Nkọwa okwu logo
Beta

ñòmì

ṅòmì

Wordṅòmì
Definitions

Active verb

1.emulate; imitate

Related Term
Word Stem

Examples

Buru n' uche na nwata ọbụla na-eṅomi agwa nne na nna ya.

Buru n' uche na nwata ọbụla na-eṅomi agwa nne na nna ya.

Bear in mind that every child imitates the character of their parents.

Anyị na-eṅomi ndụ ndị mụrụ anyị.

Anyị na-eṅomi ndụ ndị mụrụ anyị.

We emulate the lives of our parents.

A chọ̇rọ̇ m iṅomi agwa nwoke ahụ.

A chọ̇rọ̇ m iṅomi agwa nwoke ahụ.

I want to emulate that man's life.

Ṅomie ndụ Jizọs.

Ṅomie ndụ Jizọs.

Emulate the life of Jesus

Nwaanyị a ga-eṅomi ihe a ị na-eme ma i zoghi ya ezo.

Nwaanyị a ga-eṅomi ihe a ị na-eme ma i zoghi ya ezo.

This lady will imitate what you are doing if you do not hide it.

O ṅomiri etu o si ekpe ekpere.

O ṅomiri etu o si ekpe ekpere.

He imitated how he prays.

Achọghị m mmadụ iṅomi m.

Achọghị m mmadụ iṅomi m.

I do not want people emulating me.

E ṅomiri m ihe onye nkuzi mere.

E ṅomiri m ihe onye nkuzi mere.

I imitated what the teacher did.

ńñòmí

nṅòmī

Wordnṅòmī
Definitions

Noun

1.emulation

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

Nṅomi bụ otu n'ime ụzọ dị iche iche nwata si amụta ihe.

Nṅomi bụ otu n'ime ụzọ dị iche iche nwata si amụta ihe.

Emulation is one of the different ways a child learns.

Ọ bụghị ebe aka ewu zọrọ ka ụkwụ ya na azọ

Ọ bụghị ebe aka ewu zọrọ ka ụkwụ ya na azọ

A walking goat's fore and hindlimbs do not step on the same spots

lómì

lomì

Wordlomì
Definitions

Active verb

1.swallow completely

Related Terms
Word Stems

Examples

Ọ na-elo nri.

Ọ na-elo nri.

He is swallowing food.

Ilo akpụ na-amasị ya.

Ilo akpụ na-amasị ya.

She like swallowing cassava fufu.

O lomiri ọgwụ ahụ.

O lomiri ọgwụ ahụ.

He swallowed the drug completely.

Agwo ahụ ga-elomi ewu a ọfụma.

Agwo ahụ ga-elomi ewu a ọfụma.

That snake will swallow the goat convenniently.

jè

Wordjè
Definitions

Active verb

1.mimic; copy an action or deed

Related Term
Word Stem

No word stems

Examples

Ha ga-eje etu anyị si ekwu okwu.

Ha ga-eje etu anyị si ekwu okwu.

They will mimic the way we speak.

Onye jere m?

Onye jere m?

Who mimicked me?

Ọ dịghị mma ije mmadụ.

Ọ dịghị mma ije mmadụ.

It is not proper to mimic somebody.

I jee m, eti m gị ihe.

I jee m, eti m gị ihe.

If you mimic me, I will beat you.

Ọ na-eje m.

Ọ na-eje m.

She is mimicking me.

Nkọwa okwu logo

Learning Igbo made easy, free, and accessible.

Join our mailing list

© 2025 Nkọwa okwu 501(c)(3). All rights reserved.