Nkọwa okwu logo
Beta

fùnárï

fùnarị

Wordfùnarị
Definitions

Active verb

1.wander from; be lost from

Related Terms
Word Stems

Examples

N'ebe a, ụmụaka na-efunari ndị mụrụ ha.

N'ebe a, ụmụaka na-efunari ndị mụrụ ha.

In this place, parents lose their children.

Moto ya funarịrị ya..

Moto ya funarịrị ya..

He lost his car.

O funarị gị, onye ọzọ ewere ya.

O funarị gị, onye ọzọ ewere ya.

If you lose it, someone else will take it.

Ọ bụ naanị akpa ahụ funarịrị ya.

Ọ bụ naanị akpa ahụ funarịrị ya.

It was only that bag that got missing from her.

Achọghị m ka ekwentị m funarị m.

Achọghị m ka ekwentị m funarị m.

I do not want to lose my phone.

Akpụkpọ ụkwụ ya funarịrị ya

Akpụkpọ ụkwụ ya funarịrị ya

He lost his shoes.

Nkịta m chọrọ ifunarị m.

Nkịta m chọrọ ifunarị m.

I almost lost my dog.

Ihe ifunarị Egodi anaghị ara ahụ.

Ihe ifunarị Egodi anaghị ara ahụ.

Egodi is used to losing things.

Ego a ga-efunarị gị.

Ego a ga-efunarị gị.

You will lose this money.

Akpa ya funarịrị ya.

Akpa ya funarịrị ya.

She lost her bag.

Dowe ya ọfụma ka ọ ghara ifunarị gị.

Dowe ya ọfụma ka ọ ghara ifunarị gị.

In order not to lose it, keep it very well.

Ude m funarịrị m na be ya.

Ude m funarịrị m na be ya.

I lost my pomade in his house.

Ego a funarị gị, i were nke gị kwụọ ụgwọ akwụkwọ.

Ego a funarị gị, i were nke gị kwụọ ụgwọ akwụkwọ.

If you lose this money, you will pay your school fees with your money.

hünárï

hụnarị

Wordhụnarị
Definitions

Active verb

1.see more (than another person)

Related Term
Word Stem

Examples

Ọ na-ahụnarị ihe karịa ndị ọgbọ ya.

Ọ na-ahụnarị ihe karịa ndị ọgbọ ya.

He sees things more than his mates.

Nwata a chọrọ ịhụnarị m n'egwu a.

Nwata a chọrọ ịhụnarị m n'egwu a.

This child wants to see more than me in this dance.

A hụnarịala m gị n'ụwa.

A hụnarịala m gị n'ụwa.

I have seen this world more than you.

Ndị ogologo na-ahụnarị ndị mkpụmkpụ n'ihe n'emume ọbụla.

Ndị ogologo na-ahụnarị ndị mkpụmkpụ n'ihe n'emume ọbụla.

Tall people see more than short people in any event.

O nwere onye ga-ahụnarị Chineke n'ihe n'ụwa a?

O nwere onye ga-ahụnarị Chineke n'ihe n'ụwa a?

Is there anyone who will see more than God in this world.

Jụọ Emeka, ọ hụnarịrị m n'ihe mere taa.

Jụọ Emeka, ọ hụnarịrị m n'ihe mere taa.

Ask Emeka, he saw more than me on what happened today.

Nkọwa okwu logo

Learning Igbo made easy, free, and accessible.

Join our mailing list

© 2025 Nkọwa okwu 501(c)(3). All rights reserved.