Nkọwa okwu logo
Beta

ükwüólógbá

ụkwụōlōgbā

Wordụkwụōlōgbā
Definitions

Noun

1.crooked, knock-kneed legs; "K-legs"

Variationsụkwụ ōlōgbā
Related Terms
Word Stems

Examples

Achọghị m ka nwa m nwee ụkwụologba.

Achọghị m ka nwa m nwee ụkwụologba.

I don't want my child to have knock-kneed legs.

Ije onye nwere ụkwụologba na-atọ m ọchị.

Ije onye nwere ụkwụologba na-atọ m ọchị.

The walking step of a person with knock-kneed legs amuse me.

N'agbanyeghị ụkwụologba ya, ọ ka mara mma.

N'agbanyeghị ụkwụologba ya, ọ ka mara mma.

Despite having a knock-kneed legs, he is still handsome.

Ndị ezinụlọ ha nwere ụkwụologba.

Ndị ezinụlọ ha nwere ụkwụologba.

Their family have crooked leg.

küpù

kụpù

Wordkụpù
Definitions

Active verb

1.knock off

Related Term
Word Stem

Examples

Achọghị m ịkụpụ ya.

Achọghị m ịkụpụ ya.

I do not want to knock it off.

Ọ nà-akụpụ̀ ya aja.

Ọ nà-akụpụ̀ ya aja.

He is knocking off sand from it

Kụpuo ya!

Kụpuo ya!

Knock it off!

Emeka ga-akụpù ya eze

Emeka ga-akụpù ya eze

Emeka will knock off his teeth

Ọ kụpụ̀rụ̀ ihu ya.

Ọ kụpụ̀rụ̀ ihu ya.

She knocked it face off.

kwátù

kwatù

Wordkwatù
Definitions

Active verb

1.knock down; push down

Related Terms
Word Stems

Examples

Agaghị akwatu gị.

Agaghị akwatu gị.

I will not knock you down.

Lee nwa ahụ na-akwatu ihe mmadụ.

Lee nwa ahụ na-akwatu ihe mmadụ.

See that child that knocks down people's things.

Ideke kwaturu mmiri ahụ.

Ideke kwaturu mmiri ahụ.

Ideke pushed down that water.

M na-akwatu akwa ndị a.

M na-akwatu akwa ndị a.

I am pushing down these cloths.

Ọ ga-akwatu gị ma ị nọchie ya.

Ọ ga-akwatu gị ma ị nọchie ya.

He will knock you down if you block him.

Were nwayọ na-akwatu ya.

Were nwayọ na-akwatu ya.

Take it easy while knocking it down.

Ụgbọala ịkwatu dimkpa n'ala adịghị egbu oge.

Ụgbọala ịkwatu dimkpa n'ala adịghị egbu oge.

For a vehicle to knock down an adult doesn't take time.

Kwatuo ya n'ala.

Kwatuo ya n'ala.

Push it down.

Ahụrụ m ka ha na-akwatu ụlọ ahụ.

Ahụrụ m ka ha na-akwatu ụlọ ahụ.

I saw them knocking down that house.

Onye kwaturu ihe a?

Onye kwaturu ihe a?

Who knocked down this thing?

Gịnị mere ị ji akwatu ihe ahụ?

Gịnị mere ị ji akwatu ihe ahụ?

Why are you knocking down that thing?

Ị chọ ịkwatu ya?

Ị chọ ịkwatu ya?

Do you want to knock her down?

Pụọ n'ụzọ. ọ ga-akwatu gị.

Pụọ n'ụzọ. ọ ga-akwatu gị.

Leave the road, he will knock you down.

Ọ na-akwatu ihe ọbụla nọchiri ya ụzọ.

Ọ na-akwatu ihe ọbụla nọchiri ya ụzọ.

He knocks down anything that obstructs him.

Kwatuo ya ka anyị nwe ohere ebe a.

Kwatuo ya ka anyị nwe ohere ebe a.

Knock it down let's have space here.

tídà

tidà

Wordtidà
Definitions

Active verb

1.knock down; pull down; demolish

Related Terms
Word Stems

Examples

Ha ga-etida aja ahụ ugbua.

Ha ga-etida aja ahụ ugbua.

They will pull down the house now.

Itida ya abaghị uru.

Itida ya abaghị uru.

Demolishing it is of no use.

Ndị ntoroọbịa ji iwe tida ya n'ala

Ndị ntoroọbịa ji iwe tida ya n'ala

The youths angrily knocked him down

Obi tidara ụlọ ahụ.

Obi tidara ụlọ ahụ.

Obi demolished the house.

tà ǫkpö

tà ọ̀kpọ

Wordtà ọ̀kpọ
Definitions

Active verb

1.knock the head with the knuckles

Related Terms
Word Stems

Examples

Ọ tara ya ọkpọ n'isi.

Ọ tara ya ọkpọ n'isi.

She knocked her on the head.

Soja a ga-ata gị ọkpọ n'isi.

Soja a ga-ata gị ọkpọ n'isi.

This soldier will give you a knock on the head.

Uju na-ebe akwa maka ọkpọ nne ya tara ya.

Uju na-ebe akwa maka ọkpọ nne ya tara ya.

Uju is crying because of the knock her mother gave her on the head.

Onye tara gị ọkpọ?

Onye tara gị ọkpọ?

Who knocked your head?

küwàpų

kụwàpụ̀

Wordkụwàpụ̀
Definitions

Active verb

1.knock off or hit out (teeth or anything fixed), especially resulting to a shatter or breakage

Related Terms

No related terms

Word Stems

Examples

A kụwapụrụ ya eze n'ọgụ ahụ.

A kụwapụrụ ya eze n'ọgụ ahụ.

His teeth was knocked off in that fight.

kpöbè ükwü

kpọbè ụkwụ̄

Wordkpọbè ụkwụ̄
Definitions

Active verb

1.knock and cut; hurt; abrase toe by knocking it against an object (usually by accident); stub the toes

Related Terms

No related terms

Word Stems

Examples

Achọghị m ikpọbe ukwu taa.

Achọghị m ikpọbe ukwu taa.

I do not want to stub my toes today.

Nkechi kpọbere ụkwụ n'abalị.

Nkechi kpọbere ụkwụ n'abalị.

Nkechi knock and hurt her toe last night.

Ọ kaara ịkpọbe ụkwụ ugbua.

Ọ kaara ịkpọbe ụkwụ ugbua.

He would have knock and hurt his toes now.

Ndị mmadụ na-akpọbe ụkwụ n'ebe a.

Ndị mmadụ na-akpọbe ụkwụ n'ebe a.

People stub their toes here.

Ị kpọbee ụkwụ ugbua, i merụọ ezigbo ahụ.

Ị kpọbee ụkwụ ugbua, i merụọ ezigbo ahụ.

If you stub your toes now, you will get injured.

Ndụka ga-akpọbe ụkwụ ma ọ bụrụ na o jighị ọkụ.

Ndụka ga-akpọbe ụkwụ ma ọ bụrụ na o jighị ọkụ.

Nduka would have stub his toes if he didn't have a torch.

kpághárï

kpagharị

Wordkpagharị
Definitions

Active verb

1.stir; turn a substance, in a container, using a stirrer, in order to mix it properly

2.lightly knock a pack of things apart, especially using a stick or other object, in order to confirm something

3.insult; disrespect; treat without regard; make a fool of someone

Related Terms
Word Stems

Examples

Kpagharịa ikpo ahịhịa ahụ, lee ma ya bụ agwọ ọ ga-apụta.

Kpagharịa ikpo ahịhịa ahụ, lee ma ya bụ agwọ ọ ga-apụta.

Knock around that heap of leaves and see if the snake would come out.

Azụnna na-akpagharị ofe ahụ.

Azụnna na-akpagharị ofe ahụ.

Azunna is stirring that soup.

Ọ bụ maka ị kpagharịrị ya.

Ọ bụ maka ị kpagharịrị ya.

It was because you stirred it.

Gaa n'ihu kpagharịa m! Anyị bụ ọgbọ!

Gaa n'ihu kpagharịa m! Anyị bụ ọgbọ!

Go ahead and disrespect me! We are mates!

Oke ịkpagharị ọgwụ na-emebe ya.

Oke ịkpagharị ọgwụ na-emebe ya.

Too much stirring of medicine (herbs) spoils it.

Nwata ahụ na-akpagharị mmadụ.

Nwata ahụ na-akpagharị mmadụ.

That child insults people.

A ga-akpagharị gị ebe ahụ.

A ga-akpagharị gị ebe ahụ.

You will be insulted there.

kürì

kụrì

Wordkụrì
Definitions

Active verb

1.break into pieces

2.break into pieces by knocking

Related Term
Word Stem

No word stems

Examples

Ụgbọala ahụ kụriri ụlọ azụmahịa ha

Ụgbọala ahụ kụriri ụlọ azụmahịa ha

That vehicle broke their shop to pieces

kü áká

kụ akā

Wordkụ akā
Definitions

Active verb

1.clap

2.knock on the door (for permission to enter)

Related Terms
Word Stems

Examples

Onye kụrụ aka n'ụzọ?

Onye kụrụ aka n'ụzọ?

Who knocked on the door?

Emeka ga-akụ aka tupu ọ banye ụlọ a.

Emeka ga-akụ aka tupu ọ banye ụlọ a.

Emeka will knock before he enters this house.

Kụọ aka tupu ị banye n'ụlọ ahụ.

Kụọ aka tupu ị banye n'ụlọ ahụ.

Knock before you enter into that house.

A nụrụ m ka a kụrụ aka n'ụ̣zọ.

A nụrụ m ka a kụrụ aka n'ụ̣zọ.

I heard a knock at the door.

Ha kụrụ aka tupu ha agbawaa ụzọ.

Ha kụrụ aka tupu ha agbawaa ụzọ.

They knocked before breaking the door.

M ga-akụ aka ma m ruo.

M ga-akụ aka ma m ruo.

I will knock when I get there.

Kụ̣ọ aka ma mepee ụzọ.

Kụ̣ọ aka ma mepee ụzọ.

Knock and open the door.

Nkọwa okwu logo

Learning Igbo made easy, free, and accessible.

Join our mailing list

© 2026 Nkọwa okwu 501(c)(3). All rights reserved.