Nkọwa okwu logo
Beta

ǹkïtï

ǹkịtị

Wordǹkịtị
Definitions

Nominal Modifier

1.nothing; vain; idle; ordinary

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

Mgbe anyị ruru n'ụlọ ya, o nyeghịdị anyị mmiri nkịtị ka anyị ṅụọ.

Mgbe anyị ruru n'ụlọ ya, o nyeghịdị anyị mmiri nkịtị ka anyị ṅụọ.

When we got to his house, he did not even give us ordinary water to drink.

Ihe niile ị na-eme bụ na nkịtị.

Ihe niile ị na-eme bụ na nkịtị.

All the things you are doing is in vain.

Ọ dịghị mma ịnọ nkịtị.

Ọ dịghị mma ịnọ nkịtị.

It is not good to be idle.

Ọ bu sọọsọ onye umengwụ na-anọ nkịtị.

Ọ bu sọọsọ onye umengwụ na-anọ nkịtị.

It is only a lazy man that stays idle.

Iko ahụ tọgbọ nkịtị.

Iko ahụ tọgbọ nkịtị.

The cup is laying empty.

O kwenyere na ọ bụghị ihe nkịtị iso ụzọ Chineke.

O kwenyere na ọ bụghị ihe nkịtị iso ụzọ Chineke.

He believes that it is not vain to follow God's way.

ńkïtį

nkịtị̀

Wordnkịtị̀
Definitions

Noun

1.silence; hush; quietude; ignore

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

Ha ga-agbakwa gị nkịtị.

Ha ga-agbakwa gị nkịtị.

They will ignore you.

Amaghị m ihe mere o ji gba nkịtị.

Amaghị m ihe mere o ji gba nkịtị.

I don't know why he kept quiet.

Gba ya nkịtị, ọ na-egwu egwu.

Gba ya nkịtị, ọ na-egwu egwu.

Ignore him, he is joking.

Agbakwala nkịtị ma i ruo ebe ahụ.

Agbakwala nkịtị ma i ruo ebe ahụ.

Do not keep quiet when you get there.

Ịgba nkịtị na-adị mma oge ụfọdụ.

Ịgba nkịtị na-adị mma oge ụfọdụ.

Sometimes, it is better to keep quiet.

M jụọ gị ajụjụ i wee gba m nkịtị, amachie m gị ntị.

M jụọ gị ajụjụ i wee gba m nkịtị, amachie m gị ntị.

If I ask you any question and you keep quite, I'll slap you.

Ọ na-amasị ya ịgba mmadụ nkịtị.

Ọ na-amasị ya ịgba mmadụ nkịtị.

He likes ignoring people.

Ị gba ya nkịtị, o megbuo gị.

Ị gba ya nkịtị, o megbuo gị.

If you keep quite, he'll cheat you.

ǹkïtï

ǹkịtị

Wordǹkịtị
Definitions

Noun

1.nothingness; naught; zero; in vain

Related Term
Word Stem

No word stems

Examples

Akwụkwọ ọ gụrụ bụ na nkịtị.

Akwụkwọ ọ gụrụ bụ na nkịtị.

The book she read was in vain.

Akara ekwentị m gwụrụ na nkịtị, asaa, nkịtị.

Akara ekwentị m gwụrụ na nkịtị, asaa, nkịtị.

My phone number ended in zero seven zero.

Ihe o mere bụ na nkịtị.

Ihe o mere bụ na nkịtị.

What he has done is in vain.

Arịrịọ niile ọ rịọrịọ bụ na nkịtị.

Arịrịọ niile ọ rịọrịọ bụ na nkịtị.

All her pleading was in vain.

éfù

efù

Wordefù
Definitions

Nominal Modifier

1.ordinary; mere

2.vain; useless; meaningless; for nothing; waste

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

Ife aka efu ga-akpalite mgbaama.

Ife aka efu ga-akpalite mgbaama.

A mere wave of the hand will trigger the alarm.

Ekwela ka ndọlị gị niile bụrụ n'efu.

Ekwela ka ndọlị gị niile bụrụ n'efu.

Don't let all your struggle to be in vain.

Mgbali Emeka izọ ndụ nwunye ya abụrụla n'efu.

Mgbali Emeka izọ ndụ nwunye ya abụrụla n'efu.

All Emeka's efforts to save his wife's life are in vain.

Uwa bu ihe efu.

Uwa bu ihe efu.

The world is nothing.

Onye nzuzu na-ekpe ekpere n'efu.

Onye nzuzu na-ekpe ekpere n'efu.

A fool prays in vain.

íyì

iyì

Wordiyì
Definitions

Noun

寃顕

1.damage caused by an act or neglect; waste; vain

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

Akụ nke ụwa a bụ iyi.

Akụ nke ụwa a bụ iyi.

Worldly treasures are waste.

Ọ lara akụnụụba nna ya n'iyi.

Ọ lara akụnụụba nna ya n'iyi.

He wasted his father's wealth.

Nwata ahụ lara n'iyi.

Nwata ahụ lara n'iyi.

The child is a good for nothing.

Mbọ niile ọ gbara lara n'iyi.

Mbọ niile ọ gbara lara n'iyi.

All his efforts were in vain.

Nwata a bụ nnwa ila n'iyi.

Nwata a bụ nnwa ila n'iyi.

This child is a child of destruction.

éfù

efù

Wordefù
Definitions

Noun

1.zero; naught; nothing

Related Terms
Word Stems

Examples

Mkpụrụ ọnụọgụgụ na-emejupụta otu narị bụ otu, efu, na efu ọzọ.

Mkpụrụ ọnụọgụgụ na-emejupụta otu narị bụ otu, efu, na efu ọzọ.

The numbers that make up one hundred are one, zero, and another zero.

Ụwa bụ ihe efu.

Ụwa bụ ihe efu.

The world is nothing.

Ọ gbara mbọ n'efu.

Ọ gbara mbọ n'efu.

He struggled for nothing.

chákōó

chakoo

Wordchakoo
Definitions

Nominal Modifier

1.empty

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

Kedụ ihe mere akpa gị jiri dị chakoo.

Kedụ ihe mere akpa gị jiri dị chakoo.

Why was your bag empty?

Ndi be Obi gbaghara ya nighi o dere leta mgbaghara

Ndi be Obi gbaghara ya nighi o dere leta mgbaghara

Obi's family forgave him because he wrote an apology letter

Ebe niile gbara chakoo.

Ebe niile gbara chakoo.

Everywhere is empty.

Dịka ị na-ahụ ya, ọ tọgbọ chakoo.

Dịka ị na-ahụ ya, ọ tọgbọ chakoo.

As you are seeing him, he is empty.

Ebe niile tọgbọ chakoo.

Ebe niile tọgbọ chakoo.

Everywhere is empty.

Ụzọ m si bịa ebe a dị chakoo.

Ụzọ m si bịa ebe a dị chakoo.

The road I took to this place was empty.

Okporo ụzọ na-adịkarị chakoo n'ụtụtụ.

Okporo ụzọ na-adịkarị chakoo n'ụtụtụ.

The road is usually empty in the morning.

Ite ahụ dị chakoo.

Ite ahụ dị chakoo.

The pot is empty.

Ụlọ niile tọgbọ chakoo.

Ụlọ niile tọgbọ chakoo.

The entire house is empty.

ǫkpörö

ọ̀kpọrọ

Wordọ̀kpọrọ
Definitions

Adverb

1.for nothing; in vain

Related Term
Word Stem

No word stems

Examples

Ihe niile i mere bụ n'ọkpọrọ.

Ihe niile i mere bụ n'ọkpọrọ.

Everything you did was in vain.

I chere na m na-ata ahụhụ n’ebe a ọkpọrọ?

I chere na m na-ata ahụhụ n’ebe a ọkpọrọ?

Do you think I am suffering here for nothing?

Ọ dọgburu onwe ya n'ọkpọrọ.

Ọ dọgburu onwe ya n'ọkpọrọ.

He suffered in vain.

Mbọ ọ gbara bụ n'ọkpọrọ.

Mbọ ọ gbara bụ n'ọkpọrọ.

He labored in vain.

Obi tara ahụhụ n'ọkpọrọ.

Obi tara ahụhụ n'ọkpọrọ.

Obi suffered for nothing.

Ụwa bụ ihe ọkpọrọ.

Ụwa bụ ihe ọkpọrọ.

Life is nothing.

Nkọwa okwu logo

Learning Igbo made easy, free, and accessible.

Join our mailing list

© 2025 Nkọwa okwu 501(c)(3). All rights reserved.