Nkọwa okwu logo
Beta

kwò

kwò

Wordkwò
Definitions

Passive verb

1.for the sake; hold as a reason; because of;

2.move in a large number(especially noisily)

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

Achọrọ m ikwo maka ego ahụ gaa be Ada.

Achọrọ m ikwo maka ego ahụ gaa be Ada.

I want to go to Ada's house because of that money.

Ekwo m maka gị pụta ezi taa.

Ekwo m maka gị pụta ezi taa.

I came out for your sake today.

Ha kwo ekwo bịa.

Ha kwo ekwo bịa.

They came in a large number.

Kworo maka enyi gị bịa.

Kworo maka enyi gị bịa.

Come for the sake of your friend.

O kworo maka di ya nwụọ.

O kworo maka di ya nwụọ.

She died because of her husband.

Ị ga-ekwo maka ihe o mere gị ghara ige anyị ntị?

Ị ga-ekwo maka ihe o mere gị ghara ige anyị ntị?

Will you refuse to listen to us because of what he did to you?

Emeka na-ekwo maka nne ya aga Nnewi n'ụbọchị ụka ọbụla.

Emeka na-ekwo maka nne ya aga Nnewi n'ụbọchị ụka ọbụla.

Emeka goes to Nnewi every Sunday for the sake of his mother.

Agaghị m ekwo maka gị mee ihe njọ.

Agaghị m ekwo maka gị mee ihe njọ.

I will not commit sin because of you.

Ụmụakwụkwọ kworo banye n'ụlọ ahụ.

Ụmụakwụkwọ kworo banye n'ụlọ ahụ.

Students rush noisily into that house.

kwò

kwò

Wordkwò
Definitions

Active verb

1.roar(especially by a crowd); cheer

Related Term
Word Stem

No word stems

Examples

Ha ga-ekwo ma ị gbaa ụdị egwu ahụ.

Ha ga-ekwo ma ị gbaa ụdị egwu ahụ.

They will cheer if you dance that type of dance.

kwö

kwọ

Wordkwọ
Definitions

Active verb

1.grind; grate;

2.scoop (liquid) with the hand(s); splash (liquid) by scooping

3.wade; walk through a liquid, especially water

Passive verb

1.cup or scoop a liquid, especially with the hands

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

A na-eji akụrụngwa a akwọ ihe.

A na-eji akụrụngwa a akwọ ihe.

This gadget is used for grinding.

Ọ kwọrọ mmiri n'ahụ ya.

Ọ kwọrọ mmiri n'ahụ ya.

He splashed water on his body.

Onye kwọrọ egwusi a?

Onye kwọrọ egwusi a?

Who grinded this melon?

Ọ ga-akwọ ya echi?

Ọ ga-akwọ ya echi?

Will he grind it tomorrow?

Ọ na-akwọ ihe mgbe anyị bịara.

Ọ na-akwọ ihe mgbe anyị bịara.

He was grinding something when we came.

Ndụka na-akwọ ya ugbua.

Ndụka na-akwọ ya ugbua.

Ndụka is grinding it now.

Ọ kwọ mmiri, ọ chọrọ ife m, n'aka ya.

Ọ kwọ mmiri, ọ chọrọ ife m, n'aka ya.

He scooped water, he wants to sprinkle at me, in his hand.

Anyị na-akwọ ide.

Anyị na-akwọ ide.

We are wading through a flood.

Ị ga-akwọ mmiri?

Ị ga-akwọ mmiri?

Will you scoop water?

M na-akwọ mmiri a niile.

M na-akwọ mmiri a niile.

I wade through away all these rivers.

Bido ịkwọ mmiri a.

Bido ịkwọ mmiri a.

Start wading through this water.

Kwọọ mmiri a ugbua ohere dị.

Kwọọ mmiri a ugbua ohere dị.

Scoop this water now there is chance.

Ikenna kwọrọ ide ahụ n'ụtụtụ.

Ikenna kwọrọ ide ahụ n'ụtụtụ.

Ikenna waded through that flood away in the morning.

kwǫ

kwọ̀

Wordkwọ̀
Definitions

Active verb

1.piggy-back; piggyback; carry someone on the back or shoulders

2.drive; ride; carry or convey someone in a vehicle

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

Ọ bụghị oge niile ka m na-akwọ nwa.

Ọ bụghị oge niile ka m na-akwọ nwa.

It is not every time that I piggy-back a child.

Ọ bụ m kwọrọ ya tupu ọ rahụ ụra.

Ọ bụ m kwọrọ ya tupu ọ rahụ ụra.

I was the one who piggy-backed her before she slept.

Ada na-akwọ nnwa ya n'azụ oge ọ bụla.

Ada na-akwọ nnwa ya n'azụ oge ọ bụla.

Ada carries her child on the back every time.

Jiri nwayọ kwọrọ nnwa a.

Jiri nwayọ kwọrọ nnwa a.

Carry this child with ease.

Ịkwọ nne m aga ụka na-amasị m.

Ịkwọ nne m aga ụka na-amasị m.

To drive my mother to church pleases me.

Emeka kwọ m ugbua.

Emeka kwọ m ugbua.

Emeka is driving me now.

Onye ga-akwọ ya n'azụ apụọla.

Onye ga-akwọ ya n'azụ apụọla.

The person that will carry her on the back has left.

kwèré

kwère

Wordkwère
Definitions

Active verb

1.accept

Related Term
Word Stem

Examples

I kwere ịlụ ya?

I kwere ịlụ ya?

Did you accept to marry him?

Ana m ekwu, ọ na-ekwere.

Ana m ekwu, ọ na-ekwere.

As I was speaking he was agreeing.

Ị ga-ekwere na m tọrọ nwoke a?

Ị ga-ekwere na m tọrọ nwoke a?

Would you believe that I am older than this man.

Kwere Jesu Kristi ugbua.

Kwere Jesu Kristi ugbua.

Believe Jesus Christ now.

Ekwere m ekwe.

Ekwere m ekwe.

I agree.

Ekweere m n'ihe o kwuru.

Ekweere m n'ihe o kwuru.

I agreed to what he said.

Onye kwere, chi ya ekwere.

Onye kwere, chi ya ekwere.

If one agrees, his God will agree too.

Ekwekwala ihe ọ na-ekwu.

Ekwekwala ihe ọ na-ekwu.

Do not agree to what he is saying.

Onye sịrị gị kwere?

Onye sịrị gị kwere?

Who told you to agree?

I kwere, ị nwụọ.

I kwere, ị nwụọ.

If you accept, you die.

Asị m gị kwere na Chineke.

Asị m gị kwere na Chineke.

I told you to believe in God.

Ọ gwara m na ọ ga-ekwere ma o kwute banyere ya.

Ọ gwara m na ọ ga-ekwere ma o kwute banyere ya.

He told me that he will accept if she talks about it.

Ọtụtụ ndị ga-ekwere n'ihe o kwuru.

Ọtụtụ ndị ga-ekwere n'ihe o kwuru.

Many people will believe what he said.

Ọ ka mma ikwere n'ihe o kwuru.

Ọ ka mma ikwere n'ihe o kwuru.

It is better to agree to what he said.

Agaghị m ekwere.

Agaghị m ekwere.

I will not accept it.

síté

site

Wordsite
Definitions

Preposition

1.from; through, based on; judging from

Related Term
Word Stem

Examples

Site n'ihe anyị rụrụ taa, anyị ga-arụcha ọrụ a n'ọnwa a.

Site n'ihe anyị rụrụ taa, anyị ga-arụcha ọrụ a n'ọnwa a.

Based on what we worked today, we will finish this work this.

Site ebe karuo ya.

Site ebe karuo ya.

Draw it from here.

Site n'okwu gị, ị na-atụ asị.

Site n'okwu gị, ị na-atụ asị.

From your statement, you are lying.

Ọ bụ site n'omume ya ka anyị ji mara na o zuru ohi.

Ọ bụ site n'omume ya ka anyị ji mara na o zuru ohi.

We got to know that he stole from his behaviour.

O were iwe site n'ihe ọ gwara ya.

O were iwe site n'ihe ọ gwara ya.

He was angry based on what he told him.

Nkọwa okwu logo

Learning Igbo made easy, free, and accessible.

Join our mailing list

© 2025 Nkọwa okwu 501(c)(3). All rights reserved.