Nkọwa okwu logo
Beta

méchú

mechu

Wordmechu
Definitions

Active verb

1.make dirty; soil

Related Term
Word Stem

Examples

O mechuru akwa m.

O mechuru akwa m.

She soiled my cloth.

métǫ

metọ̀

Wordmetọ̀
Definitions

Active verb

1.spoil; defile; soil; make dirty

Related Terms
Word Stems

Examples

I na-emetọ ụgbọala m oge ọbụla ị nyara ya.

I na-emetọ ụgbọala m oge ọbụla ị nyara ya.

You dirty my car anytime you drove it.

Gịnị mere iji metọọ ihe a?

Gịnị mere iji metọọ ihe a?

Why did you spoil this thing?

mébö

mebọ

Wordmebọ
Definitions

Active verb

1.embarrass

Related Terms
Word Stems

Examples

Agwa ahụ ọ kpara mebọrọ m.

Agwa ahụ ọ kpara mebọrọ m.

The behaviour he exhibited embarassed me.

Mmebọ ọ mebọrọ m adịghị m mma n'obi.

Mmebọ ọ mebọrọ m adịghị m mma n'obi.

I am not happy with the embarrassment he gave me.

Ọ na-emebọ m ihu oge ọbụla anyị pụrụ apụ.

Ọ na-emebọ m ihu oge ọbụla anyị pụrụ apụ.

He embarrasses me every time we go out.

Ọ na-amasị ya imebọ mmadụ.

Ọ na-amasị ya imebọ mmadụ.

He likes embarrassing somebody.

Ha ga-emebọ unu.

Ha ga-emebọ unu.

They will embarrass you.

Onye mebọrọ gị?

Onye mebọrọ gị?

Who embarrassed you?

ḿmétǫ

mmetọ̀

Wordmmetọ̀
Definitions

Noun

1.defilement; dishonour; disgrace

Related Terms
Word Stems

Examples

Ọ bụ onye mmetọ.

Ọ bụ onye mmetọ.

He is a messy person./ He is a disgraceful person.

Mmetọ ndị a karịri akarị.

Mmetọ ndị a karịri akarị.

Their defilements are too much.

Achọghị m mmetọ ọbụla.

Achọghị m mmetọ ọbụla.

I do not want anything to be messed up./ I do not want any disgraceful act.

Mmetọ nwa ọgaranya ka ogbugbu ya mma.

Mmetọ nwa ọgaranya ka ogbugbu ya mma.

Killing one is better than disgracing him.

Mmetọ ya ahụ wutere m.

Mmetọ ya ahụ wutere m.

That his disgrace got me.

Ọ bụghị mmadụ niile na-anabata ụdị mmetọ ahụ.

Ọ bụghị mmadụ niile na-anabata ụdị mmetọ ahụ.

Not everyone accepts such disnonour.

E nwere ndị a ga-agwa okwu mmetọ taa.

E nwere ndị a ga-agwa okwu mmetọ taa.

Some people will be spoken to disgracefully today.

rú únyí

ru unyi

Wordru unyi
Definitions

Active verb

達密詳

1.be dirty;

2.be untidy, unkempt, messy

Related Terms
Word Stems

Examples

Ezi anyị ruru unyi n'ụtụtụ a maka mmemme anyị mere ụnyaahụ.

Ezi anyị ruru unyi n'ụtụtụ a maka mmemme anyị mere ụnyaahụ.

Our compound is dirty this morning due to the party we had yesterday.

Chịnye m ndị ruru unyi.

Chịnye m ndị ruru unyi.

Give me the dirty ones.

Akwụkwọ ya na-eru unyi oge niile.

Akwụkwọ ya na-eru unyi oge niile.

His book is always dirty

Ụgbaala gị ga-eru unyi ma ị gbaa ụzọ ahụ.

Ụgbaala gị ga-eru unyi ma ị gbaa ụzọ ahụ.

Your car will become dirty if you take that road.

Lee anya, akwa a ruo unyi, m pịa gị ụtarị.

Lee anya, akwa a ruo unyi, m pịa gị ụtarị.

Look, if this cloth gets dirty, I will flog you.

Onye nwe ụgbaala a ruru unyi?

Onye nwe ụgbaala a ruru unyi?

Who owns this dirty car?

Ọ na-ebi ndụ ruru unyi.

Ọ na-ebi ndụ ruru unyi.

She lives a dirty life.

Ezeugwu wepụrụ ndị ruru unyi.

Ezeugwu wepụrụ ndị ruru unyi.

Ezeugwu removed the dirty ones.

Ị chọrọ iru akwa m unyi?

Ị chọrọ iru akwa m unyi?

Do you want to make my cloth dirty?

Onye ka uwe ya ruru unyi?

Onye ka uwe ya ruru unyi?

Whose dress is dirty?

Nkọwa okwu logo

Learning Igbo made easy, free, and accessible.

Join our mailing list

© 2026 Nkọwa okwu 501(c)(3). All rights reserved.