Nkọwa okwu logo
Beta

tá

ta

Wordta
Definitions

Active verb

1.chew

2.bite

3.eat, especially snacks and chewy edibles

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

Ọ̣ na-adị mma ịta nri nke ọma tupu e loo ya.

Ọ̣ na-adị mma ịta nri nke ọma tupu e loo ya.

It is good to chew food properly before it's swallowed.

Achọghị m ịta nke ahụ.

Achọghị m ịta nke ahụ.

I don't want to chew that one.

Ọ tara ya arụ na ntị.

Ọ tara ya arụ na ntị.

He bite him on the ear.

Taa ya ma ọbụrụ na ị naghị atụ ụjọ.

Taa ya ma ọbụrụ na ị naghị atụ ụjọ.

Bite it if you are not scared.

Ọ na-ata ọka mgbe m hụrụ ya.

Ọ na-ata ọka mgbe m hụrụ ya.

He was chewing corn when I saw him.

tá ųzá

ta ụ̀za

Wordta ụ̀za
Definitions

Active verb

1.ruminate; chew the cud (a ruminant animal)

Related Terms
Word Stems

Examples

Ọtụtụ anụ na-enye nwa ara na-ata ụza.

Ọtụtụ anụ na-enye nwa ara na-ata ụza.

Many animals that eat grass do ruminate.

Ewu ga-ata ụza.

Ewu ga-ata ụza.

The goat will ruminate.

Ewu ahụ tara ụza abalị niile.

Ewu ahụ tara ụza abalị niile.

The goat chewed cud all night.

Mmadụ anaghị ata ụza.

Mmadụ anaghị ata ụza.

Humans don't chew cud.

Ewu a na-ata ụza

Ewu a na-ata ụza

This goat is chewing cud

Ehi m na-atakarị ụza n'abalị.

Ehi m na-atakarị ụza n'abalị.

My cow usually chew cud at night.

Kedụ anụ ndị na-ata ụza?

Kedụ anụ ndị na-ata ụza?

Which animals chew cud?

Depụta anụ ise na-ata ụza.

Depụta anụ ise na-ata ụza.

List five animals that chew cud.

Nkịta, ọ na-ata ụza?

Nkịta, ọ na-ata ụza?

Do dogs chew cud?

tá átü

ta atụ̄

Wordta atụ̄
Definitions

Active verb

1.chew stick, brush one's mouth

Related Terms
Word Stems

Examples

Ekene tara atụ n'ụtụtụ.

Ekene tara atụ n'ụtụtụ.

Ekene brushed in the morning.

Ị tara atụ n'ụtụtụ a?

Ị tara atụ n'ụtụtụ a?

Did you brush your mouth this morning?

Ị chọrọ ịta atụ?

Ị chọrọ ịta atụ?

Do you want to brush?

Eji m ncha eze ata atụ.

Eji m ncha eze ata atụ.

I brush with toothpaste.

Uche anaghị ata atụ.

Uche anaghị ata atụ.

Uche dose not brush.

Obinna na-ata atụ n'iro.

Obinna na-ata atụ n'iro.

Obinna is brushing his teeth outside.

Taa atụ tupu i jebe.

Taa atụ tupu i jebe.

Brush your teeth before leaving

ézé

eze

Wordeze
Definitions

Noun

1.teeth; the organ (bone) used for chewing, especially by humans and mammals

Related Terms
Word Stems

No word stems

Examples

Eze ka e ji ata ọka.

Eze ka e ji ata ọka.

Corn is eaten with the teeth.

Metụ eze m aka.

Metụ eze m aka.

Touch my teeth.

Anyị na-eji eze ata nri.

Anyị na-eji eze ata nri.

We use the teeth to chew.

Eze m dị iri atọ na abụọ.

Eze m dị iri atọ na abụọ.

My teeth are thirty two.

Nwata ahụ nwere eze abụọ sọọsọ.

Nwata ahụ nwere eze abụọ sọọsọ.

That baby has two teeth only.

Kedụ mgbe eze gị dapụrụ.

Kedụ mgbe eze gị dapụrụ.

When did your teeth fall off.

Eze anyị dị ọcha.

Eze anyị dị ọcha.

Our teeth are white.

M ga-asa ya eze.

M ga-asa ya eze.

I will brush his teeth.

Gosi m eze nkịta ahụ.

Gosi m eze nkịta ahụ.

Show me the dog's teeth.

ǹtàǹtá

ǹtàǹta

Wordǹtàǹta
Definitions

Noun

1.(colloquial) stretchy and chewy edibles, especially meat and chewing gum

2.sensor name for penis, especially used for kids

Related Terms

No related terms

Word Stems

Examples

Wepụ aka na ntanta gị.

Wepụ aka na ntanta gị.

Remove your hand from your penis.

Ị ga-ata ntanta?

Ị ga-ata ntanta?

Would you eat meat?

átü

atụ

Wordatụ
Definitions

Noun

1.chewing stick; a stick chewed to form brush at the tip and used for cleaning the teeth

2.the concept of cleaning the teeth, especially as a routine

Related Term
Word Stem

No word stems

Examples

Atụ a bụ nke Emeka.

Atụ a bụ nke Emeka.

This chewing stick is for Emeka.

Atụ ahụ na-elu ilu.

Atụ ahụ na-elu ilu.

That chewing stick tastes bitter.

Biko, zụtara m atụ n'ahịa.

Biko, zụtara m atụ n'ahịa.

Please buy chewing stick for me at the market.

I nwere atụ?

I nwere atụ?

Do you have chewing stick?

Ọ na-ata atụ.

Ọ na-ata atụ.

She is brushing/

Onye nwe atụ ahụ dị n'elu okpokolo?

Onye nwe atụ ahụ dị n'elu okpokolo?

Who has the chewing stick on the table?

Jiri atụ ahụ kpụchaa ire gị.

Jiri atụ ahụ kpụchaa ire gị.

Use that chewing stick to clean your tongue.

Atụ osisi ka m chọrọ.

Atụ osisi ka m chọrọ.

I want chewing stick.

E ji osisi onugbu eme atụ.

E ji osisi onugbu eme atụ.

Onugbu stiick could be used as chewing stick.

Nkọwa okwu logo

Learning Igbo made easy, free, and accessible.

Join our mailing list

© 2026 Nkọwa okwu 501(c)(3). All rights reserved.