Nkọwa okwu logo
Beta

òrírí

òriri

Wordòriri
Definitions

Noun

富概概

1.eating

2.feast; communion

Related Terms
Word Stems

Examples

Anyị na-aga oriri na be Nnamdị.

Anyị na-aga oriri na be Nnamdị.

We are going for a feast at Nnamdi's place.

Ha niile bụ ihe oriri

Ha niile bụ ihe oriri

All of them are edibles.

Ha niile bụ maka oriri.

Ha niile bụ maka oriri.

All of them are for eating.

Mgbe oriri ahụ gasịrị, ha lụrụ ọgụ.

Mgbe oriri ahụ gasịrị, ha lụrụ ọgụ.

When the feast ended, they fought.

Oriri karịrị akarị n' ọnwa a.

Oriri karịrị akarị n' ọnwa a.

There are many feasts this month.

Ọ zụtara ụgbaala ma kpọọ oriri.

Ọ zụtara ụgbaala ma kpọọ oriri.

He bouht a car and held a feast.

ríkwú

rikwu

Wordrikwu
Definitions

Active verb

1.eat more

Related Terms
Word Stems

Examples

Ọ na-erikwu nri n'abalị a maka gini?

Ọ na-erikwu nri n'abalị a maka gini?

Why is he eating more food this night.

Irikwu nri mgbe afọ juru m na-agwụ m ike.

Irikwu nri mgbe afọ juru m na-agwụ m ike.

To eat more food when I am filled weakens me.

Osikapa a fọrọ obere, Ị ga-erikwu ya.

Osikapa a fọrọ obere, Ị ga-erikwu ya.

This rice is remaining small, will you eat more?

Ha rikwuru nri mgbe ọ lara.

Ha rikwuru nri mgbe ọ lara.

They ate more when she left.

Rikwuo nri, maka ule gị.

Rikwuo nri, maka ule gị.

Eat more, because of your examination.

Emeka ga-erikwu nri a ma ọ bata.

Emeka ga-erikwu nri a ma ọ bata.

Emeka will eat more of this food if he comes back.

Achọghị m irikwu.

Achọghị m irikwu.

I don't want to eat more.

Anyị na-erikwu nri oge mmiri ahụ na-ezo.

Anyị na-erikwu nri oge mmiri ahụ na-ezo.

We were eating more food when it was raining.

rí ńrí

ri nrī

Wordri nrī
Definitions

Active verb

概猿

1.eat food

Related Terms
Word Stems

Examples

Ana m eri nri mgbe ị na-akpọ̣ m.

Ana m eri nri mgbe ị na-akpọ̣ m.

I was eating when you were calling me.

Bịa ka i rie nri gị.

Bịa ka i rie nri gị.

Come and eat your food.

Ha ga-eri nri n'ehihie.

Ha ga-eri nri n'ehihie.

They will eat food in the afternoon.

Amaka riri nri nwanne ya nwaanyị.

Amaka riri nri nwanne ya nwaanyị.

Amaka ate her sister's food.

ríkö

rikọ

Wordrikọ
Definitions

Active verb

1.eat together

Related Terms
Word Stems

Examples

Bịa ka anyị rikọọ nri a ọnụ.

Bịa ka anyị rikọọ nri a ọnụ.

Come let us eat this food together.

Ha achọghị irikọ nri ọnụ.

Ha achọghị irikọ nri ọnụ.

They do not want to eat together.

Irikọ nri na-amasị m.

Irikọ nri na-amasị m.

To eat together interests me.

Adakụ na Ugonna ga-erikọ ọnụ.

Adakụ na Ugonna ga-erikọ ọnụ.

Adakụ and Ugonna will eat together.

Mụ na ya na-erikọ n'otu okpokoro.

Mụ na ya na-erikọ n'otu okpokoro.

She and I are eating on the same table.

Ụmụ ya na-erikọ nri ọnụ.

Ụmụ ya na-erikọ nri ọnụ.

Her children eat together.

Ụmụnne irikọ nri na-adị mma.

Ụmụnne irikọ nri na-adị mma.

It is good for siblings to eat together.

Anyị rikọrọ osikapa ahụ.

Anyị rikọrọ osikapa ahụ.

We ate that rice together.

Unu rikọọ nri fọrọ ọnụ.

Unu rikọọ nri fọrọ ọnụ.

You all should eat the remaining food together.

lódà

lodà

Wordlodà
Definitions

Active verb

1.swallow; eat; devour

Related Term
Word Stem

Examples

Loda ya ozugbo

Loda ya ozugbo

Swallow it immediately.

Lodaa ọgwụ ahụ ngwa ngwa.

Lodaa ọgwụ ahụ ngwa ngwa.

Swallow that medicine fast fast.

Loda ya.

Loda ya.

Swallow it.

Nri ahụ ekweghị ya eloda.

Nri ahụ ekweghị ya eloda.

He is finding it difficult to swallow the food.

O ji nwayọ na-eloda mmanya ahụ dị n'ọnụ ya.

O ji nwayọ na-eloda mmanya ahụ dị n'ọnụ ya.

He is gradually swallowing the drink in his mouth.

Adaugo lodara nri niile ebunyere ya.

Adaugo lodara nri niile ebunyere ya.

Adaugo swallowed all the food that was given to her.

Ị chọrọ iloda ọgwụ ị kpụ n'ọnụ?

Ị chọrọ iloda ọgwụ ị kpụ n'ọnụ?

Do you want to swallow the medicine you have in your mouth.

ríjú áfö

riju afọ

Wordriju afọ
Definitions

Active verb

1.feed well; eat to satiety

Related Terms
Word Stems

Examples

Rijuo nri afọ ma i lọta akwụkwọ.

Rijuo nri afọ ma i lọta akwụkwọ.

Eat food to satiety when you return from studies.

Rijuo afọ tupu ị lawa.

Rijuo afọ tupu ị lawa.

Eat and fill your tommy before you leave.

Anaghị m eriju afọ.

Anaghị m eriju afọ.

I do not feed well.

Anyị ga-eriju afọ taa.

Anyị ga-eriju afọ taa.

We are going to fill our tommy today.

Ị chọrọ iriju afọ?

Ị chọrọ iriju afọ?

Do you want to fill your tommy?

Unu ga-eriju afo ugbua.

Unu ga-eriju afo ugbua.

You will eat to satiety now.

Ụmụ m na-eriju afọ.

Ụmụ m na-eriju afọ.

My children are feeding well.

M na-eriju afọ.

M na-eriju afọ.

I feed well.

Uche rijuru osikapa afọ taa.

Uche rijuru osikapa afọ taa.

Uche ate rice to his fill.

Iriju afọ dachie uzọ bụ ajọ omume.

Iriju afọ dachie uzọ bụ ajọ omume.

Eating to satiety and messing around is an abuse.

ríkárï

rikarị

Wordrikarị
Definitions

Active verb

1.eat more than another person

Related Term
Word Stem

Examples

Nnwa m rikariri ndị ọzọ.

Nnwa m rikariri ndị ọzọ.

My child ate more than the others.

O rikarịa gị, buru efere.

O rikarịa gị, buru efere.

If he eats more than you, carry the plate.

Ọ na-erikarị ndị ọzọ.

Ọ na-erikarị ndị ọzọ.

He eats more than the others.

Chiọma rikarịrị Ujunwa na nri.

Chiọma rikarịrị Ujunwa na nri.

Chiọma eats more than Ujunwa.

Nkechi ga-erikarị gị na nri.

Nkechi ga-erikarị gị na nri.

Nkechi will eat food more than you.

Aga m erikarị gị.

Aga m erikarị gị.

I will eat more than you.

Nwata a na-achọ irikari m na nri.

Nwata a na-achọ irikari m na nri.

This child wants to eat food more than me

rípų

ripụ̀

Wordripụ̀
Definitions

Active verb

1.devour; eat up; eat everything;

2.eat without wasting time

Related Terms
Word Stems

Examples

Ha achọghị iripụ ya

Ha achọghị iripụ ya

The do not want to eat it up.

Ọ ka mma iripụ ji ahụ.

Ọ ka mma iripụ ji ahụ.

It is better to finish eating the yam.

Onye ripụrụ nri ahụ?

Onye ripụrụ nri ahụ?

Who ate up the food?

Ị na-eripụ nri ọfụma.

Ị na-eripụ nri ọfụma.

You eat up food very well.

M na-eripụ ya ugbua.

M na-eripụ ya ugbua.

I am devouring it now.

Nwa ahụ ripụrụ nri ya ozugbo.

Nwa ahụ ripụrụ nri ya ozugbo.

That child devoured his food immediately.

Iripụ nri mgbe e butere ya ka mma.

Iripụ nri mgbe e butere ya ka mma.

To devour a food when it is served is the best.

Unu ripụ ya, gwa m.

Unu ripụ ya, gwa m.

If you eat it up, tell me.

Adakụ ga-eripụ ya ma ọ bata akwụkwọ.

Adakụ ga-eripụ ya ma ọ bata akwụkwọ.

Adaku will eat it up when she returns from school.

ríjú

riju

Wordriju
Definitions

Active verb

1.to eat to fill; satisfied with meal

Related Terms
Word Stems

Examples

M ga-eriju nri a ma nne m lọta.

M ga-eriju nri a ma nne m lọta.

I will eat this food to my fill when my mother comes back.

Iriju afọ dachie ụzọ bụ nsogbu.

Iriju afọ dachie ụzọ bụ nsogbu.

To eat to one's fill and fall apart on the road is a big problem.

E rijuru m osikapa afọ n'ụlọ nwanne m.

E rijuru m osikapa afọ n'ụlọ nwanne m.

I ate rice to my satisfaction at my sibling's house.

Ajụ agụghị ya makana o rijuru afọ n' ụtụtụ.

Ajụ agụghị ya makana o rijuru afọ n' ụtụtụ.

She was not hungry because she ate to her satisfaction in the morning.

Nwa a anaghị eriju eriju.

Nwa a anaghị eriju eriju.

This child does not get satisfied while eating.

Rijuo afọ gị ugbua tupu m gawa ahịa.

Rijuo afọ gị ugbua tupu m gawa ahịa.

Eat to your fill now before I leave for the market.

rí

ri

Wordri
Definitions

Active verb

1.consume; eat, especially as a meal

2.engulf; take or accommodate all of something

3.overwhelm

4.cheat

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

Ha ga-eri nri ma e mechaa.

Ha ga-eri nri ma e mechaa.

They will eat later.

Ụsakụsa rie ogwumagana ọ kwụsị iri anụ

Ụsakụsa rie ogwumagana ọ kwụsị iri anụ

When the glutton eats the chameleon, he would stop eating meat

Anyị riri nri n'ụtụtụ.

Anyị riri nri n'ụtụtụ.

We ate in the morning.

Kelechi na-eri nri ugbu a.

Kelechi na-eri nri ugbu a.

Kelechi is eating now.

Ejike riri anyị mugu.

Ejike riri anyị mugu.

Ejike duped/cheated us.

Iri nri n'ụlọ ka mma karịa iri nri n'iro.

Iri nri n'ụlọ ka mma karịa iri nri n'iro.

Eating at home is better than eating outside

Ọ chọghị iri nri.

Ọ chọghị iri nri.

He does not want to eat.

Nkọwa okwu logo

Learning Igbo made easy, free, and accessible.

Join our mailing list

© 2025 Nkọwa okwu 501(c)(3). All rights reserved.