àsè
àsè
Word | àsè |
Definitions | Noun 1.inquiry; enquire; 2.consultation; 3.situation or condition of someone or something; how someone or something is doing; about; concerning |
Related Terms | |
Word Stems | No word stems |
Examples
Emeka jụrụ ase gị.
Emeka jụrụ ase gị.
Emeka enquired about you.
Obi sị na ọ chọghị ịjụ ase gbasara ọnwụ nnwa ya.
Obi sị na ọ chọghị ịjụ ase gbasara ọnwụ nnwa ya.
Obi said that he does not want to make consultations concerning his child's death.
Ọ na-ajụ ase unu oge ọbụla.
Ọ na-ajụ ase unu oge ọbụla.
She enquires about you all the time.
Jee, jụọ ase gbasara ihe ahụ.
Jee, jụọ ase gbasara ihe ahụ.
Go and make inquiry about that thing.
Jee jụọ ajụjụ ka ị mara ase.
Jee jụọ ajụjụ ka ị mara ase.
Go and ask questions so that you know the situation.
Ọ jụghị ase m.
Ọ jụghị ase m.
He did not ask after me.
Oziọma gara na nke dibịa ịjụ ase.
Oziọma gara na nke dibịa ịjụ ase.
Oziọma went to the native doctor for inquiry.
Gaa, jụọ ase m.
Gaa, jụọ ase m.
Go and ask about me.
öbá
ọba
Word | ọba |
Definitions | Noun 抄 1.place where yams are stacked and stored 2.a store room or base; where some specific thing is stored |
Related Term | |
Word Stem | No word stems |
Examples
Dobe ji ahụ n' ọba ka ọ ghara ifu.
Dobe ji ahụ n' ọba ka ọ ghara ifu.
Keep that yam in the barn so that it does not get missing.
E jere ohi n'ọba ha.
E jere ohi n'ọba ha.
Their barn was robbed.
Ka m jee n'ọba ego m wete ego.
Ka m jee n'ọba ego m wete ego.
Let me go to my piggybank and collect money.
Nna m nwere nnukwu ọba.
Nna m nwere nnukwu ọba.
My father has a large barn.
O ziri nwa ya ka o wetara ya ji n' ọba.
O ziri nwa ya ka o wetara ya ji n' ọba.
He sent his child to bring yam for him from the barn.
Ọba ya gbara ọkụ.
Ọba ya gbara ọkụ.
His barn got burnt.