Nkọwa okwu logo
Beta

kwüsï

kwụsị

Wordkwụsị
Definitions

Active verb

1.stop

Related Terms
Word Stems

Examples

Aga m akwụsị n'ihu.

Aga m akwụsị n'ihu.

I will stop at the front.

Kedu mgbe ị chọrọ ịkwụsị agwa a?

Kedu mgbe ị chọrọ ịkwụsị agwa a?

When do you want to stop this behaviour?

Ọ na-akwụsị ma ọ hụ m.

Ọ na-akwụsị ma ọ hụ m.

She stops if she sees me.

Kwụsị ya ugbua!

Kwụsị ya ugbua!

Stop it now!

kpöḿ

kpọm

Wordkpọm
Definitions

Punctuations

1.full stop, period

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

Otu n'ime akara edemede e nwere bụ kpom.

Otu n'ime akara edemede e nwere bụ kpom.

One of the punctuation marks is full stop.

Ada edeghị kpọm a na-ahụ anya.

Ada edeghị kpọm a na-ahụ anya.

Asa wrote an illegible full stop.

E jikwa kpọm edebiri mkpụrụokwu.

E jikwa kpọm edebiri mkpụrụokwu.

Full stop is also used to indicate the abbreviation of words.

Gwa m ọrụ kpọm na-arụ n' ahịrịokwu.

Gwa m ọrụ kpọm na-arụ n' ahịrịokwu.

Tell me the functions of full stop in a sentence.

Tinye kpọm na ngwụcha ahịrịokwu gị.

Tinye kpọm na ngwụcha ahịrịokwu gị.

Add full stop at the end of your sentence.

E ji kpọm emechi ahịrịokwu.

E ji kpọm emechi ahịrịokwu.

Full stop is used to end a sentence.

nápų árá

napụ̀ ara

Wordnapụ̀ ara
Definitions

Active verb

1.wean; stop a baby from taking the mother's milk

2.take away a source of income or source of feeding

Related Terms
Word Stems

Examples

Napụ nwa ahụ ara ka i zuo ike.

Napụ nwa ahụ ara ka i zuo ike.

Wean that child so that you can rest.

Nne ya napụrụ ya ara n'oge

Nne ya napụrụ ya ara n'oge

Her mother weaned her early

Iwu ahụ ga-anapụ ndị mmadụ ara.

Iwu ahụ ga-anapụ ndị mmadụ ara.

That law will take away people's source of income.

Ọ na-anapu umu ya ara ma ha ruo afọ abụọ.

Ọ na-anapu umu ya ara ma ha ruo afọ abụọ.

She weans her children whenever they are two years old.

jédébé

jedebe

Wordjedebe
Definitions

Active verb

1.come to a stop, stop walking; end a journey; termination point

Related Terms
Word Stems

Examples

Ị chọrọ ijedebe ebe a?

Ị chọrọ ijedebe ebe a?

Do you want to stop here?

Ọ bụ ebe a ka o na-ejedebe oge ọbụla.

Ọ bụ ebe a ka o na-ejedebe oge ọbụla.

This is where he stops every time.

Jedebee ebe a!

Jedebee ebe a!

Stop here!

Ọ ga-ejedebe ebe a taa, bidokwa ọzọ echi.

Ọ ga-ejedebe ebe a taa, bidokwa ọzọ echi.

He will stop here today, and continue again tomorrow.

Na be Okeke ka m jedebere ije m.

Na be Okeke ka m jedebere ije m.

I ended my journey at Okeke's house.

bédéwé

bedewe

Wordbedewe
Definitions

Active verb

干豪干

1.stop crying

Related Terms
Word Stems

Examples

Bedewe, ọ dịwo mma.

Bedewe, ọ dịwo mma.

Stop crying, it is well.

Nwata ahụ bedewere akwa ozugbo nne ya nyere ya achịcha.

Nwata ahụ bedewere akwa ozugbo nne ya nyere ya achịcha.

The child stopped crying immediately his mother gave him biscuit.

Ekene bedewere akwa mgbe nna ya lọtara.

Ekene bedewere akwa mgbe nna ya lọtara.

Ekene stopped crying when his father returned.

M ga-ebedewe akwa ma i meere m ihe m rịọrọ gị.

M ga-ebedewe akwa ma i meere m ihe m rịọrọ gị.

I will stop crying if you do grant my wish.

Ọtụtụ na-ebedewe akwa n'ụkwụ Onyenweanyị.

Ọtụtụ na-ebedewe akwa n'ụkwụ Onyenweanyị.

Many stops crying at our Lords feet.

O nwere ike ibedewe akwa ma o rie nri.

O nwere ike ibedewe akwa ma o rie nri.

He might stop crying if he eats.

güdēbē

gụdēbē

Wordgụdēbē
Definitions

Active verb

1.stop reading

Related Terms
Word Stems

Examples

Adanna kwesịrị ịgụdebe ebe a.

Adanna kwesịrị ịgụdebe ebe a.

Adanna is supposed to stop reading here.

Achọrọ m ịgụdebe ebe a.

Achọrọ m ịgụdebe ebe a.

I want to stop reading here.

Ọ gụdebere na praịmarị nke anọ.

Ọ gụdebere na praịmarị nke anọ.

He stopped studying at primary four.

Ebee ka ọ gwara gị gụdebe?

Ebee ka ọ gwara gị gụdebe?

Where did he ask to stop reading?

Ebe a ka ọ ga-agụdebe.

Ebe a ka ọ ga-agụdebe.

This is where he will stop reading.

Gụdebe akwụkwọ ahụ!

Gụdebe akwụkwọ ahụ!

Stop reading that book!

Ha ga-agụdebe n'isi nke iri.

Ha ga-agụdebe n'isi nke iri.

They will stop reading at chapter ten.

Okeke gụdebere na klaasị nke ise.

Okeke gụdebere na klaasị nke ise.

Okeke stopped reading at class five.

Ọ bụ ebe a ka ndị be ha na-agụdebe akwụkwọ.

Ọ bụ ebe a ka ndị be ha na-agụdebe akwụkwọ.

This where their people stop reading book.

Gịnị mere i ji gụdebe ebe a?

Gịnị mere i ji gụdebe ebe a?

Why did you stop reading here?

Ọ dịghị mma ịgụdebe ugbu a.

Ọ dịghị mma ịgụdebe ugbu a.

It is not proper to stop studying now.

chédébé

chedebe

Wordchedebe
Definitions

Active verb

1.stop or seize waiting;

2.stop thinking about something

Related Term
Word Stem

Examples

Chedebe ha.

Chedebe ha.

Stop waiting for them.

Ọkwọ ụgbọala a na-echedebe ndị mmadụ ma ọ kụọ elekere nke abụọ n'ehihie.

Ọkwọ ụgbọala a na-echedebe ndị mmadụ ma ọ kụọ elekere nke abụọ n'ehihie.

This driver stops waiting for people at 2pm.

Ị ga-echedebe ha echi.

Ị ga-echedebe ha echi.

Tomorrow, you stop waiting for them.

Chedebe ụdị echiche a.

Chedebe ụdị echiche a.

Stop having this kind of thoughts.

M ga-echedebe ya.

M ga-echedebe ya.

I will stop waiting for him.

Emeka chedebere gị oge ọ kụrụ elekere nke iri n'ụtụtụ a.

Emeka chedebere gị oge ọ kụrụ elekere nke iri n'ụtụtụ a.

Emeka stopped waiting for you when at 10am.

Ha nwere ike ichedebe ya.

Ha nwere ike ichedebe ya.

They might stop waiting for him.

Ọ dịla anya o chedebere ha.

Ọ dịla anya o chedebere ha.

It has been long he stopped waiting for them.

gwödébé

gwọdebe

Wordgwọdebe
Definitions

Active verb

1.stop healing or treating;

2.stop doing Voodoo or Juju

Related Term
Word Stem

Examples

O teela ọ gwọdebere ya.

O teela ọ gwọdebere ya.

It has been long he stopped treating her.

Ugonwa na-agwọdebe ọrịa n'ụzọ.

Ugonwa na-agwọdebe ọrịa n'ụzọ.

Ugonwa stops treating diseases halfway.

Gịnị mere i ji gwọdebe nwoke ahụ ọrịa?

Gịnị mere i ji gwọdebe nwoke ahụ ọrịa?

Why did you stop treating that man of his sickness?

Dkt. ga-agwọdebe Eze ma ọ bụrụ na nwa ya ewetaghị ego.

Dkt. ga-agwọdebe Eze ma ọ bụrụ na nwa ya ewetaghị ego.

The Dr. will stop treating Eze if his son fails to bring money.

Gwọdebe ya biko.

Gwọdebe ya biko.

Stop treating him please.

Ọ gaghị amasị m ma ọ gwọdebe m ọrịa.

Ọ gaghị amasị m ma ọ gwọdebe m ọrịa.

I will not like it if she stops treating me.

Ebe a ka a gwọdebere ya tupu ọ nwụọ.

Ebe a ka a gwọdebere ya tupu ọ nwụọ.

This was were he was last healed before he died.

Ọ ka mma ịgwọdebe ya ebe a.

Ọ ka mma ịgwọdebe ya ebe a.

It is better to stop the treatment here.

Enwere m ike ịgwọdebe gị ma ị kwụghị ụgwọ.

Enwere m ike ịgwọdebe gị ma ị kwụghị ụgwọ.

I might stop treating you if you do not pay.

Dọkịta sịrị na ya ga-agwọdebe nna anyị ọrịa ma ọ bụrụ na anyị ewetaghị ego.

Dọkịta sịrị na ya ga-agwọdebe nna anyị ọrịa ma ọ bụrụ na anyị ewetaghị ego.

The doctor said that he will stop treating our father's sickness if we do not pay.

chádébē

chadebē

Wordchadebē
Definitions

Active verb

1.stop shinning or radiating

Related Term
Word Stem

Examples

O mere ka okụ chadebe.

O mere ka okụ chadebe.

He made the light to stop shinning.

Kedu mgbe anwụ ga-achadebe?

Kedu mgbe anwụ ga-achadebe?

When does the sun stop shinning?

Ọkụ a nwere ike ịchadebe n'oge na-adịghị anya.

Ọkụ a nwere ike ịchadebe n'oge na-adịghị anya.

This light might stop shinning in no distant time.

Ọkụ na-achadebe mgbe mmiri na-ezo.

Ọkụ na-achadebe mgbe mmiri na-ezo.

The light stops shinning when rain is falling.

Kedu mgbe ọkụ a chadebere?

Kedu mgbe ọkụ a chadebere?

When did this light stop shinning?

kúbì

kubì

Wordkubì
Definitions

Active verb

彰韻

1.stop breathing (suddenly)

Related Term
Word Stem

Examples

Ntụtụ a gbara ya mere ka o kubie.

Ntụtụ a gbara ya mere ka o kubie.

The injection given to him made him to stop breathing.

Agwakwala nne gị ihe mere ka ọ ghara ikubi ume.

Agwakwala nne gị ihe mere ka ọ ghara ikubi ume.

Don't tell your mother what happened so she won't have a heart attack (stop breathing suddenly).

Onye na-ekubi?

Onye na-ekubi?

Who is stopping to breath?

O kubie, e lie ya.

O kubie, e lie ya.

If he stops breathing, he will be buried.

Ọ chọrọ ikubi?

Ọ chọrọ ikubi?

She wants to stop breathing.

O kubiri ozugbo a gbara ya egbe.

O kubiri ozugbo a gbara ya egbe.

He stopped breathing immediately he was shot.

Ọ ga-ekubi ma iwepụ ihe a n'imi ya.

Ọ ga-ekubi ma iwepụ ihe a n'imi ya.

He will stop breathing if you remove this thing from his nose.

Kpọghee windo, mmadụ ga-ekubi.

Kpọghee windo, mmadụ ga-ekubi.

Open the window, somebody will stop breathing.

Adanna na-ekubi mgbe dọkịta bịara.

Adanna na-ekubi mgbe dọkịta bịara.

Ada was stopping to breath when the doctor arrived.

Nkọwa okwu logo

Learning Igbo made easy, free, and accessible.

Join our mailing list

© 2026 Nkọwa okwu 501(c)(3). All rights reserved.