ébélébé
ebelebe
Word | ebelebe |
Definitions | Noun 1.extraordinary or incredible incident |
Related Terms | |
Word Stems | No word stems |
Examples
Ebelebe ga-egbu na mmemme ahụ.
Ebelebe ga-egbu na mmemme ahụ.
Extraordinary things will happen at that ceremony.
Ebelebe ga-egbu ma Emeka kpataa ego.
Ebelebe ga-egbu ma Emeka kpataa ego.
Incredible things will happen when Emeka makes money.
Ebelebe gburu ebe anyị gara taa.
Ebelebe gburu ebe anyị gara taa.
There was an incredible incident where we went to today.
Ebelebe na-egbu mgbe ọbụla Nọnso lọtara.
Ebelebe na-egbu mgbe ọbụla Nọnso lọtara.
Incredible things happen whenever Nonso comes back.
ébìghèèbì
ebìghèèbì
Word | ebìghèèbì |
Definitions | Noun 1.forever; forever and ever; everlasting |
Related Terms | |
Word Stems | No word stems |
Examples
Chineke na-adị ndụ ruo mgbe ebigheebi.
Chineke na-adị ndụ ruo mgbe ebigheebi.
God lives forever.
Achọrọ m ndụ ebigheebi.
Achọrọ m ndụ ebigheebi.
I want everlasting life.
Chukwu ebigheebi nara ekele m.
Chukwu ebigheebi nara ekele m.
Everlasting God receive my thanks.
Eze ị ga-adị ndụ ruo mgbe ebigheebi.
Eze ị ga-adị ndụ ruo mgbe ebigheebi.
The king shall live forever.
A ga-akpọ gị onye dị ngọzi ebegheebi.
A ga-akpọ gị onye dị ngọzi ebegheebi.
You will be called blessed forever.
Otito dịrị Chineke ebigheebi.
Otito dịrị Chineke ebigheebi.
Praise be to God forever.
ébìghìèbì
ebìghìèbì
Word | ebìghìèbì |
Definitions | Noun 1.unending; forever |
Related Term | |
Word Stem | No word stems |
Examples
Ọ ga-ata ahụhụ ruo ebighiebi.
Ọ ga-ata ahụhụ ruo ebighiebi.
He will suffer forever
Ị ga-adị ndụ ebighiebi.
Ị ga-adị ndụ ebighiebi.
You will live forever.
Chineke na-adị ndụ ruo ebighiebi.
Chineke na-adị ndụ ruo ebighiebi.
God lives forever.
Ihe ọma ga na-abịara m ruo ebighiebi.
Ihe ọma ga na-abịara m ruo ebighiebi.
Good things will be coming my way till forever.
Chineke ga-enye ndị ezi omume ndu ebighiebi.
Chineke ga-enye ndị ezi omume ndu ebighiebi.
God will give the righteous ones everlasting life.
Ndu ebighiebi abụghị maka mmadụ niile.
Ndu ebighiebi abụghị maka mmadụ niile.
Everlasting life is not for everybody.
Amara Onyenweanyị ga-anọnyere unu ruo ebighiebi.
Amara Onyenweanyị ga-anọnyere unu ruo ebighiebi.
The grace of our Lord will abide with you forever.
Ngọzị ya ga-abụ ebighiebi.
Ngọzị ya ga-abụ ebighiebi.
Her blessings will be unending.
Ihunanya dị n'etiti mmadụ abụọ ahụ bụ ebighiebi.
Ihunanya dị n'etiti mmadụ abụọ ahụ bụ ebighiebi.
The love between those two is unending.
Nwaanyị ahụ sị n'akpa a ga-adị ruo ebighiebi.
Nwaanyị ahụ sị n'akpa a ga-adị ruo ebighiebi.
That woman said that this bag will be everlasting.
ńjíńjí
njinji
Word | njinji |
Definitions | Noun 1.a surprising event 2.a sad event, terrible event |
Related Terms | |
Word Stems | No word stems |
Examples
Ha gwara ndị ntaakụkọ na njinji ahụ jiri n'ime abalị.
Ha gwara ndị ntaakụkọ na njinji ahụ jiri n'ime abalị.
They told journalists that the terrible event took place in the night.
Ọ nọ mgbe njinji ahụ jiri.
Ọ nọ mgbe njinji ahụ jiri.
She was there when the sad event took place.
Njinji ahụ jiri na ndụ ya metụtara enyi anyị.
Njinji ahụ jiri na ndụ ya metụtara enyi anyị.
The sad event that took place in his life affected our friendship.
Njinji jiri n'Ọnịcha taata.
Njinji jiri n'Ọnịcha taata.
A surprising event happened at Onitsha today.
Njinji na-ejikarị n'ụzọ a.
Njinji na-ejikarị n'ụzọ a.
Terrible things usually happen on this road.