àkpàtìózú
àkpàtìozū
| Word | àkpàtìozū |
| Definitions | Noun 謙俺 1.the box or case in which the body of a dead person is placed for burial; casket; coffin |
| Variations | àkpàtì ozū |
| Related Terms | |
| Word Stems |
Examples
Akpatiozu na-adazikwa ọnụ ugbua.
Akpatiozu na-adazikwa ọnụ ugbua.
Coffins are actually expensive now.
Ndị Alakụba anaghị eji akpatiozu eli mmadụ.
Ndị Alakụba anaghị eji akpatiozu eli mmadụ.
Muslims do not bury the dead with a coffin.
Ọ bụ ịzụ ahịa akpatịozu ka o ji baa ogaranya.
Ọ bụ ịzụ ahịa akpatịozu ka o ji baa ogaranya.
He became wealthy from trading on coffins.
ìgbé
ìgbe
| Word | ìgbe |
| Definitions | Noun 㪅 1.bow; box; casket |
| Related Terms | |
| Word Stems | No word stems |
Examples
Ha rere igbe ahụ okeọnụ.
Ha rere igbe ahụ okeọnụ.
They sold that casket at a high cost.
Ozu ahụ nọ n'igbe.
Ozu ahụ nọ n'igbe.
The corpse is in the casket.
Ndị Igbo na-eji igbe eli onye nwụrụ anwụ.
Ndị Igbo na-eji igbe eli onye nwụrụ anwụ.
The Igbo people bury the dead using a casket.
Ihe a bụ osisi eji arụ igbe.
Ihe a bụ osisi eji arụ igbe.
This wood is used for making bow.
Igbe ahụ abanyebeghị n'ili.
Igbe ahụ abanyebeghị n'ili.
That casket has not been lowered in the grave.
ḿkpǫ
mkpọ̀
| Word | mkpọ̀ |
| Definitions | Noun 愁 1.small box; can; container; tin |
| Related Terms | |
| Word Stems | No word stems |
Examples
Biko, zụtara m mmiriareehi dị na mkpọ.
Biko, zụtara m mmiriareehi dị na mkpọ.
Please buy me tin milk.
Otu mkpọ sịga dịzikwa oke ọnụahịa ugbua.
Otu mkpọ sịga dịzikwa oke ọnụahịa ugbua.
A box of cigarette is, actually, expensive now.
Ọgwụ ndị ahụ dịcha na mkpọ na mkpọ.
Ọgwụ ndị ahụ dịcha na mkpọ na mkpọ.
The drugs are in cans.
Achọrọ m mkpọ m ga-eji gbaa mmanụ.
Achọrọ m mkpọ m ga-eji gbaa mmanụ.
I need a container to pour oil.
sú ökpö
su ọ̄kpọ̄
| Word | su ọ̄kpọ̄ |
| Definitions | Active verb 1.punch; box |
| Related Terms | |
| Word Stems |
Examples
Emeka ga-esu gị ọkpọ ma iwe wee ya.
Emeka ga-esu gị ọkpọ ma iwe wee ya.
Emeka will punch you if he gets angry.
Suo ya ọkpọ, ka ọ kwusị ihe ahụ.
Suo ya ọkpọ, ka ọ kwusị ihe ahụ.
Punch him, let him stop that.
Ọ dịghị mma isu mmadụ ọkpọ.
Ọ dịghị mma isu mmadụ ọkpọ.
It is not good to hit somebody.
Okey na-achọ isu m ọkpọ.
Okey na-achọ isu m ọkpọ.
Okey wants to hit me.
Onye suru gị ọkpọ?
Onye suru gị ọkpọ?
Who hit you?
Onyenkụzi anyị na-esu onye ọbụla dara ajụjụ ya ọkpọ.
Onyenkụzi anyị na-esu onye ọbụla dara ajụjụ ya ọkpọ.
Our teacher punches anyone who fails his questions.
Obi na-esu nwata ahụ ọkpọ mgbe m hụrụ ha.
Obi na-esu nwata ahụ ọkpọ mgbe m hụrụ ha.
Obi was punching that child when I saw them.
ákpàtį
akpàtị̀
| Word | akpàtị̀ |
| Definitions | Noun 謙 1.luggage; box |
| Related Terms | |
| Word Stems | No word stems |
Examples
Akpati akwa m buru ibu.
Akpati akwa m buru ibu.
My clothes box is big.
Ejighị m akpatị ahụ mee njem.
Ejighị m akpatị ahụ mee njem.
I did not travel with that luggage.
Nne m zụtara akpatị ọhụrụ.
Nne m zụtara akpatị ọhụrụ.
My mother bought a new box.
Nna m na-ere akpati.
Nna m na-ere akpati.
My father sells boxes.
Ndụka na-ere akpatị dị iche iche n'ahịa.
Ndụka na-ere akpatị dị iche iche n'ahịa.
Ndụka sells different types of luggage at the market.
ḿkpó ánwųrų
mkpo anwụ̀rụ̀
| Word | mkpo anwụ̀rụ̀ |
| Definitions | Noun 1.snuffbox 2.snuff-box |
| Related Terms | |
| Word Stems |
Examples
Azụtara m mkpo anwụrụ ọhụrụ.
Azụtara m mkpo anwụrụ ọhụrụ.
I bought a new snuffbox.
Mkpo anwụrụ m na-eji oji.
Mkpo anwụrụ m na-eji oji.
My snuffbox is black in colour.
E nweghị ihe fọrọ na mkpo anwụrụ a.
E nweghị ihe fọrọ na mkpo anwụrụ a.
There's nothing remaining in the snuffbox.
Ọ zụrụ mkpọ anwụrụ ọhụrụ.
Ọ zụrụ mkpọ anwụrụ ọhụrụ.
He bought a new snuff box.
Ego ole ka Ị na-ere mkpo anwụrụ a?
Ego ole ka Ị na-ere mkpo anwụrụ a?
How much do you sell this snuffbox?
Wetara m mkpo anwụrụ m.
Wetara m mkpo anwụrụ m.
Get me my snuffbox.
kü ǫkpö
kụ ọ̀kpọ
| Word | kụ ọ̀kpọ |
| Definitions | Active verb 正課 1.box; strike with fist 2.knock on the head using the knuckles |
| Related Terms | |
| Word Stems |
Examples
Ada kụrụ m ọkpọ.
Ada kụrụ m ọkpọ.
Ada punched me.
Amadị na-akụ nwunye ya ọkpọ oge ọbụla.
Amadị na-akụ nwunye ya ọkpọ oge ọbụla.
Amadi punches his wife all the time.
Ọ chọ ịkụ nwanne ya nwaanyị ọkpọ.
Ọ chọ ịkụ nwanne ya nwaanyị ọkpọ.
He wants to punch his sister.
Kụọ ya ọkpọ ka ọ hapụ gị.
Kụọ ya ọkpọ ka ọ hapụ gị.
Punch him let him leave you alone.
Obi ga-akụ gị ọkpọ ma ị kpasuo ya iwe.
Obi ga-akụ gị ọkpọ ma ị kpasuo ya iwe.
Obi will hit you if you get him angry.
ǫkųųtábà
ọ̀kụ̀ụ̀tabà
| Word | ọ̀kụ̀ụ̀tabà |
| Definitions | Noun 1.tobacco pipe; snuff-box |
| Variations | ọ̀kụ̀ ụtabà |
| Related Term | |
| Word Stem |
Examples
Maazị Ibekwe chefuru ọkụụtaba ya n'ugbo.
Maazị Ibekwe chefuru ọkụụtaba ya n'ugbo.
Mr. Ibekwe forgot his snuff-box in the farm.
Nna m nwere ọkụụtaba.
Nna m nwere ọkụụtaba.
My father has a snuff-box.
Ọkụụtaba ya na-efu efu.
Ọkụụtaba ya na-efu efu.
His snuff-box is missing.
Onye nwe ọkụụtaba a?
Onye nwe ọkụụtaba a?
Who has this snuff-box?
kwàsï
kwàsị
| Word | kwàsị |
| Definitions | Active verb 1.unpack items from something like bag, sack, box, trunk of a car |
| Related Term | |
| Word Stem | No word stems |
Examples
Uchenna maara akwasị akpa.
Uchenna maara akwasị akpa.
Uchenna knows how to unpack a bag.
Achọrọ m ịkwasị akpa m.
Achọrọ m ịkwasị akpa m.
I want to unpack my bag.
Obinna kwasịrị akpa ya ozigbo ọ lọtara.
Obinna kwasịrị akpa ya ozigbo ọ lọtara.
Obinna unpacked his bag immediately he returned.
Ọ bụ onye kwasịrị akpa m?
Ọ bụ onye kwasịrị akpa m?
Who unpacked my bag?
Onye ga-akwasị akpa ahụ anọghị.
Onye ga-akwasị akpa ahụ anọghị.
The person that will unpack the bag is not around.
Gwa Ndụka kwasịa akpa m bu lọta.
Gwa Ndụka kwasịa akpa m bu lọta.
Tell Ndụka to unpack the bag I returned with.
Kedụ ebe ị nọ kwasịa akpa m?
Kedụ ebe ị nọ kwasịa akpa m?
Where did you unpack my bag?
Onye na-akwasị igbe m?
Onye na-akwasị igbe m?
Who is unpacking my box?
Kedụ akpa m ga-akwasị?
Kedụ akpa m ga-akwasị?
Which bag will I unpack?