gbálá
gbala
Word | gbala |
Definitions | Active verb 1.run home |
Related Terms | |
Word Stems |
Examples
Chinedu, gbalaa ụlọ ugbua!
Chinedu, gbalaa ụlọ ugbua!
Chinedu, run home now!
Ọ ga-agbala be di ya.
Ọ ga-agbala be di ya.
She will run back to her husband's house.
Nwata a nwere ike ịgbala.
Nwata a nwere ike ịgbala.
This child may run home.
Onye gbalara?
Onye gbalara?
Who ran home?
Ọ na-agbala oge niile a kpọpụrụ ya n'aka nne ya.
Ọ na-agbala oge niile a kpọpụrụ ya n'aka nne ya.
She runs home every time she is taken away from her mothers care.
Kwado, anyị ga-agbala echi.
Kwado, anyị ga-agbala echi.
Get prepared, we will run home tomorrow.
Kedụ mgbe Emeka gbalara?
Kedụ mgbe Emeka gbalara?
When did Emeka run home?
Hapụ m, agaghị agbala be anyị.
Hapụ m, agaghị agbala be anyị.
Leave me, I will not run back to our house.
Nkeiru na-agbala mgbe ọbụla ọ na-arịa ọrịa.
Nkeiru na-agbala mgbe ọbụla ọ na-arịa ọrịa.
Nkeiru runs home whenever she is sick.
Anyị hụrụ ya ka ọ na-agbala.
Anyị hụrụ ya ka ọ na-agbala.
We saw him as he was running home.
Nnamdị chọrọ ịgbala.
Nnamdị chọrọ ịgbala.
Nnamdi wants to run home.
Ọ gbalara ozugbo ọ natara ozi ahụ.
Ọ gbalara ozugbo ọ natara ozi ahụ.
He ran home immediately he got that news.
A gaghị m enye gị ego ma ịgbalaa.
A gaghị m enye gị ego ma ịgbalaa.
I will not give you money if you run home.
Gịnị mere o ji agbala?
Gịnị mere o ji agbala?
Why is he running home?
Ọ ga-agbala ma ị pịa ya ụtarị.
Ọ ga-agbala ma ị pịa ya ụtarị.
She will run home if you flog her.
gbánárï
gbanarị
Word | gbanarị |
Definitions | Active verb 1.avoid; stay away from 2.outrun; escape |
Related Terms | |
Word Stems |
Examples
Gbanarị nsogbu.
Gbanarị nsogbu.
Avoid troubles.
Ndị ohi ahụ gbanarịrị ndị uweojii.
Ndị ohi ahụ gbanarịrị ndị uweojii.
Those thieves escaped from the policemen.
Ị gaghị agbanarị ntaramahụhụ gị.
Ị gaghị agbanarị ntaramahụhụ gị.
You can not run away from your punishment.
Mmadụ anaghị agbanarị onyinyo ya.
Mmadụ anaghị agbanarị onyinyo ya.
One can not outrun his shadows.
Eji m ụkwụ gbanarị oyibo.
Eji m ụkwụ gbanarị oyibo.
With me legs, I escaped from the government.
Obiọra ga-agbanarị ha niile n'ọsọ.
Obiọra ga-agbanarị ha niile n'ọsọ.
Obiọra will outrun all of them.
Anyị na-agbanarị ekwensu.
Anyị na-agbanarị ekwensu.
We shall escape from the devil.
Naanị mmadụ abụọ gbanarịrị.
Naanị mmadụ abụọ gbanarịrị.
Only two persons escaped.
Ị gbanarị m taa, m ka ga-ejide gị.
Ị gbanarị m taa, m ka ga-ejide gị.
If you escape from me today, I will still catch you.