Nkọwa okwu logo
Beta

ókwú

okwu

Wordokwu
Definitions

Noun

1.speech

2.affair; matter; dispute; quarrel

Related Terms
Word Stems

Examples

Okwu ya gbara ọkpụrụkpụ.

Okwu ya gbara ọkpụrụkpụ.

His speech was substantial.

Mụ na Mbaka enweghị okwu.

Mụ na Mbaka enweghị okwu.

I have no issues with Mbaka.

Enwere okwu m chọrọ Ka anyị kwuo.

Enwere okwu m chọrọ Ka anyị kwuo.

There is an issue I want us to discuss

Achọghị m ịnụ okwu ahụ ọzọ.

Achọghị m ịnụ okwu ahụ ọzọ.

I do not want to hear that matter again.

ḿkpürōókwú

mkpụrookwū

Wordmkpụrookwū
Definitions

Noun

1.a single, clearly meaningful, element of speech or writing; word

Variationsmkpụrụokwū
Related Terms
Word Stems

Examples

Ị sụpetaghị mkpụrookwu a.

Ị sụpetaghị mkpụrookwu a.

You did not spell this word right.

Were mkpụrookwu ndị ahụ mee ahịrịokwu.

Were mkpụrookwu ndị ahụ mee ahịrịokwu.

Use those words to make some sentences.

Aghọtachaghị mkpụrookwu ahụ.

Aghọtachaghị mkpụrookwu ahụ.

I do not really understand that word.

Dee mkpụrookwu anọ n'akwụkwọ gị.

Dee mkpụrookwu anọ n'akwụkwọ gị.

Write four words in your book.

ényì

enyì

Wordenyì
Definitions

Noun

1.someone whom one shares mutual affection with, except biological family; friend

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

Enyi m zụtaara m akpa ojii.

Enyi m zụtaara m akpa ojii.

My friend bought a black bag for me.

Enyi abụọ ndị a hụrụ onwe ha n'anya.

Enyi abụọ ndị a hụrụ onwe ha n'anya.

The two friends love each other.

Ha bụ enyi kemgbe ha dị na nwata.

Ha bụ enyi kemgbe ha dị na nwata.

They were friends since childhood.

Enyi gị bịara taata.

Enyi gị bịara taata.

Your friend came today.

Enyi onye ka ị bụ?

Enyi onye ka ị bụ?

Whose friend are you?

Enyi toro ogologo.

Enyi toro ogologo.

My friend is tall.

Onye bụ enyi gị?

Onye bụ enyi gị?

Who is your friend?

Agara m be enyi m.

Agara m be enyi m.

I want to my friend's house.

ìkpé

ìkpe

Wordìkpe
Definitions

Noun

1.judgement;

2.case

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

Ọkiikpe kpere ikpe ahụ nwere obi ọma.

Ọkiikpe kpere ikpe ahụ nwere obi ọma.

The judge that heard that judgement was kind hearted.

Chukwu ga-ekpe ikpe mụ na gị.

Chukwu ga-ekpe ikpe mụ na gị.

God will judge our case.

Aghọtaghị m ikpe ahụ.

Aghọtaghị m ikpe ahụ.

I do not understand that judgement.

Ikpe gị ziri ezi.

Ikpe gị ziri ezi.

Your judgement is fair.

Ikpe ha bụ na Emeka ga-eje nga.

Ikpe ha bụ na Emeka ga-eje nga.

Their judgement is that Emeka will be imprisoned.

Ikpe mara Ada.

Ikpe mara Ada.

Judgement is against Ada

Ha chọrọ ikpe ga-adabara ha.

Ha chọrọ ikpe ga-adabara ha.

They want a judgment that will be in their favour.

ükà

ụkà

Wordụkà
Definitions

Noun

1.speech; address, discourse; talk;

2.trouble

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

A sị m na anaghị abịa. Ọ bụ ụka dịrị gị?

A sị m na anaghị abịa. Ọ bụ ụka dịrị gị?

I said I won't come. Is it your trouble?

Biko, na emume a anyị na-akwado ime, anyị achọghị oke ụka.

Biko, na emume a anyị na-akwado ime, anyị achọghị oke ụka.

Please, in this programe we are preparing to do, we do not want too much talk.

Biko, weghachi uri anya ahụ. Achọghị m ụka Adanna.

Biko, weghachi uri anya ahụ. Achọghị m ụka Adanna.

Please, take back that eye pencil. I do not want Adanna's trouble.

Ụka ya dị mma.

Ụka ya dị mma.

His speech is okay.

Kedụ ihe e kwuru n'ụka taa?

Kedụ ihe e kwuru n'ụka taa?

What was said today's discussion?

Achọghị m ụka gị.

Achọghị m ụka gị.

I do not want you trouble.

Ike ụka adịghị m.

Ike ụka adịghị m.

I do not have the strength for too much talk.

íkó

iko

Wordiko
Definitions

Noun

1.concubine; someone dating another person who is in a marriage;

2.unwed romantic partner; girlfriend; boyfriend

Related Term
Word Stem

No word stems

Examples

Enwetere m iko ọhụrụ.

Enwetere m iko ọhụrụ.

I have a new concubine.

Nne ya bụ iko Mz. Okoro.

Nne ya bụ iko Mz. Okoro.

His mother is Mr. Okoro's concubine.

Onye bụ iko gị?

Onye bụ iko gị?

Who is your concubine?

Ọ chụpụrụ iko ya n'ụlọ

Ọ chụpụrụ iko ya n'ụlọ

He chased his concubine out of the house.

Akwụkwọ Nsọ akwadoghị mmadụ inwe iko.

Akwụkwọ Nsọ akwadoghị mmadụ inwe iko.

The Bible does not support concubinage.

Ndị iko ya abịala.

Ndị iko ya abịala.

His concubines have come.

O nweghị iko kemgbe ọ lụchara nwaanyị.

O nweghị iko kemgbe ọ lụchara nwaanyị.

He does have any concubine since he got married.

Nwunye ya wụrụ iko ya mmiri ọkụ.

Nwunye ya wụrụ iko ya mmiri ọkụ.

His wife poured hot water on his concubine.

Otu na ndị iko ya mụ̣rụ nwa.

Otu na ndị iko ya mụ̣rụ nwa.

One of his concubines put to bed.

álöbà

alọbà

Wordalọbà
Definitions

Noun

1.guy; a young male or female

Variationsalọba m
Related Term
Word Stem

No word stems

Examples

Abụghị m alọba gị.

Abụghị m alọba gị.

I am not your guy.

Onye ahụ abụghị alọba m.

Onye ahụ abụghị alọba m.

That person is not my guy.

E nwụdere alọba ya.

E nwụdere alọba ya.

His guy was cut.

Kpọọrọ m alọba a.

Kpọọrọ m alọba a.

Call my this guy.

Enwere m ọtụtụ alọba n'ụlọakwụkwọ.

Enwere m ọtụtụ alọba n'ụlọakwụkwọ.

I have many guys in school.

Emeka bụ alọba m.

Emeka bụ alọba m.

Emeka is my guy.

Alọba, kedụ nke na-eme?

Alọba, kedụ nke na-eme?

Guy, what's happening?

Nkọwa okwu logo

Learning Igbo made easy, free, and accessible.

Join our mailing list

© 2025 Nkọwa okwu 501(c)(3). All rights reserved.