Nkọwa okwu logo
Beta

nyádó

nyado

Wordnyado
Definitions

Active verb

1.paste in order to stabilize

Related Terms
Word Stems

Examples

Nyado akwụkwọ a n'azụ akwụkwọ gị.

Nyado akwụkwọ a n'azụ akwụkwọ gị.

Paste this paper at the back of your book.

Achọrọ m ịnyado akwụkwọ a n'aja.

Achọrọ m ịnyado akwụkwọ a n'aja.

I want to paste this paper on the wall.

Emeka na-anyado akwụkwọ n'aja oge m hụrụ ya.

Emeka na-anyado akwụkwọ n'aja oge m hụrụ ya.

Emeka was pasting a paper on the wall when I saw him.

Ọ bụ nne m nyadoro akwụkwọ a ebe a.

Ọ bụ nne m nyadoro akwụkwọ a ebe a.

It was my mother that pasted this paper here.

Nwata a na-anyado ihe n'ahụ aja oge ọbụla.

Nwata a na-anyado ihe n'ahụ aja oge ọbụla.

This child pastes things on the wall every time.

Onye ga-anyado akwụkwọ a n'aja?

Onye ga-anyado akwụkwọ a n'aja?

Who will paste this paper on the wall?

Ọ nyadoro akwụkwọ ahụ n'aja.

Ọ nyadoro akwụkwọ ahụ n'aja.

He pasted the paper on the wall.

Achọghị m ka ị nyado ihe ọbụla n'oche a.

Achọghị m ka ị nyado ihe ọbụla n'oche a.

I don't want you to paste anything on this chair.

Ọ ka mma ịnyado ya n'elu.

Ọ ka mma ịnyado ya n'elu.

It is better to paste it on top.

Kedụ onye nyadoro foto m ebe a?

Kedụ onye nyadoro foto m ebe a?

Who pasted my picture here?

Ana m anyado akwụkwọ.

Ana m anyado akwụkwọ.

I am gumming a book./ I am pasting.

nyá

nya

Wordnya
Definitions

Active verb

1.stick; glue

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

A ga-anya akwụkwọ a n'ahụ aja.

A ga-anya akwụkwọ a n'ahụ aja.

This paper will be glued to the wall.

Ha na-anya akwụkwọ mgbasa ozi n'ahụ aja.

Ha na-anya akwụkwọ mgbasa ozi n'ahụ aja.

They are gluing posters on the wall.

A ga-anya ya eso.

A ga-anya ya eso.

It will be glued.

Nyaa akwụkwọ ahụ n'ebe a.

Nyaa akwụkwọ ahụ n'ebe a.

Glue that book here.

Ọ na-anyado anyado.

Ọ na-anyado anyado.

It sticks.

Nyaa ya nke ọma.

Nyaa ya nke ọma.

Glue it properly.

Ọ na-anya ihe ọbụla masịrị ya n'oche a.

Ọ na-anya ihe ọbụla masịrị ya n'oche a.

He glues whatever he likes on this chair.

Ọ nyadoro ya ozugbo

Ọ nyadoro ya ozugbo

She glued it immediately.

mákö

makọ

Wordmakọ
Definitions

Active verb

1.stick or paste together

2.correspond; match or rhyme; coincide

Related Term
Word Stem

No word stems

Examples

Makọọ eserese abụọ a ọnụ.

Makọọ eserese abụọ a ọnụ.

Paste these two diagrams together.

Ihe ọ na-ekwu na ihe a ga-ede ga-amakọ.

Ihe ọ na-ekwu na ihe a ga-ede ga-amakọ.

What she is saying and what is being written will correspond.

Makọọ ha ọnụ.

Makọọ ha ọnụ.

Stick them together.

Ịmakọ ego ahụ adịghị mma.

Ịmakọ ego ahụ adịghị mma.

It is not proper to sticking the money together.

ḿmákö

mmakọ̄

Wordmmakọ̄
Definitions

Noun

1.cuddly; gumming to each other; something gluing to another; gummy

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

Osikapa nwunye gị siri na-eme mmakọ.

Osikapa nwunye gị siri na-eme mmakọ.

The rice your wife made cuddles to each other.

I siri nri mmakọ taa.

I siri nri mmakọ taa.

You cooked a cuddly food today.

Mmakọ ọ makọrọ adịghị mma.

Mmakọ ọ makọrọ adịghị mma.

Its gummy nature is not good.

Etu a nri a si eme mmakọ adịghị mma.

Etu a nri a si eme mmakọ adịghị mma.

The way this food cuddles is not good.

Nri na-eme mmakọ anaghị adị m mma.

Nri na-eme mmakọ anaghị adị m mma.

I don't like cuddly food.

Ọ na-amakọ amakọ.

Ọ na-amakọ amakọ.

It is gummy.

Ha nille na-amakọ amakọ.

Ha nille na-amakọ amakọ.

All of them are gummy.

Nkọwa okwu logo

Learning Igbo made easy, free, and accessible.

Join our mailing list

© 2025 Nkọwa okwu 501(c)(3). All rights reserved.