Nkọwa okwu logo
Beta

ézè

ezè

Wordezè
Definitions

Noun

1.king

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

E chiri ya eze ọhụrụ.

E chiri ya eze ọhụrụ.

He was, newly, crowned king.

Nna ya bụ eze.

Nna ya bụ eze.

His father is a king.

Emeka bụ eze ndi ohi.

Emeka bụ eze ndi ohi.

Emeka is the king of robbers.

Eze anyị dị ọcha.

Eze anyị dị ọcha.

Our king is light skinned.

Achọrọ m ịbụ eze.

Achọrọ m ịbụ eze.

I want to be the king.

Sọ Chukwu ma onye ga-abụ eze.

Sọ Chukwu ma onye ga-abụ eze.

Only God knows who will be the king.

Agbụrụ anyị bụ agbụrụ ndị eze.

Agbụrụ anyị bụ agbụrụ ndị eze.

Our lineage is the lineage of the kings.

Onye bụ eze obodo unu?

Onye bụ eze obodo unu?

Who is the king in your town/community?

chí ézè

chi ezè

Wordchi ezè
Definitions

Active verb

司王

1.make king; become king

Related Term
Word Stem

Examples

Ka anyị jee ebe a na-echi eze

Ka anyị jee ebe a na-echi eze

Let us go to the place a king is being installed.

Echiri nna m eze be anyị.

Echiri nna m eze be anyị.

My father was made king of our place.

Nwoke a chie eze, ndị obodo ga-aṅụri ọṅụ.

Nwoke a chie eze, ndị obodo ga-aṅụri ọṅụ.

If this man becomes king, the towns people will rejoice.

Ndụka ga-echi eze ma ọ lọta.

Ndụka ga-echi eze ma ọ lọta.

Ndụka will become king when he returns.

Echir m eze.

Echir m eze.

I was coronated king.

A na-ezi eze n'ama n'ama.

A na-ezi eze n'ama n'ama.

Kings are coronated in kindreds.

Onye ka e chiri eze?

Onye ka e chiri eze?

Who was made king?

Okeke achọghị ichi eze.

Okeke achọghị ichi eze.

Okeke does not want to be made king.

Chíbųézè

Chibụ̀ezè

WordChibụ̀ezè
Definitions

Name

1.God is king

VariationsChibụ̄ēzè
Related Term
Word Stem

Examples

Aha ya bụ Chibụeze.

Aha ya bụ Chibụeze.

Her name is Chibueze.

óchēézè

ocheezè

Wordocheezè
Definitions

Noun

閣王

1.throne; a king's chair

Related Terms
Word Stems

Examples

Ndị ntaakụkọ bidoro sewe ya foto mgbe ọ nọdụrụ n'ocheeze ya.

Ndị ntaakụkọ bidoro sewe ya foto mgbe ọ nọdụrụ n'ocheeze ya.

The press started taking pictures of him when he sat on his throne.

Ọ bụ n'ocheeze ka ọ nọrọ kpee ikpe ahụ.

Ọ bụ n'ocheeze ka ọ nọrọ kpee ikpe ahụ.

It is on the throne that he dispensed judgement.

Ọ gwara ha na ocheeze ya abụghị nke ụwa a.

Ọ gwara ha na ocheeze ya abụghị nke ụwa a.

He told them that his throne is not of this world.

Ocheeze gị ga-adịgide.

Ocheeze gị ga-adịgide.

Your throne will be forever.

òbí

òbi

Wordòbi
Definitions

Noun

1.title of a king in Igbo land; central or most vital unit

2.palace; parlor; a building (in Igbo architecture) for gatherings especially belonging to a community or family

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

Anyị gbakọrọ n'obi eze kpaa maka nchekwa imoobodo anyị.

Anyị gbakọrọ n'obi eze kpaa maka nchekwa imoobodo anyị.

We gathered at the king's palace and discussed about the security of our community.

Anyị gbakọrọ n'obi eze kpaa maka nchekwa imoobodo anyị.

Anyị gbakọrọ n'obi eze kpaa maka nchekwa imoobodo anyị.

We gathered at the king's palace and discussed about the security of our community.

ígwē

igwē

Wordigwē
Definitions

Noun

1.sky

2.salutation for a king

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

Igwe achakeela taa.

Igwe achakeela taa.

The sky has brightened up today.

Ha na-etu ya igwe.

Ha na-etu ya igwe.

They are saluting him 'Igwe'.

Àdáèzè

Àdaèzè

WordÀdaèzè
Definitions

Name

割王

1.daughter of a king; princess

2.first daughter of a king

VariationsÀdeèzè
Related Terms
Word Stems

Examples

Adaeze ga-abịa echi.

Adaeze ga-abịa echi.

Adaeze will come tomorrow.

Biko, nyere m Adaeze akwa a.

Biko, nyere m Adaeze akwa a.

Please, help me give Adaeze this cloth.

Ézúùgò

Ezūùgò

WordEzūùgò
Definitions

Name

1.a prestigious king; an honorable king

VariationsEzēùgò
Related Terms

No related terms

Word Stems

No word stems

Examples

Aha nwaakwụkwọ m bụ Ezuugo.

Aha nwaakwụkwọ m bụ Ezuugo.

My student's name is Ezeugo.

Nwábüēzè

Nwabụ̄ēzè

WordNwabụ̄ēzè
Definitions

Name

1.a child who is king

VariationsNwabēēzè, Nwabēzè
Related Terms

No related terms

Word Stems

Examples

Nwabụeze bụ aha m.

Nwabụeze bụ aha m.

Nwabueze is my name.

Ézèńnwá

Ezènnwā

WordEzènnwā
Definitions

Noun

王子

1.the head child; the king child

VariationsEzēnwā
Related Terms

No related terms

Word Stems

No word stems

Examples

Ezennwa amaghị na anyị nọ ebe a.

Ezennwa amaghị na anyị nọ ebe a.

Ezenwa does not know that we are here.

Nkọwa okwu logo

Learning Igbo made easy, free, and accessible.

Join our mailing list

© 2026 Nkọwa okwu 501(c)(3). All rights reserved.