Nkọwa okwu logo
Beta
Currently not paying for premium. Ad will show here.

ígù

igù

Wordigù
Definitions

Noun

寃葉

1.palm frond

Related Term
Word Stem

No word stems

Examples

Ewu a na-eso m maka eji m igu.

This goat is following me because I have palm fronds.

gụ

Wordgụ
Definitions

Active verb

1.hunger; desire to have something or get involved in something; crave

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

Gịnị na-agụ gị?

What do you desire?

Mmiri na-agụ m.

I am thirsty (I crave water).

Achịcha gụrụ m, ụnyaahụ.

I craved bread, yesterday.

Amaghị ka ọ ga-agụ m agụụ.

I don't know if I will crave for it

Erighị nri na-akpalite ịgụ agụụ.

Lack of food triggers hunger.

gụ

Wordgụ
Definitions

Active verb

1.sing

Related Terms
Word Stems

Examples

Ada na-agụ egwu.

Ada is singing.

Anya mmiri gbara m oge ọ na-agụ egwu.

I shed tears when she was singing.

Gụọ egwu ahụ ka onye dị ndụ.

Sing that song like someone that is alive.

Ịgụ egwu bụ ọrụaka ya.

Singing is his occupation.

Ọ ga-agụ egwu ma ebido.

He will sing when they start.

Anyị ga-agụ egwu ahụ ọzọ.

We will sing that song again.

Nwaanyị ahụ na-agụ egwu n'ụtụtụ ọbụla.

That woman sings that song every morning.

Gịnị mere o ji agụ egwu ahụ?

Why is he singing that song?

Anyị gụrụ egwu ahụ.

We sang that song.

gụ

Wordgụ
Definitions

Active verb

1.count

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

A ga-agụ ka a mara ole ọ dị.

It will be counted so we know how many it is.

Ọ gụrụ ego nna ya ukwu nyere ya tupu ọ pụọ.

He counted the money his master(boss) gave him before he left.

Ọ mụtara ịgụ ọnụọgụgụ

He learnt how to count numerals.

Ọ gụrụ ya mgbe ọ pụrụ.

He counted it when he left.

gụ̀

Wordgụ̀
Definitions

Active verb

1.give name to; name

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

Gụọ ya Taagboo.

Name him Tagbo.

Gụọ ya aha mmadụ azatubeghi.

Give him a name that has not been answered by anybody.

Dọkịta sịrị na a ga-agụ ya Chukwuemeka.

Doctor said he will be named Chukwuemeka.

Achọrọ m ịgụ ya aha nne m.

I want to name her after my mother.

Ọ bụ nna m gụrụ m Obiọha.

It was my father that named me Obioha.

Olee aha a gụrụ ya?

What name was she given?

gụ

Wordgụ
Definitions

Active verb

1.read; study

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

A ga m agụ akwụkwọ ahụ taata.

I will read that book today.

Ọ na-agụ akwụkwọ nsọ.

She is reading the Holy Bible.

Anyị ga-agụ aghọtaaza a echi.

We will read this comprehension tomorrow.

gụ

Wordgụ
Definitions

Passive verb

1.to pick something by piercing or poking through it

Related Term
Word Stem

No word stems

Examples

Ọ na-agụ anụ na nri m.

She is picking meat from my food.

Nwata ahụ na-agụ anụ n'ite ofe.

That child picks meat from the soup pot.

Gịnị mere ị ji agụ ndị nke ahụ?

Why are you picking those ones?

Gụrụ akara nke gị.

Pick your own akara.

Ọ na-agụ anụ na nri m.

She is picking meat from my food.

Chiamaka ga-agụ anụ gbara abụba.

Chiamaka will pick the fatty meat.

Ị chọrọ ịgụ azụ dị n'ite?

Do you want to pick the meat in the pot?

Jiri wayọ gụọ ya.

Pick it gently.

Ọ na-agụ azụ ndị ahụ eghere eghe.

She is picking those fried fish.

gụ

Wordgụ
Definitions

Active verb

1.recite; say (recite)

Related Terms
Word Stems

Examples

Gụọ 'Amara'.

Say 'The Grace'.

Currently not paying for premium. Ad will show here.
Nkọwa okwu logo

Learning Igbo made easy, free, and accessible.

Join our mailing list

© 2025 Nkọwa okwu. All rights reserved.