Nkọwa okwu logo
Beta

já

ja

Wordja
Definitions

Active verb

1.hail; praise; commend; salute; pay homage

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

A jara ya mgbe ọ gbara onye mbụ n'asọmpị asụsụ Igbo.

A jara ya mgbe ọ gbara onye mbụ n'asọmpị asụsụ Igbo.

He was praised when he came first in the Igbo language competition.

-jà

-jà

Word-jà
Definitions

Extensional suffix

1.into pieces, crush, or mash

2.into disorientation

Related Terms

No related terms

Word Stems

No word stems

Examples

Ọ kụjara nnyo ekwentị m.

Ọ kụjara nnyo ekwentị m.

He hit my phone screen to pieces.

Ọ zọjara nke dara n'ala.

Ọ zọjara nke dara n'ala.

She crushed (by foot) the one that fell on the floor.

O sujara ụgbaala nna ya.

O sujara ụgbaala nna ya.

He bashed his father's car.

A na-apịja ụdị nri ahụ tupu e nye ya nwata.

A na-apịja ụdị nri ahụ tupu e nye ya nwata.

That tyoe of food get crushed before it's given to a baby.

tò

Wordtò
Definitions

Active verb

1.praise

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

Anyị ga-eto ya ebighịebi maka ihe o meere anyị.

Anyị ga-eto ya ebighịebi maka ihe o meere anyị.

We will praise him forever for what he did for us.

Ọ dị mma ito mmadụ̣ ma o mee ihe oma.

Ọ dị mma ito mmadụ̣ ma o mee ihe oma.

It is good to praise a person when he does a good deed.

Too Chineke oge niile.

Too Chineke oge niile.

Praise God all the time.

Ha toro ya maka iheọma o mere.

Ha toro ya maka iheọma o mere.

They praised him for the good thing he did.

Mmadụ niile na-eto ya.

Mmadụ niile na-eto ya.

Everybody is praising him.

ńtà

ntà

Wordntà
Definitions

Nominal Modifier

1.little; small

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

Anụ ahụ dịcha nta nta.

Anụ ahụ dịcha nta nta.

The meats are in small pieces.

Ehi ndị ukwu loro ndị nta.

Ehi ndị ukwu loro ndị nta.

The big cows swallowed the small ones.

Ndị dị nta nọrọ n'ihu.

Ndị dị nta nọrọ n'ihu.

The small ones should be in front.

Nwoke a anaghị eme ihe dị nta.

Nwoke a anaghị eme ihe dị nta.

This man does not do small things.

E nyere m nsogbu mgbe m dị nta.

E nyere m nsogbu mgbe m dị nta.

I was troublesome when I was little.

Oke nke ya dị nta.

Oke nke ya dị nta.

His own share is small.

Ọ fọdụrụ nwa mgbe nta ka o mesịa.

Ọ fọdụrụ nwa mgbe nta ka o mesịa.

It is remaining a little time for her to finish.

zó

zo

Wordzo
Definitions

Passive verb

1.hide

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

A hụrụ mụ mgbe ọ na-ezo ya.

A hụrụ mụ mgbe ọ na-ezo ya.

I saw when she was hiding it.

Ọ chọrọ izo.

Ọ chọrọ izo.

He wants to hide.

O zoro ebe a.

O zoro ebe a.

He is hidden here.

Ha ga-ezo ma ha hụ mmanwụ.

Ha ga-ezo ma ha hụ mmanwụ.

They will hide when they see masquerade.

Kedụ ebe o zoro akwa ahụ?

Kedụ ebe o zoro akwa ahụ?

Where did she hide her cloth?

óbérē

oberē

Wordoberē
Definitions

Nominal Modifier

富子

1.small amount or quantity of something; little

2.anything brief, tiny in size or young; little

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

Nye m obere oge.

Nye m obere oge.

Give me a little time.

Ndị obere mmadụ anọghị ebe a.

Ndị obere mmadụ anọghị ebe a.

There is no common person here.

Tinye nri ahụ obere mmiri

Tinye nri ahụ obere mmiri

Add a little water to that food.

Ahụrụ m obere ụmụaka.

Ahụrụ m obere ụmụaka.

I saw little children.

Ọ fọrọ obere ihe ka ọ daa.

Ọ fọrọ obere ihe ka ọ daa.

It was remaining a little thing for him to fall.

Ọ bụ naanị obere ihe ka a ga-ebechapụ n'ọnụ nkakwụ ọ ghọrọ oke

Ọ bụ naanị obere ihe ka a ga-ebechapụ n'ọnụ nkakwụ ọ ghọrọ oke

Only a small portion of the shrews mouth needs to be cut off for it to become a rat

Nkọwa okwu logo

Learning Igbo made easy, free, and accessible.

Join our mailing list

© 2025 Nkọwa okwu 501(c)(3). All rights reserved.