má ḿmá
ma mmā
Word | ma mmā |
Definitions | Active verb 1.be good looking; be handsome; be beautiful; be good |
Related Term | |
Word Stem |
Examples
Taata ga-ama mma.
Taata ga-ama mma.
Today will be beautiful.
Ọ mara mma mgbe ọ bụ nwatakịrị.
Ọ mara mma mgbe ọ bụ nwatakịrị.
He was handsome when he was a child.
Onye ọbụla chọrọ ịma mma.
Onye ọbụla chọrọ ịma mma.
Everybody wants to be good looking.
Ụlọ gị mara mma.
Ụlọ gị mara mma.
Your house is beautiful.
má ḿmà
ma mmà
Word | ma mmà |
Definitions | Active verb 1.pierce, strike with sword, matchet; to throw a knife; stab 2.pierce or strike with a sword or hatchet; stab |
Related Term | |
Word Stem |
Examples
Ndị ọchị ehi ọjọọ na-eji ịma mma egbu mmadụ̣.
Ndị ọchị ehi ọjọọ na-eji ịma mma egbu mmadụ̣.
The bad herdsmen kill people by stabbing.
Ọ nwụrụ ozigbo a mara ya mma.
Ọ nwụrụ ozigbo a mara ya mma.
He dịed immediately he was stabbed.
Ọ mara ya mma n'afọ.
Ọ mara ya mma n'afọ.
He stabbed her on the stomach.
Ịma mma abụghi ihe e ji egwu egwu.
Ịma mma abụghi ihe e ji egwu egwu.
Throwing knife is a not a game.
Nwoke onye ara ahụ ga-amakwa gị mma ma ị garuo ya nso.
Nwoke onye ara ahụ ga-amakwa gị mma ma ị garuo ya nso.
That madman will stab you if you get close to him.
Ọ bụghị Emeka mara ya mma.
Ọ bụghị Emeka mara ya mma.
It was not Emeka who stabbed him.