ájöísí
ajọ̄īsī
| Word | ajọ̄īsī |
| Definitions | Noun 寀誇簡 1.bad luck; misfortune; 2.ill luck |
| Variations | ajọ isi, ajọisi |
| Related Term | |
| Word Stem |
Examples
Ajọisi na-agbawa obi.
Ajọisi na-agbawa obi.
Misfortune is heartbroken.
Ndị ezinụlọ a na-enwekarị ajọisi.
Ndị ezinụlọ a na-enwekarị ajọisi.
This family is always having misfortune.
O nweghị onye chọrọ ajọisi na ndụ ya.
O nweghị onye chọrọ ajọisi na ndụ ya.
Nobody wants misfortune in his life.
O nwere ajọisi n'alụmdi ya.
O nwere ajọisi n'alụmdi ya.
She had misfortune in her marriage.
Ajọisi mere ka azụmahịa ya daa.
Ajọisi mere ka azụmahịa ya daa.
His business failed because of badluck.
Ụdị ajọisi o zutere na nsonso a gwụrụ ya ike.
Ụdị ajọisi o zutere na nsonso a gwụrụ ya ike.
The kind of misfortune he experienced lately weakened him.
Ọ chọghị mmekọ ọbụla ga-ebutere ya ajọisị
Ọ chọghị mmekọ ọbụla ga-ebutere ya ajọisị
He does not want any relationship that will bring him badluck
Ọ na-ekpesi ekpere ike ka ajọisi ghara ịdakwasị ya
Ọ na-ekpesi ekpere ike ka ajọisi ghara ịdakwasị ya
He prays fervently so that misfortune will not befall her.
ísíöjöö
isiọjọọ̄
| Word | isiọjọọ̄ |
| Definitions | Noun 簡寊誇 1.bad luck; misfortune; unfortunate condition; hard luck |
| Variations | isi ọjọọ |
| Related Term | |
| Word Stem |
Examples
Enwetụbeghị m ụdịrị isiọjọọ a mbụ.
Enwetụbeghị m ụdịrị isiọjọọ a mbụ.
I have never had this type of misfortune before.
O nwere isiọjọọ na njem azụmaahịa ya.
O nwere isiọjọọ na njem azụmaahịa ya.
He had bad luck on his business trip.
Ọ dịghị mma inwe isiọjọọ.
Ọ dịghị mma inwe isiọjọọ.
It is not good to have bad luck.
Onye nwere isiọjọọ?
Onye nwere isiọjọọ?
Who had bad luck?
Ha nwere isiọjọọ.
Ha nwere isiọjọọ.
They have bad luck.
Ọnwụ nne ya buteere ya isiọjọọ.
Ọnwụ nne ya buteere ya isiọjọọ.
His mother's death brought him bad luck.
Ọtụtụ ndị nwere isiọjọọ ụnyaahụ.
Ọtụtụ ndị nwere isiọjọọ ụnyaahụ.
Many people had bad luck yesterday.
Ezeja bu isiọjọọ akpagharị.
Ezeja bu isiọjọọ akpagharị.
Ezeja is moving about with hard luck.
òsòchíègbú
òsòchiègbu
| Word | òsòchiègbu |
| Definitions | Noun 1.an agent of misfortune, especially a person; nemesis 2.an accomplice |
| Related Terms | No related terms |
| Word Stems | No word stems |
Examples
Onye ahụ bụ osochiegbu ya.
Onye ahụ bụ osochiegbu ya.
That person was his nemesis.
Kpọpụta ndị osochiegbu gị niile.
Kpọpụta ndị osochiegbu gị niile.
Bring out all your accomplices.
ákwá àrįrį
akwa àrị̀rị̀
| Word | akwa àrị̀rị̀ |
| Definitions | Noun 1.weeping over personal tragedy or misfortune, e.g. death of one’s dear one; unnatural misfortune, e.g. thrashing by one’s child or lover |
| Related Terms | |
| Word Stems |
Examples
O nweghị onye chọrọ ibe akwa arịrị.
O nweghị onye chọrọ ibe akwa arịrị.
Nobody wants to weep.
Akwa arịrị m metụrụ ya n'obi.
Akwa arịrị m metụrụ ya n'obi.
My weeping touched him.
I ga-ebe akwa arịrị ma i hụ ihe mberede ahụ.
I ga-ebe akwa arịrị ma i hụ ihe mberede ahụ.
You will weep heavily if you see the accident.
Ọ ga-ebe akwa arịrị ma ọ daa n'ule a.
Ọ ga-ebe akwa arịrị ma ọ daa n'ule a.
She will weep bitterly if she fails this exam.
Amaka na-ebe akwa arịrị n'ihi ọnwụ nne ya.
Amaka na-ebe akwa arịrị n'ihi ọnwụ nne ya.
Amaka is weeping due to her mother's demise.
Akwa arịrị na-enye mmadụ ọrịa.
Akwa arịrị na-enye mmadụ ọrịa.
Heavy weeping makes a person sick.
Biko, kwụsi ibe akwa arịrị.
Biko, kwụsi ibe akwa arịrị.
Please stop weeping for your misfortune.
kwü ügwö
kwụ ụgwọ
| Word | kwụ ụgwọ |
| Definitions | Active verb 禅刊 1.compensate; recompense; do or give something as a make up for discomfort or misfortune caused 2.pay a fee or debt |
| Related Terms | |
| Word Stems |
Examples
Bịa ka m kwụọ ụgwọ nri m zụrụ.
Bịa ka m kwụọ ụgwọ nri m zụrụ.
Come, let me pay for the food I bought.
Chike na-akwụ ụgwọ ya mgbe m hụrụ.
Chike na-akwụ ụgwọ ya mgbe m hụrụ.
Chike was paying his debt when I saw him.
Ọ kwụrụ ụgwọ agwa ọjọọ niile ọ kpakọrọ.
Ọ kwụrụ ụgwọ agwa ọjọọ niile ọ kpakọrọ.
He recompensed for all the bad behaviors he exhibited.
Gọọmentị na-akwụ ụgwọ ụlọ ụfọdụ ha na-akụda.
Gọọmentị na-akwụ ụgwọ ụlọ ụfọdụ ha na-akụda.
Government compensates for some of the houses they demolish.
Di m ga-akwụ ụgwọ ụgbọala a.
Di m ga-akwụ ụgwọ ụgbọala a.
My husband will pay for this car.
Onye ga-akwụ ụgwọ ihe i mebiri?
Onye ga-akwụ ụgwọ ihe i mebiri?
Who will pay for what you damaged?