Nkọwa okwu logo
Beta

ésó

esō

Wordesō
Definitions

Noun

1.gum; adhesive; glue

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

E ji eso nwụdo nnụnụ ahụ.

E ji eso nwụdo nnụnụ ahụ.

The bird was caught with a glue.

Kedụ ebe m nwere ike ịzụta eso?

Kedụ ebe m nwere ike ịzụta eso?

Where can I buy gum?

O ji eso dozie akpụkpụ ụkwụ m.

O ji eso dozie akpụkpụ ụkwụ m.

He used gum to repair my shoe.

Nne m na-ere eso.

Nne m na-ere eso.

My mother sells glue.

Ugochi bere ihe nnụnụ bere n'eso mgbe a pịara ya ụtarị.

Ugochi bere ihe nnụnụ bere n'eso mgbe a pịara ya ụtarị.

Ugochi cried like a bird caught with glue when she was flogged.

E nwere ọnya oke e ji eso eme.

E nwere ọnya oke e ji eso eme.

There is a type of rat trap produced with glue.

Were eso tapawa ihe a n'ahụ aja.

Were eso tapawa ihe a n'ahụ aja.

Use glue to paste this thing on the wall.

Ụdara nwere eso.

Ụdara nwere eso.

African star apple has gum.

Ikenna ji eso machie akwụkwọ ya.

Ikenna ji eso machie akwụkwọ ya.

Ikenna bound his book with gum.

Onye nwe eso dị n'elu oche?

Onye nwe eso dị n'elu oche?

Who has the gum on the chair?

Eso m agwụla.

Eso m agwụla.

My gum is finished.

Wetere m eso.

Wetere m eso.

Bring glue/gum for me.

Eso a emebiela.

Eso a emebiela.

This gum is spoilt.

Eso ahụ emebiela.

Eso ahụ emebiela.

The gum is spoilt.

ágbü

agbụ

Wordagbụ
Definitions

Noun

1.rope for climbing (especially palm tree)

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

Agbụ Ikedi tibiri.

Agbụ Ikedi tibiri.

Ikedi's climbing rope cut.

Ama m etu esi ahị agbụ.

Ama m etu esi ahị agbụ.

I know how to twist rope.

Agbụ a, esighi ike.

Agbụ a, esighi ike.

This rope is not strong.

Gbaa agbụ ahụ mmiri.

Gbaa agbụ ahụ mmiri.

Water the climbing rope.

Anyị nwere agbụ anọ.

Anyị nwere agbụ anọ.

We have four climbing ropes.

E ji agbụ arị nkwu.

E ji agbụ arị nkwu.

We climb palm tree with climbing rope.

Otenkwụ konyere agbụ ya n'ubu.

Otenkwụ konyere agbụ ya n'ubu.

The palmwine tapper hung his rope on the shoulder.

Ọnaghị amasị Okeke iji agbụ rịa nkwu.

Ọnaghị amasị Okeke iji agbụ rịa nkwu.

Okeke does not like climbing palm trees with a rope.

Nkọwa okwu logo

Learning Igbo made easy, free, and accessible.

Join our mailing list

© 2026 Nkọwa okwu 501(c)(3). All rights reserved.