; the open wound on the leg that takes more than two weeks to heal despite treatments |
Variations | ìzì ụkwụ̄ |
Related Term | |
Word Stem |
Examples
E nwere ụdịrị iziụkwụ dị iche iche.
E nwere ụdịrị iziụkwụ dị iche iche.
There are different types of leg ulcer.
Iziụkwụ ya anaghị ekwe ya gaa ije.
Iziụkwụ ya anaghị ekwe ya gaa ije.
The leg ulcer doesn't allow him to walk.
Kedụ ihe na-ebute iziụkwụ?
Kedụ ihe na-ebute iziụkwụ?
What causes leg ulcer?
Anyị amaghị mgbe iziụkwụ ahụ bidoro ya.
Anyị amaghị mgbe iziụkwụ ahụ bidoro ya.
We don't know when that leg ulcer started.
Iziụkwụ ọ rịara boro ya nnukwu apa.
Iziụkwụ ọ rịara boro ya nnukwu apa.
The leg ulcer she suffered gave her a big scare.
Iziukwu ya na-esi isi.
Iziukwu ya na-esi isi.
His leg ulcer is smelling.
O nwere iziụkwụ n'ụkwụ abụọ.
O nwere iziụkwụ n'ụkwụ abụọ.
He has leg ulcer on the two legs.
Amaka na-arịa iziụkwụ.
Amaka na-arịa iziụkwụ.
Amaka has leg ulcer.
Onye na-arịa iziụkwụ?
Onye na-arịa iziụkwụ?
Who is suffering from leg ulcer?
Iziụkwụ gburu nna ya.
Iziụkwụ gburu nna ya.
His father died of leg ulcer.
Iziụkwụ anaghị ala ngwa ngwa.
Iziụkwụ anaghị ala ngwa ngwa.
Leg ulcer takes time to heal.
Enwere m ọgwụ maka iziụkwụ.
Enwere m ọgwụ maka iziụkwụ.
I have a drug for leg ulcer.
Ndị obi ọjọọ na-eme mmadụ iziụkwụ.
Ndị obi ọjọọ na-eme mmadụ iziụkwụ.
Wicked people inflict people with leg ulcer.