érírí
eriri
| Word | eriri |
| Definitions | Noun 筋 1.string; rope; thread |
| Related Terms | |
| Word Stems | No word stems |
Examples
Chidi ewelatabeghị eriri m nyere ya.
Chidi ewelatabeghị eriri m nyere ya.
Chidi has not returned the thread I gave him.
Jiri eriri ahụ kee ewu ahụ.
Jiri eriri ahụ kee ewu ahụ.
Use that rope to tie that goat.
Eriri nke a buru ibu.
Eriri nke a buru ibu.
This thread is big.
Eriri nke a esighị ike, biko nye m ọzọ.
Eriri nke a esighị ike, biko nye m ọzọ.
This rope is not strong, please give me another one.
I nwere eriri e ji akwa akwa?
I nwere eriri e ji akwa akwa?
Do you have a thread for sewing cloth?
E ji eriri kechie ya.
E ji eriri kechie ya.
It was tied with a rope.
ésú
esu
| Word | esu |
| Definitions | Noun 焼 1.giant African millipede (Archispirostreptus gigas) |
| Related Terms | |
| Word Stems | No word stems |
Examples
Ahụrụ m esu ka m na-achọ ịtụtụrụ mkpịsị ahụ dị n'ala.
Ahụrụ m esu ka m na-achọ ịtụtụrụ mkpịsị ahụ dị n'ala.
I saw a millipede while I was trying to pick up that stick on the ground.
Esu na-asọ oyi.
Esu na-asọ oyi.
Millipede is irritating.
Ahụrụ m esu.
Ahụrụ m esu.
I saw a millipede.
Esu na-arịpụta n'ime ala ma mmiri zoo.
Esu na-arịpụta n'ime ala ma mmiri zoo.
Millipede comes out of the ground when rain falls.
Nwata ahụ na-arị ka esu.
Nwata ahụ na-arị ka esu.
That child is as sluggish like millipede.
Onye gburu esu a?
Onye gburu esu a?
Who killed this millipede?
Gbuo esu ahụ.
Gbuo esu ahụ.
Kill that millipede.
O ji ụkwụ zọpịa esu ahụ.
O ji ụkwụ zọpịa esu ahụ.
He crushed the millipede with his leg.
òwú
òwu
| Word | òwu |
| Definitions | Noun 1.thread [for sewing] |
| Related Term | |
| Word Stem |
Examples
Aga m azụ owu ọzọ echi.
Aga m azụ owu ọzọ echi.
I will buy another thread tomorrow.
Onye nwe owu ahụ?
Onye nwe owu ahụ?
Who has that thread?
Achọghị m owu ojii ahụ.
Achọghị m owu ojii ahụ.
I do not want that black thread.
Owu ahụ adịghị ọnụ.
Owu ahụ adịghị ọnụ.
That thread is not costly.
E ji owu akwa akwa.
E ji owu akwa akwa.
Thread is used for sewing cloth.
Onye agbata obi m na-ere owu.
Onye agbata obi m na-ere owu.
My neighbour sells thread.
Owu m na-efu efu.
Owu m na-efu efu.
My thread is missing.
ǹgìgè
ǹgìgè
| Word | ǹgìgè |
| Definitions | Noun 1.line; a rope, cord, or wire used for domestic purpose; a length of rope tied to fixed objects at both ends, especially for spreading clothes |
| Related Terms | |
| Word Stems | No word stems |
Examples
Ngige ahụ adọbiela.
Ngige ahụ adọbiela.
The line is cut.
Zụta ngige siri ike.
Zụta ngige siri ike.
Buy a strong line.
Kedụ onye na-ere ngige a?
Kedụ onye na-ere ngige a?
Who sells this line?
Uche gbasara akwa na ngige.
Uche gbasara akwa na ngige.
Uche spread cloths on the line.
Ọkụkọ m na-ebe na ngige.
Ọkụkọ m na-ebe na ngige.
My chicken perches on the line.
Konye ya na ngige ahụ.
Konye ya na ngige ahụ.
Hang it on the line.
Anyị nwere ogologo ngige.
Anyị nwere ogologo ngige.
We have a long line.
Ịgbasa ya na ngige ka mma.
Ịgbasa ya na ngige ka mma.
Spreading it on the line is better.
Uchenna gbasara akwa na ngige ruru unyi.
Uchenna gbasara akwa na ngige ruru unyi.
Uchenna spread his cloth on a dirty line.
Ngige a akaala nka.
Ngige a akaala nka.
This line is old.
Onye nwe ngige a?
Onye nwe ngige a?
Who has this line?
Na ngige ka Ngọzị gbasara ya.
Na ngige ka Ngọzị gbasara ya.
Ngọzị spread it on the line.