Nkọwa okwu logo
Beta

nwáńtïńtï

nwantịntị

Wordnwantịntị
Definitions

Noun

1.small or little amount, state, etc.

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

Onye m na-ekwu dị nwantịntị.

Onye m na-ekwu dị nwantịntị.

Who I am referring to is short.

Nwantịntị ihe ka m daa ebe a.

Nwantịntị ihe ka m daa ebe a.

Small thing I would have fallen here.

Nne m nyere m nwantịntị nri.

Nne m nyere m nwantịntị nri.

My mother served me little food.

Biko nye m nwantịntị oge.

Biko nye m nwantịntị oge.

Please give me a little time.

Ihe o kwuru dị nwantịntị.

Ihe o kwuru dị nwantịntị.

The things he said are too little.

Ọ rahụrụ nwantịntị ụra.

Ọ rahụrụ nwantịntị ụra.

He had a little amount of sleep.

ńtà

ntà

Wordntà
Definitions

Nominal Modifier

1.little; small

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

Anụ ahụ dịcha nta nta.

Anụ ahụ dịcha nta nta.

The meats are in small pieces.

Ehi ndị ukwu loro ndị nta.

Ehi ndị ukwu loro ndị nta.

The big cows swallowed the small ones.

Ndị dị nta nọrọ n'ihu.

Ndị dị nta nọrọ n'ihu.

The small ones should be in front.

Nwoke a anaghị eme ihe dị nta.

Nwoke a anaghị eme ihe dị nta.

This man does not do small things.

E nyere m nsogbu mgbe m dị nta.

E nyere m nsogbu mgbe m dị nta.

I was troublesome when I was little.

Oke nke ya dị nta.

Oke nke ya dị nta.

His own share is small.

Ọ fọdụrụ nwa mgbe nta ka o mesịa.

Ọ fọdụrụ nwa mgbe nta ka o mesịa.

It is remaining a little time for her to finish.

ńtàkïrï

ntàkịrị

Wordntàkịrị
Definitions

Nominal Modifier

1.little; small

Related Terms
Word Stems

Examples

Achọghị m ndị ntakịrị ahụ.

Achọghị m ndị ntakịrị ahụ.

I do not want those small ones

Enyi nwere ntakịrị anya.

Enyi nwere ntakịrị anya.

Eelephant has small eyes.

Eriri m ntakịrị nri.

Eriri m ntakịrị nri.

I ate small food.

Ihe o nyere m dị ntakịrị.

Ihe o nyere m dị ntakịrị.

What she gave me was small.

Nke ntakịri ̣a bụ nke gị.

Nke ntakịri ̣a bụ nke gị.

This small one is your own.

Ntakịrị akpa ka o bu bịa.

Ntakịrị akpa ka o bu bịa.

Small bag is what he came with.

Ada kacha ha ntakịrị.

Ada kacha ha ntakịrị.

Ada is the smallest of them.

Adị m ntakịrị mgbe Ọbasanjọ chịrị Naijirịa.

Adị m ntakịrị mgbe Ọbasanjọ chịrị Naijirịa.

I was little when Obasanjo ruled Nigeria.

Rie nke ahụ dị ntakịrị.

Rie nke ahụ dị ntakịrị.

Eat that little one.

-tü

-tụ

Word-tụ
Definitions

Extensional suffix

1.attached to a verb to convey a little bit of the verb; a little bit

2.attached to a verb to convey politeness or a plead; please (permission); could; would

Related Term
Word Stem

No word stems

Examples

Welitụ ụkwụ gị ka m zaa ebe ahụ.

Welitụ ụkwụ gị ka m zaa ebe ahụ.

Please, raise your feet let me sweep that place.

Nyetụ m ka m taa.

Nyetụ m ka m taa.

Give me a little let me eat.

Obi kpọtụụrụ ya.

Obi kpọtụụrụ ya.

Obi called on him briefly.

Ị ga-azụtatụrụ m akwụkwọ n'ụlaahịa?

Ị ga-azụtatụrụ m akwụkwọ n'ụlaahịa?

Would you buy me a book at the store?

Biko ritụ nri tupu ị pụọ.

Biko ritụ nri tupu ị pụọ.

Please eat this food a bit before you leave.

Ka m kpatatụ ego tupu m zụọ ụgbaala.

Ka m kpatatụ ego tupu m zụọ ụgbaala.

Let me make money a little bit before buying a car.

Obinna na-emetụ isiike.

Obinna na-emetụ isiike.

Obinna is abit stubborn.

Chika sị na o retụ ahịa n'ụtụtụ.

Chika sị na o retụ ahịa n'ụtụtụ.

Chika said that she sold a bit in the morning.

Adakụ matụ mma.

Adakụ matụ mma.

Adaku is a bit beautiful.

Aga m agụtụ akwụkwọ ahụ tupu m enye gị ya.

Aga m agụtụ akwụkwọ ahụ tupu m enye gị ya.

I will read that book a bit before giving you.

Nye ya mmanya ahụ ka ọ ṅụtụ.

Nye ya mmanya ahụ ka ọ ṅụtụ.

Give him that wine to drink a a bit.

O nyetụ m achịcha ya.

O nyetụ m achịcha ya.

He gave me a bit of his bread.

Ị ga-enyetụ m ego ahụ m nara gị.

Ị ga-enyetụ m ego ahụ m nara gị.

Would you give me that money I asked of you?

Nwoke ahụ na-ahụtụ ụzọ n'abalị.

Nwoke ahụ na-ahụtụ ụzọ n'abalị.

That man sees a bit at night.

Nkọwa okwu logo

Learning Igbo made easy, free, and accessible.

Join our mailing list

© 2025 Nkọwa okwu 501(c)(3). All rights reserved.