tü
tụ
Word | tụ |
Definitions | Active verb 終 1.throw; cast; hurl; fling; toss |
Related Terms | |
Word Stems | No word stems |
Examples
Atụla okwute n'ụlọ e ji nnyo rụọ.
Atụla okwute n'ụlọ e ji nnyo rụọ.
Do not throw stones in a house built with glass.
Ịtụ ya n'ala agaghị eme ya ihe ọbụla.
Ịtụ ya n'ala agaghị eme ya ihe ọbụla.
Throwing it on the floor will not do anything to it.
Ha chọrọ ịtụ ya okwute.
Ha chọrọ ịtụ ya okwute.
They want to stone him.
Onye tụrụ m akwụkwọ a?
Onye tụrụ m akwụkwọ a?
Who threw this paper at me?
E si n'elu wee tụọ ya bụ ogbuniigwe.
E si n'elu wee tụọ ya bụ ogbuniigwe.
That bomb was thrown from up.
tų
tụ̀
Word | tụ̀ |
Definitions | Active verb 1.peck (a bird); bite (snake and other animals with pointed mouth, beak or tongue) 2.pinch, especially with the forefinger and thumb |
Related Terms | |
Word Stems |
Examples
Achọghị m ịtụ gị mbọ.
Achọghị m ịtụ gị mbọ.
I do not want to pinch you.
Chike ga-atụ nwa gị mbọ ma ị hapụ ha abụọ.
Chike ga-atụ nwa gị mbọ ma ị hapụ ha abụọ.
Chike will pinch your child if you leave them together.
Emeka, tụọ ya mbọ!
Emeka, tụọ ya mbọ!
Emeka, pinch him!
tü
tụ
Word | tụ |
Definitions | Active verb 1.be in moderate or the right quantity in a mixture, eg. salt, pepper, sugar in food |
Related Terms | |
Word Stems | No word stems |
Examples
Nnu tụrụ ofe m rachara.
Nnu tụrụ ofe m rachara.
Salt was in the right proportion in the soup I had.
Ose na-atụ nri ọbụla Aṅụrịka siri.
Ose na-atụ nri ọbụla Aṅụrịka siri.
Pepper stays moderate in any food Anurika cooks.
Onugbu tụrụ ya.
Onugbu tụrụ ya.
There is enough bitter leaf in it.
Biko kute nnu ga-atụ nri a m na-esi.
Biko kute nnu ga-atụ nri a m na-esi.
Please scoop salt that will be moderate for this food I am cooking.
Ekwela ka nnu tụọ ya nnukwu.
Ekwela ka nnu tụọ ya nnukwu.
Do not allow excess salt.
tú
tu
Word | tu |
Definitions | Active verb 1.pin; peg; stick or attach using a pointed end |
Related Terms | |
Word Stems | No word stems |
Examples
O tu abụba ugo n'okpu ya.
O tu abụba ugo n'okpu ya.
He has, attached, an eagle feather on his cap.
ógìdì
ogìdì
Word | ogìdì |
Definitions | Noun 1.large post that helps to hold up something; pillar; 2.someone who is a main support of an institution |
Related Term | |
Word Stem | No word stems |
Examples
Nwunye Lot ghọrọ ogidi nnu.
Nwunye Lot ghọrọ ogidi nnu.
Lot's wife turned into a pillar of salt.
Arinze bụ ogidi ji ezinụlọ a.
Arinze bụ ogidi ji ezinụlọ a.
Arinze is the pillar holding this family.
Ogidi ahụ esighị ike.
Ogidi ahụ esighị ike.
The pillar is not strong.
Anyị na-ewu ogidi.
Anyị na-ewu ogidi.
We are erecting the pillar.
Kraịst bụ ogidi ji ndụ m.
Kraịst bụ ogidi ji ndụ m.
Christ is the pillar that holds my life.
Ogidi kwesịrị ịdị n'ụlọ a.
Ogidi kwesịrị ịdị n'ụlọ a.
A pilllar is supposed to be in this house.
Ogidi ahụ dị elu.
Ogidi ahụ dị elu.
The pillar is high.
Ogidi ndị a ji ụlọ a.
Ogidi ndị a ji ụlọ a.
These pillars are holding this house.
Onye mebiri ogidi a?
Onye mebiri ogidi a?
Who destroyed this pillar.