gbötǫ
gbọtọ̀
| Word | gbọtọ̀ |
| Definitions | Passive verb 1.drop carelessly; abandon 2.dropped; be abandoned |
| Related Terms | |
| Word Stems | No word stems |
Examples
Ị chọrọ ịgbọtọ ego a ebe a?
Ị chọrọ ịgbọtọ ego a ebe a?
Do you want to drop this money here?
Ọ na-agbọtọ akpa ya ebe ọbụla masịrị ya.
Ọ na-agbọtọ akpa ya ebe ọbụla masịrị ya.
She drops her bag wherever she likes.
Ha ahụghị onye gbọtọrọ akpati a.
Ha ahụghị onye gbọtọrọ akpati a.
They did not see who abandoned this luggage.
Achọghị m ka ị gbọtọ ihe a ebe a.
Achọghị m ka ị gbọtọ ihe a ebe a.
I don't want you to abandon this thing here.
Ọ gbọtọrọ ya n'ọhịa.
Ọ gbọtọrọ ya n'ọhịa.
He dropped it in the bush.
Ọ ga-agbọtọ mma ahụ ma o mechaa.
Ọ ga-agbọtọ mma ahụ ma o mechaa.
He will drop the knife when he is done
Gbọtọ ya n'ala.
Gbọtọ ya n'ala.
Drop it on the ground.
Ọ dịghị mma ịgbọtọ efere iji ri nri etu a.
Ọ dịghị mma ịgbọtọ efere iji ri nri etu a.
It is not proper to drop the plate you ate with like this.
Ọ na-agbọtọ akwa ya oge ọbụla n'elu akwa.
Ọ na-agbọtọ akwa ya oge ọbụla n'elu akwa.
She usually drops her cloths on the bed.
Onye gbọtọrọ ego a?
Onye gbọtọrọ ego a?
Who dropped this money?
Ebe ahụ ị na-agbọtọ ya, ọ ziri ezi?
Ebe ahụ ị na-agbọtọ ya, ọ ziri ezi?
That place you are dropping it, is it proper?
Ọ gbọtọ n'ala mgbe m hụrụ ya.
Ọ gbọtọ n'ala mgbe m hụrụ ya.
It lay abandoned on the floor when I saw it.
tǫgbǫ
tọ̀gbọ̀
| Word | tọ̀gbọ̀ |
| Definitions | Passive verb 1.lie abandoned; drop |
| Related Term | |
| Word Stem | No word stems |
Examples
Ahụrụ m akpaego m ka ọ tọgbọ n’ala ụgbọala m
Ahụrụ m akpaego m ka ọ tọgbọ n’ala ụgbọala m
I saw my wallet lying(abandoned) on the floor of my car
Lee ego ị na-achọ ka ọ tọgbọ ebe ahụ.
Lee ego ị na-achọ ka ọ tọgbọ ebe ahụ.
See the money you were searching for lying over there.
Ha na-atọgbọ ngwongwo ha n'ala.
Ha na-atọgbọ ngwongwo ha n'ala.
They are dropping their property on the ground.
Ebee ka akwụkwọ a nwere ike ịtọgbọ ugbua?
Ebee ka akwụkwọ a nwere ike ịtọgbọ ugbua?
Where could this book be lying abandoned?
I rute n'ụlọ m, tọgbọ ihe niile ndị ahụ n'elu oche.
I rute n'ụlọ m, tọgbọ ihe niile ndị ahụ n'elu oche.
If you get to my house, drop all those things on the chair.
Ebee ka ị tọgbọrọ ya?
Ebee ka ị tọgbọrọ ya?
Where did you drop it?
Ọ ga-atọgbọ ya n'ezi.
Ọ ga-atọgbọ ya n'ezi.
He will drop it outside.
Ọ na-atọgbọ n'ala.
Ọ na-atọgbọ n'ala.
It is lying abandoned on the floor.
tüsá
tụsa
| Word | tụsa |
| Definitions | Active verb 終㡣 1.drop or keep something, especially small or lightweight; drop something (small or lightweight) upon |
| Related Term | |
| Word Stem |
Examples
Achọrọ m ịtụsa ihe a ebe a.
Achọrọ m ịtụsa ihe a ebe a.
I want to drop this thing here.
Atụsara m ya ebe m hụrụ ya.
Atụsara m ya ebe m hụrụ ya.
I dropped it where I saw it.
Tụsara m akwụkwọ m.
Tụsara m akwụkwọ m.
Drop my book for me.
Ngọzị tụsara nri n'ala.
Ngọzị tụsara nri n'ala.
Ngọzị dropped some food particles on the floor.
Nne ga-atụsa ọgwụ ahụhụ.
Nne ga-atụsa ọgwụ ahụhụ.
Mother will drop insecticide.