má úbè
ma ubè
| Word | ma ubè |
| Definitions | Active verb 1.pierce with a spear |
| Related Terms | |
| Word Stems |
Examples
Ịma ube abụghị ihe ụmụaka.
Ịma ube abụghị ihe ụmụaka.
To pierce with a spear is not a child's play.
Ọ ga-ama ya ube.
Ọ ga-ama ya ube.
She will pierce him with a spear.
Lee ebe a mara ya ube ahụ.
Lee ebe a mara ya ube ahụ.
See where he was pierced with a spear.
Uche si na ọ ga-ama onyeohi ahụ ube.
Uche si na ọ ga-ama onyeohi ahụ ube.
Uche said he will pierce the thief with a spear.
Anyị maa ya ube a, ọ ga-anwụ.
Anyị maa ya ube a, ọ ga-anwụ.
If we pierce him with this spear, he will die.
Ha bụ ndị na-ama ube.
Ha bụ ndị na-ama ube.
They are the people who pierce with a spear.
Ikenna na-ama ya ube nke ikpeazụ.
Ikenna na-ama ya ube nke ikpeazụ.
Ikenna is piercing him with the spear for the last time.
Ọ na-amasị ya ịma ube.
Ọ na-amasị ya ịma ube.
He likes piercing with a spear.
Onye mara ya ube?
Onye mara ya ube?
Who pierced him with a spear?
úbè
ubè
| Word | ubè |
| Definitions | Noun 㫡 1.spear; a pole weapon with a sharp point |
| Related Terms | |
| Word Stems | No word stems |
Examples
Enwere ike iji osisi pịa ube.
Enwere ike iji osisi pịa ube.
Wood can be used for making of spear.
Nwoke ahụ mara ya ube.
Nwoke ahụ mara ya ube.
That man stabbed him with spear.
Ube na-eto ogologo.
Ube na-eto ogologo.
Spear is long in length.
Nna m na-edowe ube ya ebe anya agaghị ahụ ya.
Nna m na-edowe ube ya ebe anya agaghị ahụ ya.
My father keeps his spear where eyes can't see.
Ube m adịghzị nkọ?
Ube m adịghzị nkọ?
My spear is no longer sharp.
I nwere ube?
I nwere ube?
Do you have a spear?
màpú
màpu
| Word | màpu |
| Definitions | Active verb 1.pierce (with knife, spear, etc.); stab |
| Related Term | |
| Word Stem | No word stems |
Examples
Ntu a chọrọ ịmapu m ụkwụ.
Ntu a chọrọ ịmapu m ụkwụ.
This nail wants to pierce my leg.
Ntu a na-amapu ụkwụ ndị mmadụ.
Ntu a na-amapu ụkwụ ndị mmadụ.
This nail pierces people's feet.
Were mma a mapuo nwoke a afọ.
Were mma a mapuo nwoke a afọ.
Use this knife to pierce this man's stomach.
Onye na-ekwu okwu ịmapu mmadụ ahụ?
Onye na-ekwu okwu ịmapu mmadụ ahụ?
Who is talking about stabbing somebody.
Mma a ga-amapu gị aka.
Mma a ga-amapu gị aka.
This knife will pierce your hand.
Kedụ ihe mapuru gị ụkwụ?
Kedụ ihe mapuru gị ụkwụ?
What pierced your leg?
M ga-amapu ya.
M ga-amapu ya.
I will pierce it.
Ihe o ji na-amapu ya esighi ike.
Ihe o ji na-amapu ya esighi ike.
The tool he is piercing it with is not strong.
Ị chọrọ iji osisi ahụ mapuo m afọ?
Ị chọrọ iji osisi ahụ mapuo m afọ?
Do you want to pierce my stomach with that stick?
Ihe a ga-amapu gị ahụ.
Ihe a ga-amapu gị ahụ.
This thing will pierce your body.
Ọbara na mmiri gbapụtara ebe a mapuru Jizọs n' ahụ.
Ọbara na mmiri gbapụtara ebe a mapuru Jizọs n' ahụ.
Blood and water gushed out of the place Jesus was pierced.
Ntu mapuru ya ụkwụ.
Ntu mapuru ya ụkwụ.
Nail pierced her leg.
Ube ahụ mapuru ya ahụ ekweghị ịpụta.
Ube ahụ mapuru ya ahụ ekweghị ịpụta.
The spear that pierced his body refused to come out.
Ha chọrọ ịmapụ bọọlụ m.
Ha chọrọ ịmapụ bọọlụ m.
She wants to puncture my ball.
Igwe nyere iwu na a ga-amapu anya onyeohi ahụ.
Igwe nyere iwu na a ga-amapu anya onyeohi ahụ.
The king gave an order that the eye of the thief will be pierced.
O ji mma mapuo ya.
O ji mma mapuo ya.
He pierced it with a knife.
àchàrà
àchàrà
| Word | àchàrà |
| Definitions | Noun 憲 1.generic name for coarse grass or straw, including bamboo (Oxytenanthera sp.), elephant grass (Pennisetum purpureum) and spear-grass (Imperata cylindrica) |
| Related Terms | |
| Word Stems |
Examples
E ji achara arụ ụlọ ata.
E ji achara arụ ụlọ ata.
Straws are used in building thatch house.
Ọ munyere ọkụ n'achara kpọrọ akpọ.
Ọ munyere ọkụ n'achara kpọrọ akpọ.
He set fire on the dry grass.
Achara juru n'ọhịa ahụ.
Achara juru n'ọhịa ahụ.
Bamboo is plenty in that bush.
Anụrụ m na isi achara na-achụ agwọ.
Anụrụ m na isi achara na-achụ agwọ.
I heard that the smell of lemon grass drives snake away.
Ọ na-aṅụ mmiri oji sie achara ahụ.
Ọ na-aṅụ mmiri oji sie achara ahụ.
She is drinking the water used in boiling that lemon grass.