Nkọwa okwu logo
Beta

rü ükà

rụ ụkà

Wordrụ ụkà
Definitions

Active verb

1.debate; argue; dispute

Related Terms
Word Stems

Examples

Biko, ike ịrụ ụka adịghị m.

Biko, ike ịrụ ụka adịghị m.

Please, I do not have strength to argue.

Nwoke a na-arụ ụka oge niile.

Nwoke a na-arụ ụka oge niile.

This man argues all the time.

Ọ ga-arụ ụka banyere onye nyere goolu ahụ.

Ọ ga-arụ ụka banyere onye nyere goolu ahụ.

He will argue about who scored the goal.

Ị chọrọ ịrụ ụka?

Ị chọrọ ịrụ ụka?

Do you want to argue?

Oke ịrụ ụka adịghị mma.

Oke ịrụ ụka adịghị mma.

Arguing too much is not good.

Rụọ ụka banyere mkpa nne bara n'ụlọ karịa nna.

Rụọ ụka banyere mkpa nne bara n'ụlọ karịa nna.

Debate the importance of mothers in the home over fathers.

Ọ rụrụ ụka banyere mgbe e bidoro emume a.

Ọ rụrụ ụka banyere mgbe e bidoro emume a.

He argued about when the ceremony was started.

Enyi m na-enwe mmasị ịrụ ụka oge niile.

Enyi m na-enwe mmasị ịrụ ụka oge niile.

My friend likes to argue all the time.

dö ńdüdö

dọ n̄dụ̄dọ̄

Worddọ n̄dụ̄dọ̄
Definitions

Active verb

1.argue; draw out a discussion

Related Term
Word Stem

Examples

Nwaanyị a dọọ ndụdọ ebe a, ị kpọọ ya asị.

Nwaanyị a dọọ ndụdọ ebe a, ị kpọọ ya asị.

If this woman argues here, you will dislike her.

Oge niile ka nwoke a na-adọ ndụdọ.

Oge niile ka nwoke a na-adọ ndụdọ.

This man argues every time.

Ọ na-amasị ya ịdọ ndụdọ.

Ọ na-amasị ya ịdọ ndụdọ.

She likes arguing.

Ebuka na-adọ ndụdọ n'ụlọụka.

Ebuka na-adọ ndụdọ n'ụlọụka.

Ebuka is arguing in the church.

Ị ga-adọ ndụdọ ọzọ banyere ihe a onye ọbụla na-ahụ?

Ị ga-adọ ndụdọ ọzọ banyere ihe a onye ọbụla na-ahụ?

Will you argue again over this thing that everybody can see?

Ọ dọrọ ndụdọ ọzọ taa oge ọ bịara.

Ọ dọrọ ndụdọ ọzọ taa oge ọ bịara.

He argued again today when he came.

Onye ga-adọ ndụdọ?

Onye ga-adọ ndụdọ?

Who will argue?

Okeke hụrụ ịdọ ndụdọ n'anya.

Okeke hụrụ ịdọ ndụdọ n'anya.

Okeke loves to argue.

Nkọwa okwu logo

Learning Igbo made easy, free, and accessible.

Join our mailing list

© 2026 Nkọwa okwu 501(c)(3). All rights reserved.