lébàrà ányá
lebàrà anya
| Word | lebàrà anya |
| Definitions | Active verb 浪貝鮮目 1.review; look into; assess something in order to make a change if necessary; double-check something; to deliberate on something 2.supervise; keep eyes on something being done to make sure nothing goes wrong |
| Related Terms | |
| Word Stems |
Examples
Anyị lebara anya n'ihe ahụ.
Anyị lebara anya n'ihe ahụ.
We looked into that.
O kwesịrị Ka e lebara okwu nwata a anya.
O kwesịrị Ka e lebara okwu nwata a anya.
It is important to assess this child's speech.
Taa, anyị ga-eleba anya n'akwụkwọ ụtọasụsụ Igbo.
Taa, anyị ga-eleba anya n'akwụkwọ ụtọasụsụ Igbo.
Today, we are going to look into Igbo grammar book.
E nweghị onye na-elebara ihe ha na-eme anya.
E nweghị onye na-elebara ihe ha na-eme anya.
No one supervises what they are doing.
Ka anyị lebara ihoomume gị anya.
Ka anyị lebara ihoomume gị anya.
Let's review your homework exercise.
Aga m elebara ya anya.
Aga m elebara ya anya.
I will look into it.
tülé
tụle
| Word | tụle |
| Definitions | Active verb 1.examine; consider; compare 2.look into |
| Variations | tule |
| Related Terms | |
| Word Stems |
Examples
Tụlee ihe nwoke a na-agwa gị.
Tụlee ihe nwoke a na-agwa gị.
Consider what that man is telling you.
Tụleere m ihe a.
Tụleere m ihe a.
Examine this thing for me.
I tulee ya, ị hụ na ọ dara ada.
I tulee ya, ị hụ na ọ dara ada.
If you consider it, you find that he failed.
Ọ na-atụle ihe mere n'obi ya.
Ọ na-atụle ihe mere n'obi ya.
He is considering what happened in his mind.
lébà
lebà
| Word | lebà |
| Definitions | Active verb 浪貝 1.look into; 2.probe; study; scrutinize |
| Related Terms | |
| Word Stems |
Examples
Anyị lebara anya n'ihe omume onyenkụzi anyị nyere anyị.
Anyị lebara anya n'ihe omume onyenkụzi anyị nyere anyị.
We are looking into the assignment our teacher gave us.
Ka anyị lebaa anya na nsogbu a dakwasara anyị.
Ka anyị lebaa anya na nsogbu a dakwasara anyị.
Let us look into this problem that has befallen us.
Onye ga-eleba okwu a anya?
Onye ga-eleba okwu a anya?
Who will look into this case?
Ọ dị mma ileba ya anya.
Ọ dị mma ileba ya anya.
It is good to scrutinize it.
Kedụ mgbe anyị ga-eleba anya n'ikpe ahụ?
Kedụ mgbe anyị ga-eleba anya n'ikpe ahụ?
When are we going to look into that case?
Kedụ onye lebara anya n'akwụkwọ ajụjụ a?
Kedụ onye lebara anya n'akwụkwọ ajụjụ a?
Who vetted this question paper?
Gaa, lebaa ya anya.
Gaa, lebaa ya anya.
Go and scrutinize it.
lébà ányá
lebà anya
| Word | lebà anya |
| Definitions | Medial verb 1.look into; assess |
| Related Terms | |
| Word Stems |
Examples
Onyeisi anyị lebara anya n'ihe ahụ mere taata.
Onyeisi anyị lebara anya n'ihe ahụ mere taata.
Our head looked into that incident that occurred today
Kedụ ndị lebara okwu ahụ anya?
Kedụ ndị lebara okwu ahụ anya?
Which people looked into the matter?
Anyị achọghị ileba anya n'ihe ahụ.
Anyị achọghị ileba anya n'ihe ahụ.
We do not want to assess that thing.
Ha ga-eleba okwu ahụ anya.
Ha ga-eleba okwu ahụ anya.
They will look into that issue.
Gbaa mbọ lebaa okwu ahụ anya.
Gbaa mbọ lebaa okwu ahụ anya.
Try and look into that matter.
Ọ bụ Chike na-eleba anya n'ụdị okwu ahụ.
Ọ bụ Chike na-eleba anya n'ụdị okwu ahụ.
It is Chike that looks into such issues.
Ọ ga-adị mma ka e leba ya anya.
Ọ ga-adị mma ka e leba ya anya.
It will be proper to look into the matter.
Lebaa anya n'ihe nwata ahụ na-ekwu.
Lebaa anya n'ihe nwata ahụ na-ekwu.
Look into what that child is saying.
lérú ányá
leru anyā
| Word | leru anyā |
| Definitions | Active verb 1.Be watchful; be careful 2.Look into something e.g an issue; deliberate on |
| Related Terms | |
| Word Stems |
Examples
Ọ ga-adị mkpa ka anyị leruo okwu a anya ọzọ.
Ọ ga-adị mkpa ka anyị leruo okwu a anya ọzọ.
It will be important that we look into this matter again.
Anyị leruru okwu ahụ anya.
Anyị leruru okwu ahụ anya.
We deliberated on that issue.
Ụjọ atụla gị, anyị ga-eleru anya n'ihe kwuru.
Ụjọ atụla gị, anyị ga-eleru anya n'ihe kwuru.
Don't be afraid, we will look into what he said.
Ileru anya ebe a dịkwa oke mkpa.
Ileru anya ebe a dịkwa oke mkpa.
To be careful here is very important
Leruo anya!
Leruo anya!
Be careful.
Ọ ga-adị mkpa ka anyị leruo n'okwu a anya ọzọ.
Ọ ga-adị mkpa ka anyị leruo n'okwu a anya ọzọ.
It will be important for us to look into that issue again.
Kedụ ndị leruru ya anya?
Kedụ ndị leruru ya anya?
Which people investigated it?
Ileru anya n'ihe mere taa dịkwa oke mkpa.
Ileru anya n'ihe mere taa dịkwa oke mkpa.
To look into what happened today is very important.
Anyị ga-eleru anya n'okwu ahụ.
Anyị ga-eleru anya n'okwu ahụ.
We will look into that matter.
Leruo anya!
Leruo anya!
Be watchful
Ụmụnne m na-eleru anya n'okwu ala ahụ mgbe m bịara.
Ụmụnne m na-eleru anya n'okwu ala ahụ mgbe m bịara.
My siblings were deliberating on that land issue when I came.
Anyị leruru anya n'okwu ya ahụ.
Anyị leruru anya n'okwu ya ahụ.
We looked into that his matter.
Ụmụnne m na-eleru anya n'okwu ala ahụ mgbe m bịara.
Ụmụnne m na-eleru anya n'okwu ala ahụ mgbe m bịara.
My siblings were deliberating on that land issue when I came.
Nne ga-eleru ya anya etu o kwesịrị.
Nne ga-eleru ya anya etu o kwesịrị.
Mother will investigate it as it should.