árü
arụ̄
Word | arụ̄ |
Definitions | Noun 1.an act that is forbidden in a particular culture or law; an abomination; taboo; hurtful, obnoxious thing |
Related Terms | |
Word Stems |
Examples
A chụpụrụ ya maka arụ o mere.
A chụpụrụ ya maka arụ o mere.
He was ostracized because of the abomination he committed.
Igbu eke bụ arụ n'obodo anyị.
Igbu eke bụ arụ n'obodo anyị.
Killing a python is an abomination in my town.
O mere arụ.
O mere arụ.
He committed abomination.
Ihe a mere n'obodo anyị taa bụ arụ̣.
Ihe a mere n'obodo anyị taa bụ arụ̣.
The incident that happened in our community today is an abomination.
Mmadụ ịlụ nwanne ya n'ala Igbo bụ arụ.
Mmadụ ịlụ nwanne ya n'ala Igbo bụ arụ.
For someone to marry his sibling in Igbo land is an abomination.
Ọ bụ arụ igbu mmadụ.
Ọ bụ arụ igbu mmadụ.
It is an abomination to kill.
Anyị achọghị arụ n'ala anyị.
Anyị achọghị arụ n'ala anyị.
We do not want an abomination in our land.
Ịnyụ arụ ebe mmadụ nọ adghị mma.
Ịnyụ arụ ebe mmadụ nọ adghị mma.
To fart in the presence of people is not good.
A na-achụpụ ndị mere arụ n'obodo.
A na-achụpụ ndị mere arụ n'obodo.
Those that committed a taboo are banished from the town.
Ihe nke a bụ arụ!
Ihe nke a bụ arụ!
This is an abomination!
Kedu arụ ị mere?
Kedu arụ ị mere?
Which taboo did you commit?
Mmadu ̣ịnụ nwanne ya bụ arụ n'obodo m.
Mmadu ̣ịnụ nwanne ya bụ arụ n'obodo m.
It is an abomination in my village for someone to marry his sibling.
Odogwu ga-eme arụ ọzọ ma ahapụ ya.
Odogwu ga-eme arụ ọzọ ma ahapụ ya.
Odogwu will commit another abomination if he is released.
Onye mere arụ arụọla onwe ya.
Onye mere arụ arụọla onwe ya.
He that commits a taboo, has defiled himself.
Ezinụlọ ahụ na-ata ahụhụ maka arụ nna ha mee.
Ezinụlọ ahụ na-ata ahụhụ maka arụ nna ha mee.
That family is suffering because of the abomination their father committed.
Nna ya mere arụ.
Nna ya mere arụ.
His father committed an abomination.