Nkọwa okwu logo
Beta

ékú

eku

Wordeku
Definitions

Noun

1.a large long handed spoon used to scoop from pots; ladle

Related Terms
Word Stems

Examples

Eku m agbajiela.

Eku m agbajiela.

My ladle has broken.

Ego zụtara eku ọhụrụ taa.

Ego zụtara eku ọhụrụ taa.

Ego bought a new ladle today.

Ana m achọ eku m ga-eji kpagharịa ofe m.

Ana m achọ eku m ga-eji kpagharịa ofe m.

I am looking for a ladle I will use in turning my soup.

Eku m dị iche na ndị ọzọ.

Eku m dị iche na ndị ọzọ.

My ladle is different from others.

Ọ na-aracha eku ma ọ na-esi ofe.

Ọ na-aracha eku ma ọ na-esi ofe.

She licks the ladle while cooking.

Ọ na-ere eku.

Ọ na-ere eku.

She sells ladle.

O ji eku kụwaa di ya isi.

O ji eku kụwaa di ya isi.

She broke her husbands head with ladle.

Eku m dị ise.

Eku m dị ise.

My ladles are five.

O nwere eku atọ.

O nwere eku atọ.

She has three ladles.

Nye m eku m.

Nye m eku m.

Give me my ladle.

ǫkpüìtè

ọ̀kpụìtè

Wordọ̀kpụìtè
Definitions

Noun

1.craftsman who makes pots, bowls and plates out of clay ; potter

Variationsọ̀kpụ ìtè
Related Term
Word Stem

Examples

Ọkpụite nyere m ite.

Ọkpụite nyere m ite.

The potter gave me a pot.

ìtè

ìtè

Wordìtè
Definitions

Noun

1.pot; a cylindrical container that holds things that are being cooked

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

Ada zụtara ite ọzọ.

Ada zụtara ite ọzọ.

Ada bought another pot.

A na-eji ite esi nri.

A na-eji ite esi nri.

Pots are used for cooking.

Enwere m obere ite atọ.

Enwere m obere ite atọ.

I have three small pots.

Agaghị m ejinwu obere ite a sie ofe ahụ.

Agaghị m ejinwu obere ite a sie ofe ahụ.

I can not use this small pot to cook that soup.

Ite ahụ ọ zụtara dị ọnụ.

Ite ahụ ọ zụtara dị ọnụ.

That pot she bought is expensive.

ùdù

ùdù

Wordùdù
Definitions

Noun

1.pot; clay pot; a one or two armed pot with a wide mouth, narrow neck and a big protruded spherical body mostly used for storing water

2.Igbo musical instrument, in the form of a clay pot, used to achieve a low end

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

Buru udu ahụ nke ọma.

Buru udu ahụ nke ọma.

Carry that clay pot well.

Udu m akụwala.

Udu m akụwala.

My clay pot has broken.

Udu anaghị ata nchara.

Udu anaghị ata nchara.

Clay pot doesn't rust.

Otiegwu, kụọrọ m udu.

Otiegwu, kụọrọ m udu.

Music player beat udu for me.

Udu bụ ngwa egwu.

Udu bụ ngwa egwu.

Udu is a musical instrument.

Ọ zụrụ udu ọhụrụ.

Ọ zụrụ udu ọhụrụ.

He bought a new clay pot.

kúghàchí

kughàchi

Wordkughàchi
Definitions

Active verb

1.carry back (especially babies);

2.scoop soup/meat back into another plate/pot

Related Terms
Word Stems

Examples

Amara kughachiri nwa ahụ n'akwa.

Amara kughachiri nwa ahụ n'akwa.

Amara carried the baby back to the bed.

Arinze kughachiri ofe ahụ n'ite.

Arinze kughachiri ofe ahụ n'ite.

Arinze scooped the soup back to the pot.

Ụmụ nwaanyị niile ahụ kughachiri ụmụ ha n'ụlọakwụkwọ.

Ụmụ nwaanyị niile ahụ kughachiri ụmụ ha n'ụlọakwụkwọ.

All the women returned their children to the school.

Ọ baghị uru ikughchi ya.

Ọ baghị uru ikughchi ya.

It is of no use returning the child.

Nne m ga-ekughachi osikapa ahụ.

Nne m ga-ekughachi osikapa ahụ.

My mother will scoop that rice back.

Naanị ha abụọ ga-ekughachi ụmụ ha.

Naanị ha abụọ ga-ekughachi ụmụ ha.

Only the two of them will return their children.

Achọrọ m ikughachi nnwa a.

Achọrọ m ikughachi nnwa a.

I want to carry this child back.

Nna m kughachiri nwa ahụ ozugbo.

Nna m kughachiri nwa ahụ ozugbo.

My father returned the child immediately.

Gwa m onye kughachiri ya.

Gwa m onye kughachiri ya.

Tell me the person who returned it.

Ibe na-ekughachi mmiri m.

Ibe na-ekughachi mmiri m.

Ibe is scooping my water back.

Ha kughachiri nnwa ahụ n'ụlụụka.

Ha kughachiri nnwa ahụ n'ụlụụka.

They carried that child back to the church.

Kughachi ofe ahụ n'ime ite.

Kughachi ofe ahụ n'ime ite.

Scoop that soup back into the pot.

áfö úkwú

afọ ukwu

Wordafọ ukwu
Definitions

Noun

袖大

1.big stomach, pot belly

Related Terms
Word Stems

Examples

Ọrịa ahụ mere ka o nwee afọ ukwu.

Ọrịa ahụ mere ka o nwee afọ ukwu.

That sickness made him to have big stomach.

Ọ bụ oke ịṅụ mmanya mere ka o nwee afọ ukwu.

Ọ bụ oke ịṅụ mmanya mere ka o nwee afọ ukwu.

It was too much consumption of wine that made him have pot belly.

O nwere ihe mere nkịta ji eso onye afọ ukwu.

O nwere ihe mere nkịta ji eso onye afọ ukwu.

There's a reason a dog follows someone with a big stomach.

Iri oke nri na-ebute inwe afọ ukwu.

Iri oke nri na-ebute inwe afọ ukwu.

Over feeding causes one to have big stomach.

Afọ ukwu ya na-ebenata.

Afọ ukwu ya na-ebenata.

His big stomach is reducing .

Emeka nwere afọ ukwu.

Emeka nwere afọ ukwu.

Emeka has pot belly.

Afọ ukwu bụ njirimara ndị ezinụlọ̣ ahụ.

Afọ ukwu bụ njirimara ndị ezinụlọ̣ ahụ.

Pot belly is the identity marker of that family.

Chike nwere afọ ukwu ka nna ya.

Chike nwere afọ ukwu ka nna ya.

Chike has pot belly like his father.

Nwoke afọ ukwu ahụ na-abịa taa.

Nwoke afọ ukwu ahụ na-abịa taa.

That pot bellied man is coming today.

Ndị afọ ukwu anaghị enwe mmasị ịgba ọsọ.

Ndị afọ ukwu anaghị enwe mmasị ịgba ọsọ.

Pot bellied people do not have interest in running.

Onye nwere afọ nnukwu?

Onye nwere afọ nnukwu?

Who has pot belly?

Ndị afọ nnukwu karịrị ebe a.

Ndị afọ nnukwu karịrị ebe a.

Potbellied people are so many here.

Nye ya onye afọ nnukwu ahụ.

Nye ya onye afọ nnukwu ahụ.

Give it to that pot bellied man.

ügbųgbà

ụgbụ̀gbà

Wordụgbụ̀gbà
Definitions

Noun

1.earthen cooking pot

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

Nne m nwere ụgbụgba atọ.

Nne m nwere ụgbụgba atọ.

My mother has three earthen pots.

Ofe ụgbụgba na-atọ ụtọ.

Ofe ụgbụgba na-atọ ụtọ.

Soup prepared in earthen pot is tasty.

Ụgbụgba ahụ dị inyị.

Ụgbụgba ahụ dị inyị.

That earthen pot is dirty.

Ọchịcha danyere n'ụgbụgba.

Ọchịcha danyere n'ụgbụgba.

Cockroach fell into the earthen pot.

Nne m ji ụgbụgba te ofe onugbu.

Nne m ji ụgbụgba te ofe onugbu.

My mother cooked bitter leaf soup in earthen pot.

Kedu ihe eji arụ ụgbụgba?

Kedu ihe eji arụ ụgbụgba?

What is used for moulding earten pot?

rötù

rọtù

Wordrọtù
Definitions

Active verb

1.lift down (e.g. pot from tripod)

Related Term
Word Stem

No word stems

Examples

Jiri nwayọ rọtuo ite ahụ.

Jiri nwayọ rọtuo ite ahụ.

Bring down the pot with caution.

Ọ bụ m rọturu ite si n'ọkụ.

Ọ bụ m rọturu ite si n'ọkụ.

It was I who pulled the pot from the fire.

Biko, rọtuo ite dị n'ọkụ.

Biko, rọtuo ite dị n'ọkụ.

Please, bring down the pot that is on fire.

Nne m ga-arọtụ ite a nwa obere oge ugbua.

Nne m ga-arọtụ ite a nwa obere oge ugbua.

My mother will bring down the pot in a short while now.

Ijeudo ji aka nkịtị rọtuo ite ahụ.

Ijeudo ji aka nkịtị rọtuo ite ahụ.

Ijeudo put down the pot from fire with bare hands.

Ha na-arọtu ite mgbe ọ dara.

Ha na-arọtu ite mgbe ọ dara.

There were bringing down the pot when it fell.

tígwò

tigwò

Wordtigwò
Definitions

Active verb

1.break into pieces (e.g. iron pot); demolish

2.break (e.g. plate)

Related Term
Word Stem

No word stems

Examples

Ndị akpụobi tigworo ụlọ ahụ.

Ndị akpụobi tigworo ụlọ ahụ.

The hoodlums demolished the house.

Di ya tigworo efere dum dị n'usekwu ya.

Di ya tigworo efere dum dị n'usekwu ya.

Her husband broke all the plates in her kitchen to pieces.

Isi ya tigworo na ya bụ ihe mberede.

Isi ya tigworo na ya bụ ihe mberede.

His head broke into pieces in the accident.

Moto ahụ tigworo etigwo.

Moto ahụ tigworo etigwo.

The car broke into pieces.

Ndị agboro na-etigwo ụgbọ ọbụla ji ha ụgwọ

Ndị agboro na-etigwo ụgbọ ọbụla ji ha ụgwọ

The touts demolish any car that owns them.

ųzàákï

ụ̀zàakị̄

Wordụ̀zàakị̄
Definitions

Noun

1.a legume which is often fried in a pot without oil and eaten with palm kernel

Related Term
Word Stem

Examples

Aga m azụtara gị ụzaakị.

Aga m azụtara gị ụzaakị.

I will buy uzaaki for you.

Ọ naghị amasị m iṭa ụzaakị.

Ọ naghị amasị m iṭa ụzaakị.

I don't like eating uzaaki.

Amaka na-ere ụzaakị.

Amaka na-ere ụzaakị.

Amaka sells uzaaki.

Nkọwa okwu logo

Learning Igbo made easy, free, and accessible.

Join our mailing list

© 2025 Nkọwa okwu 501(c)(3). All rights reserved.