kwúlù
kwulù
Word | kwulù |
Definitions | Active verb 1.blaspheme; revile; speak/talk againstsomebody |
Related Term | |
Word Stem |
Examples
Ọ ma ekwulu mmadụ.
Ọ ma ekwulu mmadụ.
He knows how to blaspheme against somebody.
Onye kwuluru nna ya.
Onye kwuluru nna ya.
Who blasphemed against his father?
Ị chọrọ ikwulu m?
Ị chọrọ ikwulu m?
Do you want to blaspheme me?
Ikwulu mmadụ adịghị mma.
Ikwulu mmadụ adịghị mma.
Blaspheming against somebody is bad.
Ị na-ekwulu Chineke.
Ị na-ekwulu Chineke.
You are blaspheming against God.
Ha bụ ndị nkwulu.
Ha bụ ndị nkwulu.
The are blasphemists.
Ndị ụka chọrọ ka m kwuluo arụsị obodo anyị.
Ndị ụka chọrọ ka m kwuluo arụsị obodo anyị.
The church wants me to blaspheme against our town's idols.
Mmehie m bụ na e kwuluru m Chineke
Mmehie m bụ na e kwuluru m Chineke
My sin is that I blasphemed against God
Ị ga-ekwulu Chineke?
Ị ga-ekwulu Chineke?
Would you blaspheme against God.
Achọghị m ikwulu Chineke.
Achọghị m ikwulu Chineke.
I do not want to blaspheme God.
köchá
kọcha
Word | kọcha |
Definitions | Active verb 1.defame; revile; curse |
Related Term | |
Word Stem |
Examples
Anyị ga-akọcha otu abụ Emenanjọ dere.
Anyị ga-akọcha otu abụ Emenanjọ dere.
We are going to criticize one of Emenanjo's poems.
Onye nkuzi ya kọchara ihe o dere.
Onye nkuzi ya kọchara ihe o dere.
His teacher criticized what he had written.
A na-akọcha agwa mmadụ, onye ahụ a na-amụta ihe.
A na-akọcha agwa mmadụ, onye ahụ a na-amụta ihe.
When one's character is criticized, he learns even more.
̣Ọ dịghị mma ịkọcha mmadụ
̣Ọ dịghị mma ịkọcha mmadụ
It is not good to speak ill of someone
Ọ na-akọcha ndị ezinụụlọ ya.
Ọ na-akọcha ndị ezinụụlọ ya.
She curses her family.
Gịnị mere i ji akọcha m?
Gịnị mere i ji akọcha m?
Why are you defaming me?
Ịkọcha mmadụ amarago gị ahụ.
Ịkọcha mmadụ amarago gị ahụ.
He is used to defaming people.
Ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ ga-akọcha ya.
Ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ ga-akọcha ya.
Other students will mock him.
Achọghị m ịkọcha gị.
Achọghị m ịkọcha gị.
I do not want to defame you.
Nwaanyị a na-akọcha mmadụ nnukwu.
Nwaanyị a na-akọcha mmadụ nnukwu.
This lady defames people a lot.
Nkechi kọchara ihe niile m mere
Nkechi kọchara ihe niile m mere
Nkechi defamed all that i did.
I rue ebe ahụ, kọchaa ihe o mere.
I rue ebe ahụ, kọchaa ihe o mere.
When you get there, defame what he has done.