dózí
dozi
Word | dozi |
Definitions | Active verb 1.keep well or properly 2.fix; repair; arrange; settle; put right a situation or thing |
Related Terms | |
Word Stems |
Examples
Aga m edozi akwa m ka ọ ghara ịma ebu.
Aga m edozi akwa m ka ọ ghara ịma ebu.
I will keep my cloths properly so that it won't grow fungi molds.
Edoziri m ololo ahụ ka ọ ghara ịda.
Edoziri m ololo ahụ ka ọ ghara ịda.
I kept that bottle well so that it does not fall.
Achọrọ m idozi akpa m.
Achọrọ m idozi akpa m.
I want to repair my bag.
Idozi akpụkpụ ụkwụ ahụ rara m ahụ.
Idozi akpụkpụ ụkwụ ahụ rara m ahụ.
To repair that footwear was very difficult for me.
Ọ na-edozi igwe ya.
Ọ na-edozi igwe ya.
He is repairing his bicycle.
Dozie akwa gị.
Dozie akwa gị.
Arrange your bed.
Ọ kwa m na-edozi, ị na-aghasa.
Ọ kwa m na-edozi, ị na-aghasa.
So if I am arranging, you will be scattering.
Nna m ga-edozi ụgbọala ya mebiri emebi.
Nna m ga-edozi ụgbọala ya mebiri emebi.
My father will repair his spoilt car.
Ọ gara idozi moto ya.
Ọ gara idozi moto ya.
He went to repair his car.
Nna m ga-edozi ekwentị anyị.
Nna m ga-edozi ekwentị anyị.
My father will repair our mobile phone.
Kpọọ onye ga-edozi aka ụzọ a.
Kpọọ onye ga-edozi aka ụzọ a.
Call someone that will repair this door handle.
Enyi m abụọ doziri okwu na-esere ha ụnyaahụ.
Enyi m abụọ doziri okwu na-esere ha ụnyaahụ.
My two friends settled their quarrel yesterday.
Ọ na-edozi ngwaahịa ya.
Ọ na-edozi ngwaahịa ya.
He is arranging his products.
Dozie aka ụzọ a.
Dozie aka ụzọ a.
Repair this door handle.
Achọrọ m idozi oche m mebiri emebi.
Achọrọ m idozi oche m mebiri emebi.
I want to repair my broken chair.
Ụkọchukwu ụfọdụ na-edozi ikpe dị n'etiti di na nwunye.
Ụkọchukwu ụfọdụ na-edozi ikpe dị n'etiti di na nwunye.
Some priests settle disputes between husbands and wife'.
Dozie ụlọ ahụ tupu ị pụọ.
Dozie ụlọ ahụ tupu ị pụọ.
Arrange the house before you leave.
Idozi okwu ahụ rara ahụ.
Idozi okwu ahụ rara ahụ.
To settle that dispute was difficult.
dóbé
dobe
Word | dobe |
Definitions | Active verb 1.place something; keep; place |
Related Terms | |
Word Stems |
Examples
Idobe ekwentị m ebe a na-atụ m ụjọ.
Idobe ekwentị m ebe a na-atụ m ụjọ.
I am afraid to keep my mobile phone here.
Ebee ka m ga-edobe akwa a?
Ebee ka m ga-edobe akwa a?
Where will i keep this clothe?
O dobere ego ahụ n'elu ụgbaala ọcha ahụ.
O dobere ego ahụ n'elu ụgbaala ọcha ahụ.
He dropped the money on that white car.
Dobe ego gị.
Dobe ego gị.
Keep your money.
O dobere efere ahụ n’elu oche.
O dobere efere ahụ n’elu oche.
Drop this plate on the chair.
Aga m edobe nkwa m.
Aga m edobe nkwa m.
I will continue keeping my promise.
M na-edobe ego ebe a oge niile.
M na-edobe ego ebe a oge niile.
I keep money here all the time.
Dobe efere a n’elu oche.
Dobe efere a n’elu oche.
Drop this plate on the chair.