Nkọwa okwu logo
Beta

kpáchàpų ányá

kpachàpụ̀ anyā

Wordkpachàpụ̀ anyā
Definitions

Active verb

1.take care; be careful, vigilant

Related Terms
Word Stems

Examples

Amechi na-akpachapụrụ ihe ya anya.

Amechi na-akpachapụrụ ihe ya anya.

Amechi is careful with his things.

Ị ga-akpachapụ anya maka mgbe ọzọ.

Ị ga-akpachapụ anya maka mgbe ọzọ.

You have to be careful incase of next time.

Ịkpachapụ anya dị mma.

Ịkpachapụ anya dị mma.

Being careful is good.

Ọ bụrụ na ịkpachapụ anya, ị ga-eme nke ọma n'azụmahịa gị.

Ọ bụrụ na ịkpachapụ anya, ị ga-eme nke ọma n'azụmahịa gị.

If you are careful, you will do well in your business.

Nnenna na-akpachapụrụ ụmụ ya anya.

Nnenna na-akpachapụrụ ụmụ ya anya.

Nnenna takes care of her children.

Kpachapụ anya ma i ruo ebe ahụ.

Kpachapụ anya ma i ruo ebe ahụ.

Be careful when you get there.

Ọ naghị akpachapụ anya.

Ọ naghị akpachapụ anya.

He is not careful.

Ndị nne kwesịrị ịdị na-akpachapụ anya.

Ndị nne kwesịrị ịdị na-akpachapụ anya.

Mothers are supposed to be careful.

Achọrọ m onye na-akpachapụ anya.

Achọrọ m onye na-akpachapụ anya.

I need a carful person.

Ọ kpachapụrụ anya mgbe ọ na-eme.

Ọ kpachapụrụ anya mgbe ọ na-eme.

She was careful when she was doing it.

Nwunye ga-akpachapụ anya mee ya.

Nwunye ga-akpachapụ anya mee ya.

His wife will do it carefully.

lézí ányá

lezi anya

Wordlezi anya
Definitions

Active verb

1.be careful

2.take care (goodbye); take good care of

Related Terms
Word Stems

Examples

Ha bụ ndị ọrụ na-elezi anya.

Ha bụ ndị ọrụ na-elezi anya.

They are workers that are careful.

Anyị na-elezi anya maka ndị agboro.

Anyị na-elezi anya maka ndị agboro.

We are being careful due to the touts.

Lezie anya ka ị ghara ịba n'ọnwụnwa.

Lezie anya ka ị ghara ịba n'ọnwụnwa.

Be careful so that you don't fall into temptation.

Achọrọ m ilezi anya ka m ghara ịba na nsogbu.

Achọrọ m ilezi anya ka m ghara ịba na nsogbu.

I want to be careful so that I don't fall into trouble.

Ngwanụ lezie anya.

Ngwanụ lezie anya.

Okay goodbye.

Unu ga-elezi anya ka unu ghara isupịa ụgbọala unu.

Unu ga-elezi anya ka unu ghara isupịa ụgbọala unu.

You guys will be careful so you don't crash your car.

E leziri m anya oge m nọ n'ụlọakwụkwọ ka m ghara ịda ule.

E leziri m anya oge m nọ n'ụlọakwụkwọ ka m ghara ịda ule.

I was careful when i was in school so that i don't fail an examination.

O leziri nnwa m anya.

O leziri nnwa m anya.

She took good care of my child.

Adaugo, lezie anya!

Adaugo, lezie anya!

Adaugo, take care!

Ana m elezi anya n'ihe niile m na-eme.

Ana m elezi anya n'ihe niile m na-eme.

I am always careful in everything I do.

Ha ga-elezi anya.

Ha ga-elezi anya.

They will be careful.

Unu kwesịrị ilezi anya.

Unu kwesịrị ilezi anya.

You are supposed to be careful.

Ọ na-elezi anya.

Ọ na-elezi anya.

He is being careful.

kpáchá ányá

kpacha anyā

Wordkpacha anyā
Definitions

Active verb

乱選目

1.do on purpose or deliberately; do with clear eyes

Active verb

乱選目

1.Be careful (especially as a way of warning)

Related Term
Word Stem

Examples

Ọ na-akpacha anya eme ya.

Ọ na-akpacha anya eme ya.

She does it deliberately.

Ị ga-akpacha anya n'ihe ọbụla ị na-eme.

Ị ga-akpacha anya n'ihe ọbụla ị na-eme.

You will be careful in whatever thing you are doing.

Ngọzị kpachara anya sie nri ahụ.

Ngọzị kpachara anya sie nri ahụ.

Ngọzị carefully cooked that food.

Ugo, kpachaa anya.

Ugo, kpachaa anya.

Ugo, be careful.

Ọ na-akpacha anya eti m ihe.

Ọ na-akpacha anya eti m ihe.

He deliberately hits me.

Ọ na-akpacha anya eme ihe.

Ọ na-akpacha anya eme ihe.

She does things carefully.

Kpachaa anya kụọ ọka a.

Kpachaa anya kụọ ọka a.

Carefully plant these corns.

Ọ ga-akpacha anya dozie ya.

Ọ ga-akpacha anya dozie ya.

He will carefully arrange it.

Ịkpacha anya me ihe ọjọọ adịghị mma.

Ịkpacha anya me ihe ọjọọ adịghị mma.

Doing evil deliberately is not good.

Ịkpacha anya mebie ihe mmadụ adịghị mma.

Ịkpacha anya mebie ihe mmadụ adịghị mma.

Deliberate destruction of somebody's item is not proper.

Ọ kpachara anya gba nkịtị.

Ọ kpachara anya gba nkịtị.

He deliberately kept quiet.

Onye na-akpacha anya esi nri?

Onye na-akpacha anya esi nri?

Who cooks food deliberately?

kpàchàrà ányá

kpàchàrà anya

Wordkpàchàrà anya
Definitions

Active verb

1.be cautious; be careful, be warned; beware; take heed

Related Terms
Word Stems

Examples

Ezinne, kpachara anya!

Ezinne, kpachara anya!

Ezinne, be careful!

Ọ na-akpachara anya oge niile.

Ọ na-akpachara anya oge niile.

He is always careful.

Ịkpachara anya dị oke mkpa ugbu a.

Ịkpachara anya dị oke mkpa ugbu a.

To be careful is very important now.

Onye ka ị sịrị kpachara anya?

Onye ka ị sịrị kpachara anya?

Whom did you tell to be careful?

Kedụ ndị a gwara kpachara anya?

Kedụ ndị a gwara kpachara anya?

Which people were told to be careful.

Anyị kwesịrị ịkpachara anya.

Anyị kwesịrị ịkpachara anya.

We need to be careful.

Ị ga-akpachara anya ka ị ghara ịbanye na nsogbu.

Ị ga-akpachara anya ka ị ghara ịbanye na nsogbu.

You have to take heed so that you don't get into trouble.

Onye na-akpachara anya anaghị abanyekarị na nsogbu.

Onye na-akpachara anya anaghị abanyekarị na nsogbu.

A careful person do not usually enter into trouble.

Kpachara anya gị ebe m nọ.

Kpachara anya gị ebe m nọ.

Be careful with me.

lérú ányá

leru anyā

Wordleru anyā
Definitions

Active verb

1.Be watchful; be careful

2.Look into something e.g an issue; deliberate on

Related Terms
Word Stems

Examples

Ọ ga-adị mkpa ka anyị leruo okwu a anya ọzọ.

Ọ ga-adị mkpa ka anyị leruo okwu a anya ọzọ.

It will be important that we look into this matter again.

Anyị leruru okwu ahụ anya.

Anyị leruru okwu ahụ anya.

We deliberated on that issue.

Ụjọ atụla gị, anyị ga-eleru anya n'ihe kwuru.

Ụjọ atụla gị, anyị ga-eleru anya n'ihe kwuru.

Don't be afraid, we will look into what he said.

Ileru anya ebe a dịkwa oke mkpa.

Ileru anya ebe a dịkwa oke mkpa.

To be careful here is very important

Leruo anya!

Leruo anya!

Be careful.

Ọ ga-adị mkpa ka anyị leruo n'okwu a anya ọzọ.

Ọ ga-adị mkpa ka anyị leruo n'okwu a anya ọzọ.

It will be important for us to look into that issue again.

Kedụ ndị leruru ya anya?

Kedụ ndị leruru ya anya?

Which people investigated it?

Ileru anya n'ihe mere taa dịkwa oke mkpa.

Ileru anya n'ihe mere taa dịkwa oke mkpa.

To look into what happened today is very important.

Anyị ga-eleru anya n'okwu ahụ.

Anyị ga-eleru anya n'okwu ahụ.

We will look into that matter.

Leruo anya!

Leruo anya!

Be watchful

Ụmụnne m na-eleru anya n'okwu ala ahụ mgbe m bịara.

Ụmụnne m na-eleru anya n'okwu ala ahụ mgbe m bịara.

My siblings were deliberating on that land issue when I came.

Anyị leruru anya n'okwu ya ahụ.

Anyị leruru anya n'okwu ya ahụ.

We looked into that his matter.

Ụmụnne m na-eleru anya n'okwu ala ahụ mgbe m bịara.

Ụmụnne m na-eleru anya n'okwu ala ahụ mgbe m bịara.

My siblings were deliberating on that land issue when I came.

Nne ga-eleru ya anya etu o kwesịrị.

Nne ga-eleru ya anya etu o kwesịrị.

Mother will investigate it as it should.

Nkọwa okwu logo

Learning Igbo made easy, free, and accessible.

Join our mailing list

© 2025 Nkọwa okwu 501(c)(3). All rights reserved.