bų ábų
bụ̀ abụ̀
Word | bụ̀ abụ̀ |
Definitions | Active verb 蛍寀蛍 1.sing (especially a slow song) |
Related Terms | |
Word Stems |
Examples
Achọghị m ịbụ ogologo abụ.
Achọghị m ịbụ ogologo abụ.
I do not want to sing a long hymn.
Anyị bụrụ abụ mgbe anyị bidoro.
Anyị bụrụ abụ mgbe anyị bidoro.
We sang a song when we started.
Ha na-abụ abụ mgbe m bịara.
Ha na-abụ abụ mgbe m bịara.
They were singing when I came.
Emeka amaghị abụ abụ.
Emeka amaghị abụ abụ.
Emeka does not know how to sing.
Ọ na-amasị m ịbụ abụ otito.
Ọ na-amasị m ịbụ abụ otito.
I like singing praise songs.
Chika ga-abụ abụ ahụ ma ọ bata.
Chika ga-abụ abụ ahụ ma ọ bata.
Chika will sing that song when she comes back.
Achọghị m ịbụ abụ.
Achọghị m ịbụ abụ.
I do not want to sing.
Ụkọchukwu ga-abụ abụ ekpere.
Ụkọchukwu ga-abụ abụ ekpere.
The priest will sing the hymn for prayer.
Gaa, bụọ abụ.
Gaa, bụọ abụ.
Go and sing.
Ọ dị mma ịbụ abụ.
Ọ dị mma ịbụ abụ.
It is good to sing.
Onye bụrụ abụ a?
Onye bụrụ abụ a?
Who sang this song?
gü égwú
gụ egwū
Word | gụ egwū |
Definitions | Active verb 1.to sing |
Related Terms | |
Word Stems |
Examples
Nkechi gụrụ egwu ebe a n'ụtụtụ.
Nkechi gụrụ egwu ebe a n'ụtụtụ.
Nkechi sang here in the morning,
Kedu ihe mere ụnụ ji agụ egwu ahụ?
Kedu ihe mere ụnụ ji agụ egwu ahụ?
Why are you people singing that song?
Kpọtara anyị onye ga-agụ egwu ebe a.
Kpọtara anyị onye ga-agụ egwu ebe a.
Fetch us someone that will sing here.
Achọrọ m ịgụ egwu.
Achọrọ m ịgụ egwu.
I want to sing.
Nwaanyị a na-agụ egwu nke ọma.
Nwaanyị a na-agụ egwu nke ọma.
This lady sings well.
Anyị ga-agụ egwu tupu anyị ebido.
Anyị ga-agụ egwu tupu anyị ebido.
We will sing a song before we start.
Kpọọ ya ka ọ gụọ egwu.
Kpọọ ya ka ọ gụọ egwu.
Call him to sing.
Ọ na-agụ egwu ahụ ugbua.
Ọ na-agụ egwu ahụ ugbua.
He is singing that song now.
Gụọ egwu a nkeọma.
Gụọ egwu a nkeọma.
Sing this song properly.
Ha gụrụ ọtụtụ egwu taata.
Ha gụrụ ọtụtụ egwu taata.
They sang many songs today.
Anyị ga-agụ egwu na mmemme ahụ.
Anyị ga-agụ egwu na mmemme ahụ.
We will sing in that ceremony.
Ha na-agụ egwu mgbe m rutere ebe ahụ.
Ha na-agụ egwu mgbe m rutere ebe ahụ.
They were singing when i got to that place.
Ọ na-agụ egwu nke ukwuu.
Ọ na-agụ egwu nke ukwuu.
She sings a lot.
Ịgụ egwu na-amasị m.
Ịgụ egwu na-amasị m.
I like singing.
Gịnị mere o ji agụ egwu etu ahụ?
Gịnị mere o ji agụ egwu etu ahụ?
Why does he sing like that?